< Job 3 >

1 Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.
Emva kwalokho uJobe wavula umlomo wakhe, waqalekisa usuku lwakhe.
2 Job sịrị:
UJobe wasephendula wathi:
3 “Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi; ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’
Kalubhubhe usuku engazalwa ngalo, lobusuku okwathiwa ngalo: Kukhulelwe umntwana wesilisa.
4 Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị: ka Chineke site nʼelu ghara ịjụ ase ya; ka ìhè gharakwa ịmụkwasị ya.
Lolosuku kalube ngumnyama, uNkulunkulu angalunanzi ephezulu, lokukhanya kungalukhanyisi.
5 Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya, ka igwe ojii kpuchigidekwa ya, ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu.
Umnyama lethunzi lokufa kakuluhlenge, iyezi lihlale phezu kwalo, umnyama welanga ulwesabise.
6 Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya, ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ, ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa.
Lobobusuku, umnyama ububambe, lungathokozi ensukwini zomnyaka, lungezi kunani lezinyanga.
7 Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu, ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya.
Khangela, lobobusuku kabube yinyumba, umsindo wentokozo ungangeni kubo.
8 Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ, bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan.
Kababuqalekise abaqalekisi bosuku, abalungele ukuvusa uLeviyathani.
9 Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị, ka o lee anya ìhè na-efu, ka ọ ghara ihu mgbubere anya nke chi ọbụbọ,
Zibe mnyama inkanyezi zokusa kwabo, bulindele ukukhanya, kodwa kungabi khona, bungaboni inkophe zokusa.
10 nʼihi na o mechighị akpanwa nne m, i zonarịkwa anya m nsogbu.
Ngoba bungavalanga iminyango yesisu sikamama wami, bungafihlanga usizi emehlweni ami.
11 “Gịnị mere m ji hapụ ịnwụ mgbe ahụ nne m mụpụtara m, kubie ume mgbe m si nʼime akpanwa pụta?
Kungani ngingafanga kusukela esizalweni, ngiphele ekuphumeni kwami esiswini?
12 Gịnị mere ikpere ji dịrị ịnabata m? Gịnị mere ara ji dịrị i ji zụọ m?
Kungani amadolo angandulela? Kungani lamabele ukuthi ngimunye?
13 Nʼihi na ugbu a, agara m idina nʼudo; agaara m anọ nʼụra na izuike,
Ngoba khathesi ngabe ngacambalala ngathula, ngalala, khona ngaba lokuphumula,
14 mụ na ndị eze na ndị ọchịchị nke ụwa, ndị rụkwaara onwe ha ebe obibi dị iche iche nke tọgbọọrọ nʼefu ugbu a,
kanye lamakhosi labeluleki bomhlaba abazakhela amanxiwa,
15 mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo, ndị jikwa ọlaọcha kpojuo ụlọ ha.
kumbe kanye leziphathamandla ezazilegolide ezagcwalisa izindlu zazo ngesiliva.
16 Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo, dịka nwa ọhụrụ nke na-ahụghị ìhè nke ụbọchị anya?
Kumbe njengomphunzo ofihliweyo ngingabi khona, njengensane ezingabonanga ukukhanya.
17 Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara, nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike.
Lapho ababi bayekela ukuhlupha, lapho abakhathele ngamandla bephumula.
18 Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha, ha adịghị anụkwa ịba mba nke ndị na-eji aka ike achị ha.
Izibotshwa ziyaphumula ndawonye, kazizwa ilizwi lomcindezeli.
19 Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ; ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya.
Omncinyane lomkhulu balapho, lesigqili sikhululekile enkosini yaso.
20 “Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè? Gịnị bụ uru ndụ nye onye mkpụrụobi ya jupụtara nʼihe ilu?
Kungani enika ukukhanya kohluphekayo, lempilo kwabalokubaba komphefumulo;
21 Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa, ee, ndị na-achọsi ọnwụ ike karịa akụ e zoro ezo,
abalindele ukufa, kodwa kungekho, bekugebha kulenotho efihliweyo,
22 ndị jupụtara nʼọṅụ, na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha rịdaruru nʼili?
abathabayo kakhulu ngentokozo, bajabule lapho bethola ingcwaba?
23 Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ; bụ onye ahụ ụzọ ya zoro ezo, onye Chineke mechibidoro ụzọ?
Emuntwini yini, ondlela yakhe ifihliwe, uNkulunkulu ambiyeleyo?
24 Nʼihi na ịma ọsụ aghọọla ihe oriri m kwa ụbọchị; ịsụ ude m na-awụpụtakwa dịka mmiri.
Ngoba ukububula kwami kuza phambi kokudla kwami, lokubhonga kwami kuthululeka njengamanzi.
25 Ihe m tụrụ egwu ya abịakwasịla m, ihe m tụrụ ụjọ ya bụ ihe bịakwasịrị m.
Ngoba engikwesabayo ngokwesaba sekungehlele, lengilovalo ngakho kufikile kimi.
26 Enweghị m udo, anọkwaghị m jụụ, enweghị m izuike, naanị ọgbaaghara.”
Ngangingahlalisekanga, ngingaphumuli, ngingelakuthula, lohlupho lweza.

< Job 3 >