< Job 3 >

1 Nʼikpeazụ, onye kwuru okwu bụ Job nʼonwe ya. O kwuru okwu bụọ ụbọchị a mụrụ ya ọnụ.
אחרי כן פתח איוב את פיהו ויקלל את יומו׃
2 Job sịrị:
ויען איוב ויאמר׃
3 “Ka ụbọchị ahụ amụrụ m bụrụ ụbọchị lara nʼiyi; ya na abalị ahụ e kwuru sị, ‘Atụrụ ime nwa nwoke.’
יאבד יום אולד בו והלילה אמר הרה גבר׃
4 Ụbọchị ahụ, ka ọ ghọọ ọchịchịrị: ka Chineke site nʼelu ghara ịjụ ase ya; ka ìhè gharakwa ịmụkwasị ya.
היום ההוא יהי חשך אל ידרשהו אלוה ממעל ואל תופע עליו נהרה׃
5 Ka ọchịchịrị na onyinyo ọnwụ gbara ụbọchị ahụ dịka ụbọchị nke aka ya, ka igwe ojii kpuchigidekwa ya, ka ọchịchịrị kpuchie ya nʼebe ọ dị ukwuu.
יגאלהו חשך וצלמות תשכן עליו עננה יבעתהו כמרירי יום׃
6 Abalị ahụ, ka oke ọchịchịrị kpuchie ya, ka a kachapụ ya, ka ọ hapụ ịbụkwa ụbọchị a ga-agụkọ ya na ụbọchị ndị ọzọ nʼafọ, ka ọ ghara dịka otu ụbọchị nke na-adị nʼọnwa.
הלילה ההוא יקחהו אפל אל יחד בימי שנה במספר ירחים אל יבא׃
7 Ka abalị ụbọchị ahụ bụrụ ụbọchị tọgbọrọ nʼefu, ka a ghara ịnụ mkpu ọṅụ ọbụla nʼime ya.
הנה הלילה ההוא יהי גלמוד אל תבא רננה בו׃
8 Ka ndị ahụ na-abụ ụbọchị ọnụ bụọ ụbọchị ahụ ọnụ, bụ ndị ahụ jikeere ịkpọte Leviatan.
יקבהו אררי יום העתידים ערר לויתן׃
9 Ka kpakpando ụtụtụ ya gbaa ọchịchịrị, ka o lee anya ìhè na-efu, ka ọ ghara ihu mgbubere anya nke chi ọbụbọ,
יחשכו כוכבי נשפו יקו לאור ואין ואל יראה בעפעפי שחר׃
10 nʼihi na o mechighị akpanwa nne m, i zonarịkwa anya m nsogbu.
כי לא סגר דלתי בטני ויסתר עמל מעיני׃
11 “Gịnị mere m ji hapụ ịnwụ mgbe ahụ nne m mụpụtara m, kubie ume mgbe m si nʼime akpanwa pụta?
למה לא מרחם אמות מבטן יצאתי ואגוע׃
12 Gịnị mere ikpere ji dịrị ịnabata m? Gịnị mere ara ji dịrị i ji zụọ m?
מדוע קדמוני ברכים ומה שדים כי אינק׃
13 Nʼihi na ugbu a, agara m idina nʼudo; agaara m anọ nʼụra na izuike,
כי עתה שכבתי ואשקוט ישנתי אז ינוח לי׃
14 mụ na ndị eze na ndị ọchịchị nke ụwa, ndị rụkwaara onwe ha ebe obibi dị iche iche nke tọgbọọrọ nʼefu ugbu a,
עם מלכים ויעצי ארץ הבנים חרבות למו׃
15 mụ na ụmụ ndị ikom eze, ndị nwere ọlaedo, ndị jikwa ọlaọcha kpojuo ụlọ ha.
או עם שרים זהב להם הממלאים בתיהם כסף׃
16 Ọ bụ gịnị mere e zofughị m nʼala dịka nwantakịrị a mụkworo amụkwo, dịka nwa ọhụrụ nke na-ahụghị ìhè nke ụbọchị anya?
או כנפל טמון לא אהיה כעללים לא ראו אור׃
17 Nʼebe ahụ ka ndị na-emebi iwu na-akwụsị iweta ọgbaaghara, nʼebe ahụ ka ndị ike gwụrụ na-ezu ike.
שם רשעים חדלו רגז ושם ינוחו יגיעי כח׃
18 Ebe ahụ ka ndị nọ nʼagbụ na-enwere onwe ha, ha adịghị anụkwa ịba mba nke ndị na-eji aka ike achị ha.
יחד אסירים שאננו לא שמעו קול נגש׃
19 Ebe ahụ ka ndị ukwu na ndị nta nọ; ebe ahụ kwa ka ohu na-enwere onwe ya kpamkpam site nʼaka onye nwe ya.
קטן וגדול שם הוא ועבד חפשי מאדניו׃
20 “Nʼihi gịnị ka e ji enye ndị nọ nʼọnọdụ nhụju anya ìhè? Gịnị bụ uru ndụ nye onye mkpụrụobi ya jupụtara nʼihe ilu?
למה יתן לעמל אור וחיים למרי נפש׃
21 Gịnị bụ uru ya nye ndị na-echere ọnwụ ma ọ dịghị abịa, ee, ndị na-achọsi ọnwụ ike karịa akụ e zoro ezo,
המחכים למות ואיננו ויחפרהו ממטמונים׃
22 ndị jupụtara nʼọṅụ, na-aṅụrị ọṅụ mgbe ha rịdaruru nʼili?
השמחים אלי גיל ישישו כי ימצאו קבר׃
23 Gịnị mere e ji enye mmadụ ndụ; bụ onye ahụ ụzọ ya zoro ezo, onye Chineke mechibidoro ụzọ?
לגבר אשר דרכו נסתרה ויסך אלוה בעדו׃
24 Nʼihi na ịma ọsụ aghọọla ihe oriri m kwa ụbọchị; ịsụ ude m na-awụpụtakwa dịka mmiri.
כי לפני לחמי אנחתי תבא ויתכו כמים שאגתי׃
25 Ihe m tụrụ egwu ya abịakwasịla m, ihe m tụrụ ụjọ ya bụ ihe bịakwasịrị m.
כי פחד פחדתי ויאתיני ואשר יגרתי יבא לי׃
26 Enweghị m udo, anọkwaghị m jụụ, enweghị m izuike, naanị ọgbaaghara.”
לא שלותי ולא שקטתי ולא נחתי ויבא רגז׃

< Job 3 >