< Job 29 >

1 Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
ויסף איוב שאת משלו ויאמר׃
2 “Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga, dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m,
מי יתנני כירחי קדם כימי אלוה ישמרני׃
3 mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.
בהלו נרו עלי ראשי לאורו אלך חשך׃
4 Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma, mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,
כאשר הייתי בימי חרפי בסוד אלוה עלי אהלי׃
5 mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,
בעוד שדי עמדי סביבותי נערי׃
6 mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.
ברחץ הליכי בחמה וצור יצוק עמדי פלגי שמן׃
7 “Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo were ọnọdụ m nʼama.
בצאתי שער עלי קרת ברחוב אכין מושבי׃
8 Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha, ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;
ראוני נערים ונחבאו וישישים קמו עמדו׃
9 ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu ma were aka ha kpuchie ọnụ ha;
שרים עצרו במלים וכף ישימו לפיהם׃
10 olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ, ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ.
קול נגידים נחבאו ולשונם לחכם דבקה׃
11 Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m, ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m.
כי אזן שמעה ותאשרני ועין ראתה ותעידני׃
12 Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka, napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.
כי אמלט עני משוע ויתום ולא עזר לו׃
13 Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m; emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.
ברכת אבד עלי תבא ולב אלמנה ארנן׃
14 Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe, ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.
צדק לבשתי וילבשני כמעיל וצניף משפטי׃
15 Abụ m anya nye onye ìsì, bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.
עינים הייתי לעור ורגלים לפסח אני׃
16 Abụ m nna nke onye nọ na mkpa; bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.
אב אנכי לאביונים ורב לא ידעתי אחקרהו׃
17 Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume, si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu.
ואשברה מתלעות עול ומשניו אשליך טרף׃
18 “Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m, na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.
ואמר עם קני אגוע וכחול ארבה ימים׃
19 Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri, na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.
שרשי פתוח אלי מים וטל ילין בקצירי׃
20 Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m, ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’
כבודי חדש עמדי וקשתי בידי תחליף׃
21 “Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị, ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.
לי שמעו ויחלו וידמו למו עצתי׃
22 Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ. Okwu m na-ada juu na ntị ha.
אחרי דברי לא ישנו ועלימו תטף מלתי׃
23 Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo, na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị.
ויחלו כמטר לי ופיהם פערו למלקוש׃
24 Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya; ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.
אשחק אלהם לא יאמינו ואור פני לא יפילון׃
25 Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha; ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya; na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.
אבחר דרכם ואשב ראש ואשכון כמלך בגדוד כאשר אבלים ינחם׃

< Job 29 >