< Job 29 >

1 Job gakwara nʼihu nʼokwu ya sị:
Yobu anapitiriza kuyankhula kwake:
2 “Ọ gaara adị m nọọ mma ma a sị na m ga-adị dịka m dị nʼọnwa ole na ole gara aga, dịka ụbọchị ndị ahụ mgbe Chineke na-elekọta m,
“Aa! Ndikanakhala momwe ndinalili miyezi yapitayi, masiku amene Mulungu ankandiyangʼanira,
3 mgbe oriọna ya na-achakwasị m nʼisi ìhè ya ka m ji jee ije nʼọchịchịrị.
pamene nyale yake inkandiwunikira ndipo ndi kuwunika kwakeko ine ndinkatha kuyenda mu mdima!
4 Ewoo, otu ihe dịịrị nʼụbọchị ihe na-agara m nke ọma, mgbe mmekọrịta mụ na Chineke mere ka ụlọ m bụrụ ebe a gọziri agọzi,
Ndithu, masiku amene ndinali pabwino kwambiri, pamene ubwenzi wa Mulungu unkabweretsa madalitso pa nyumba yanga,
5 mgbe Onye pụrụ ime ihe niile nọnyeere m na mgbe ụmụ m nọkwa m gburugburu,
nthawi imene Wamphamvuzonse anali nane, ndipo ana anga anali atandizungulira mʼmbalimu,
6 mgbe ụzọ m jupụtara na mmiri ara ehi rahụrụ arahụ, mgbe nkume na-awụpụtara m mmanụ oliv dịka mmiri na-asọ asọ.
pamene popondapo ine panali patakhathamira mafuta a mkaka, ndipo pa thanthwe pamatuluka mitsinje ya mafuta a olivi.
7 “Mgbe m na-apụ nʼọnụ ụzọ ama obodo were ọnọdụ m nʼama.
“Pamene ndinkapita pa chipata cha mzinda ndi kukhala pa mpando wanga pabwalo,
8 Ụmụ okorobịa na-ahụ m wezuga onwe ha, ndị okenye na-ahụkwa m ma guzo nʼụkwụ ha;
anyamata amati akandiona ankapatuka ndipo anthu akuluakulu ankayimirira;
9 ndịisi ọchịchị obodo na-akwụsị ikwu okwu ma were aka ha kpuchie ọnụ ha;
atsogoleri ankakhala chete ndipo ankagwira pakamwa pawo;
10 olu ndị a na-asọpụrụ na-adakwa jụụ, ire ha na-araparakwa ha nʼakpo ọnụ.
anthu otchuka ankangoti duu, ndipo malilime awo anali atamatirira ku nkhama zawo.
11 Nʼoge ahụ, onye ọbụla nụrụ olu m na-ekwu ihe dị mma banyere m, ndị hụkwara m na-agba ama ọma maka m.
Aliyense amene anamva za ine anayankhula zabwino zanga, ndipo iwo amene anandiona ankandiyamikira,
12 Nʼihi na anapụtara m ndị ogbenye na-eti mkpu enyemaka, napụtakwa ndị mgbei na-enweghị ndị enyemaka.
chifukwa ndinkapulumutsa mʼmphawi wofuna chithandizo, ndiponso mwana wamasiye amene analibe aliyense womuthandiza.
13 Onye nọ nʼọnụ ọnwụ gọziri m; emekwara m ka obi nwanyị di ya nwụrụ bụọ abụ.
Munthu amene anali pafupi kufa ankandidalitsa; ndinkasangalatsanso mkazi wamasiye.
14 Ana m eyikwasị ezi omume dịka uwe, ikpe ziri ezi bụ uwe mwụda m na akwa okike nke isi m.
Chilungamo chinali ngati chovala changa; chiweruzo cholungama ndiye chinali mkanjo ndi nduwira yanga.
15 Abụ m anya nye onye ìsì, bụrụkwa ụkwụ nye onye ngwụrọ.
Ndinali ngati maso kwa anthu osapenya; ndinali ngati mapazi kwa anthu olumala.
16 Abụ m nna nke onye nọ na mkpa; bụrụkwa onye gbalịrị ịhụ na ndị ọbịa natara ikpe ziri ezi.
Ndinali ngati abambo kwa anthu aumphawi; ndinkayimira mlendo pa mlandu wake.
17 Etijiri m ikiri eze nke ndị ajọ omume, si otu a napụta ndị ha na-achọ ịdọgbu.
Ndinkawononga mphamvu za anthu oyipa ndi kulanditsa amene anali atagwidwa.
18 “Echere m sị, ‘Aga m anwụ nʼụlọ nke aka m, na ụbọchị m ga-abakwa ụba dịka aja dị nʼala.
“Ndinkaganiza kuti, ‘Ndidzafera mʼnyumba yanga, masiku a moyo wanga ali ochuluka ngati mchenga.
19 Mgbọrọgwụ m ga-eto rịda na mmiri, na igirigi ga-adakwasịkwa nʼalaka m abalị niile.
Mizu yanga idzatambalalira ku madzi, ndipo mame adzakhala pa nthambi zanga usiku wonse.
20 Nsọpụrụ m ga-adịgide ọhụrụ nʼime m, ụta m ga-adịgidekwa ọhụrụ nʼaka m.’
Ulemerero wanga udzakhala wosaguga mwa ine, ndipo uta wanga udzakhala watsopano nthawi zonse mʼdzanja langa.’
21 “Ụmụ mmadụ na-eji oke olileanya na-ege m ntị, ha na-ederekwa duu ịnụrụ ndụmọdụ m.
“Anthu ankamvetsera zimene ndinkanena mwachidwi, ankadikira atakhala chete kuti amve malangizo anga.
22 Mgbe m kwụsịrị okwu, ha anaghị ekwukwa ọzọ. Okwu m na-ada juu na ntị ha.
Ndikayankhula, iwo sankayankhulanso; mawu anga ankawagwira mtima.
23 Ha na-echerekwa m dịka e si echere mmiri ozuzo, na-aṅụkwa okwu m dịka ala si aṅụ mmiri ozuzo nʼọkọchị.
Ankayembekezera ine monga momwe amayembekezera mvula ndipo ankalandira mawu anga ngati mvula ya mʼmalimwe.
24 Mgbe m miiri ha ọnụ ọchị, ha adịghị ekwenye ya; ìhè nke ihu m dị oke mkpa nye ha.
Ndikawasekerera, iwo sankatha kukhulupirira; kuwala kwa nkhope yanga chinali chinthu chamtengowapatali kwa iwowo.
25 Ọ bụ m na-ahọpụtara ha ụzọ, na-anọdụ dịka onyeisi ha; ebiri m dịka a ga-asị na m bụ onye eze nʼetiti ndị agha ya; na dịka onye na-akasị ndị na-eru ụjụ obi.
Ndinkawasankhira njira yawo ndipo ndinkawatsogolera ngati mfumu; ndinkakhala ngati mfumu pakati pa gulu lake lankhondo; ndinali ngati msangalatsi pakati pa anthu olira.”

< Job 29 >