< Job 28 >

1 Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị; ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.
Kulomgodi wesiliva lendawo lapho okucengwa khona igolide.
2 E si nʼime ala ewepụta igwe, ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.
Insimbi ithathwa emhlabathini, lethusi lincibilikiswa emanyeleni.
3 Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ; ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya, na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.
Umuntu uyawuxotsha umnyama; uguduza ezingoxweni eziphansi kude edinga amanyele emnyameni othe bhuqe.
4 Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi, nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru, nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.
Khatshana kwezindawo zabantu ugebha umgodi, ezindaweni lapho okungafiki nyawo lwamuntu; khatshana kwabantu uyalenga, azunguzeke.
5 Ala ahụ e si na ya enweta nri, abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.
Umhlaba, okuphuma kuwo ukudla, uyaguquka ngaphansi ingathi utshiswe ngomlilo;
6 Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya; aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.
amasafire amatshe amahle ayaphuma emadwaleni, uthuli lwawo lugcwele igolide.
7 Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo; anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.
Kakukho nyoni edla inyama eyaziyo leyondlela efihlekileyo, kakulalihlo laluphi ukhozi oselwake lwayibona.
8 Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya, ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.
Izilo ezizithembileyo kazilubeki unyawo kuyo, njalo kakulasilwane esizingela khona.
9 Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.
Isandla somuntu yiso esihlasela idwala eliyinsengetshe siveze obala impande zezintaba.
10 Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ, anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.
Uyaligubha idwala angene; ilihlo lakhe liwabone wonke amagugu alo.
11 Ha na-achọpụta isi mmiri niile ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.
Uyathungatha lapho okudabuka khona imifula aveze obala izinto ezifihlekileyo.
12 Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe? Olee kwa ebe nghọta bi?
Kodwa ukuhlakanipha kungafunyanwa ngaphi na? Kuhlala ngaphi na ukuzwisisa?
13 Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya, agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.
Umuntu kakuzwisisi ukuqakatheka kwakho; kakufunyanwa elizweni labaphilayo.
14 Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,” osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”
Phansi ekujuleni kuthi, “Kakukho kimi”; ulwandle luthi, “Kangilakho mina.”
15 A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya, apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.
Kungeke kwathengwa ngegolide elicolekileyo, njalo lentengo yakho ingeke yalinganiswa ngesiliva.
16 A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya, a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,
Kungeke kwathengwa ngegolide lase-Ofiri, loba nge-onikisi kumbe isafire.
17 A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya, maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.
Kungazake kulinganiswe legolide loba amatshe akhazimulayo, njalo kakuzuzwa ngemiceciso yegolide.
18 Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị; ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.
Amatshe amahle ekhorali lejaspa lawo kawabalwa lapha; intengo yokuhlakanipha ingaphezulu kwamarubhi.
19 A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya; a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.
Ithophazi yaseKhushi ngeke ilinganiswe lakho; ngeke kuthengwe langegolide elicolekileyo.
20 Olee ebe amamihe si abịa? Olee ebe nghọta bi?
Pho kuvela ngaphi ukuhlakanipha na? Kuhlala ngaphi ukuzwisisa?
21 E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ, e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.
Kufihliwe emehlweni ento yonke ephilayo, kucatshisiwe lakuzo izinyoni zasemoyeni.
22 Mbibi na ọnwụ na-asị; “Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.”
INcithakalo loKufa kuthi, “Amahungahunga akho yiwo kuphela esiwezwayo.”
23 Chineke ghọtara ụzọ ya, naanị ya makwara ebe obibi ya dị.
UNkulunkulu uyayizwisisa indlela yakho njalo nguye yedwa okwaziyo lapho okuhlala khona,
24 Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa, na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.
ngoba uyayikhangela imikhawulo yomhlaba akubone konke okungaphansi kwamazulu.
25 Mgbe o hiwere ike nke ikuku, tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,
Wathi emisa umfutho womoya, elinganisa isimo samanzi,
26 mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku,
wathi ebeka umthetho wezulu elinayo lendlela yezulu elilesiphepho,
27 mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya, meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya.
wasekukhangela ukuhlakanipha wakuhlola butsha; wakukholwa wakuqinisa, wakulinga ukuthi kuqinile.
28 Ọ sịrị mmadụ, “Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe; ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.”
Wathi emuntwini, “Ukumesaba uThixo yikho ukuhlakanipha, lokuxwaya ububi yikho ukuzwisisa.”

< Job 28 >