< Job 28 >

1 Olulu e si egwupụta ọlaọcha dị; ebe a na-anụcha ọlaedo dịkwa.
Bizony az ezüstnek bányája van, és helye az aranynak, a hol tisztítják.
2 E si nʼime ala ewepụta igwe, ọlanchara na-agbazepụta site nkume na-aghọ ọla.
A vasat a földből hozzák elő, a követ pedig érczczé olvasztják.
3 Mmadụ na-eme ka ọchịchịrị nwee ọgwụgwụ; ọ na-enyochapụta ihe dị ebe dị anya, na-achọ igwe nʼime oke ọchịchịrị.
Határt vet az ember a setétségnek, és átkutatja egészen és végig a homálynak és a halál árnyékának kövét.
4 Ọ na-egwu olulu nʼebe dị anya site nʼebe mmadụ bi, nʼebe ụkwụ mmadụ na-adịghị eru, nʼebe ahụ dị anya site nʼebe mmadụ bi ka ha na-akwụfegharị.
Aknát tör távol a lakóktól: mintha lábukról is megfelejtkeznének, alámerülnek és lebegnek emberektől messze.
5 Ala ahụ e si na ya enweta nri, abụrụla ihe e ji ọkụ gbanwee nʼokpuru ya.
Van föld, a melyből kenyér terem, alant pedig fel van forgatva, mintegy tűz által;
6 Safaia bụ nkume dị oke ọnụahịa dị na nkume ya; aja ya nwekwara mkpụrụ ọlaedo.
Köveiben zafir található, göröngyeiben arany van.
7 Ọ dịghị anụ ufe nke na-eri anụ maara ụzọ ahụ zoro ezo; anya agụ nkwọ ọbụla ahụtụbeghị ya.
Van ösvény, a melyet nem ismer a sas, sem a sólyom szeme nem látja azt.
8 Anụ ọhịa dị nganga anaghị azọnye ụkwụ nʼelu ya, ọdụm ọbụla adịghị awagharị nʼebe ahụ.
Nem tudják azt büszke vadak, az oroszlán sem lépked azon.
9 Ndị mmadụ na-eji aka na-etiwasị nkume ahụ na-enwu ọkụ mee ka mgbọrọgwụ ugwu ahụ pụta ìhè.
Ráveti kezét az ember a kovakőre, a hegyeket tövükből kiforgatja.
10 Ha na-awapụta ọwa ụzọ nʼetiti nkume ahụ, anya ha na-ahụkwa akụnụba ya niile.
A sziklákban tárnákat hasít, és minden drága dolgot meglát a szeme.
11 Ha na-achọpụta isi mmiri niile ma meekwa ka ihe nzuzo pụta ìhè.
Elköti a folyók szivárgását, az elrejtett dolgot pedig világosságra hozza.
12 Ma olee ebe ka a ga-achọta amamihe? Olee kwa ebe nghọta bi?
De a bölcseség hol található, és az értelemnek hol van a helye?
13 Mmadụ apụghị ịghọta ọnụahịa ya, agaghị achọtakwa ya nʼala ndị dị ndụ.
Halandó a hozzá vivő utat nem ismeri, az élők földén az nem található.
14 Ogbu mmiri na-asị, “Ọ dịghị nʼime m,” osimiri na-asị, “Ọ dịghị nʼaka m.”
A mélység azt mondja: Nincsen az bennem; a tenger azt mondja: én nálam sincsen.
15 A gaghị eji ọlaedo a nụchara nke ọma zụta ya, apụghị ịtụ ihe bụ ọnụahịa ya nʼọlaọcha.
Színaranyért meg nem szerezhető, ára ezüsttel meg nem fizethető.
16 A gaghị eji ọlaedo nke Ọfịa zụta ya, a gaghị ejikwa nkume dara oke ọnụahịa nke ọniks maọbụ safaia zụta ya,
Nem mérhető össze Ofir aranyával, nem drága onikszszal, sem zafirral.
17 A gaghị eji ọlaedo maọbụ kristal tụnyere ya, maọbụ iji ejiji ọlaedo nweta ya.
Nem ér fel vele az arany és gyémánt, aranyedényekért be nem cserélhető.
18 Koral na jaspa erughị ihe a na-akpọtụ aha nʼebe ọ dị; ọnụahịa nke amamihe karịrị ọtụtụ rubi.
Korall és kristály említni sem való; a bölcseség ára drágább a gyöngyöknél.
19 A gaghị eji ọla topaazi nke Kush tụnyere ya; a pụghị iji ọlaedo a nụchara anụcha zụta ya.
Nem ér fel vele Kúsnak topáza, színaranynyal sem mérhető össze.
20 Olee ebe amamihe si abịa? Olee ebe nghọta bi?
A bölcseség honnan jő tehát, és hol van helye az értelemnek?
21 E zoro ya ezo site nʼanya ihe niile dị ndụ, e kpuchikwara ya nye ọ bụladị anụ ufe nke eluigwe.
Rejtve van az minden élő szemei előtt, az ég madarai elől is fedve van.
22 Mbibi na ọnwụ na-asị; “Naanị akụkọ ya ruru anyị ntị.”
A pokol és halál azt mondják: Csak hírét hallottuk füleinkkel! (questioned)
23 Chineke ghọtara ụzọ ya, naanị ya makwara ebe obibi ya dị.
Isten tudja annak útját, ő ismeri annak helyét.
24 Nʼihi na ọ na-ahụ nsọtụ nke ụwa, na-ahụkwa ihe niile dị nʼokpuru eluigwe.
Mert ő ellát a föld határira, ő lát mindent az ég alatt.
25 Mgbe o hiwere ike nke ikuku, tụọkwa mmiri nʼihe ọtụtụ,
Mikor a szélnek súlyt szerzett, és a vizeket mértékre vette;
26 mgbe o nyere mmiri ozuzo iwu meekwa ụzọ nye egbe eluigwe na oke ikuku,
Mikor az esőnek határt szabott, és mennydörgő villámoknak útat:
27 mgbe ahụ, o lere amamihe anya, nyochasịa ya, meekwa ka o guzosie ike, ma nwapụtakwa ya.
Akkor látta és kijelentette azt, megalapította és meg is vizsgálta azt.
28 Ọ sịrị mmadụ, “Ịtụ egwu Onyenwe anyị, nke ahụ bụ amamihe; ọzọ, ị sị nʼihe ọjọọ wezuga onwe bụ nghọta.”
Az embernek pedig mondá: Ímé az Úrnak félelme: az a bölcseség, és az értelem: a gonosztól való eltávozás.

< Job 28 >