< Job 26 >

1 Mgbe ahụ, Job zaghachiri:
Kisha Ayubu akajibu na kusema,
2 “Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka! Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị!
“Mmemsaidiaje aliyedhaifu!
3 Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe! Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara.
Jinsi gani mmemshauri asiye na hekima na kutamka maneno yenye maarifa kwake!
4 Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a? Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu?
Kwa msaada wa nani mmesema maneno haya? Ni roho ya nani iliyotoka ndani yenu?
5 “Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu, ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.
Maiti inatetemeka chini ya maji, na vyote wilivyomo ndani yake.
6 Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke; mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya. (Sheol h7585)
Kuzimu kuko wazi mbele ya Mungu; uharibifu hauna kizuizi dhidi yake. (Sheol h7585)
7 Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu. O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.
Huitandaza kaskazi juu ya nafasi wazi na kuining'iniza dunia hewani.
8 Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii, ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.
Huyafunga maji katika mawingu yake mazito, lakini hayagawanyiki chini yake.
9 Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya, na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,
Huufunika uso wa mwezi na kueneza mawingu yake juu yake.
10 O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri, ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
Amechora ukingo wa duara juu ya maji kama mpaka kati ya nuru na giza.
11 Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji, tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya.
Nguzo za mbinguni zinatikisika na zimestushwa na kukemea kwake.
12 Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri; ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.
Aliituliza bahari kwa uwezo wake; kwa ufahamu wake alimwaribu Rahab
13 Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma; aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ.
Kwa pumzi yake, aliziondoa mbingu kwa dhorubu; mbingu ziliondolewa kwa dhorubu; mkono wake ulimchoma nyoka anayekimbia.
14 Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya; lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya! Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda nke ike ya?”
Tazama, hizi si zaidi ya madogo ya njia zake; Jinsi gani tunasikia akitunong'oneza! Ni nani awezaye kufahamu uwezo wake.

< Job 26 >