< Job 26 >
1 Mgbe ahụ, Job zaghachiri:
约伯回答说:
2 “Lee ka i si nyere onye na-adịghị ike aka! Leekwa ka i si zọpụta ogwe aka nke onye ume na-adịghị!
无能的人蒙你何等的帮助! 膀臂无力的人蒙你何等的拯救!
3 Lee ụdị ndụmọdụ i nyerela onye na-enweghị amamihe! Leekwa ụdị oke nghọta nke ị gosipụtara.
无智慧的人蒙你何等的指教! 你向他多显大知识!
4 Ọ bụ onye nyeere gị aka ikwu okwu ndị a? Mmụọ onye si nʼọnụ gị kwuo okwu?
你向谁发出言语来? 谁的灵从你而出?
5 “Ndị nwụrụ anwụ nọ nʼoke ihe mgbu, ha na ndị nọ nʼokpuru mmiri na ndị bi nʼime ya.
在大水和水族以下的阴魂战兢。
6 Ala mmụọ gba ọtọ nʼihu Chineke; mbibi tọgbọkwara na-enweghị ihe kpuchiri ya. (Sheol )
在 神面前,阴间显露; 灭亡也不得遮掩。 (Sheol )
7 Ọ na-agbasapụ elu elu nke mbara eluigwe nʼelu ebe tọgbọrọ nʼefu. O nweghị ihe o kokwasịrị ụwa nʼelu ya.
神将北极铺在空中, 将大地悬在虚空;
8 Ọ na-ekechi mmiri nʼime igwe ojii, ma ịdị arọ ya adịghị eme ka igwe ojii gbawaa.
将水包在密云中, 云却不破裂;
9 Ọ na-ekpuchi ihu ọnwa nke dị nʼuju ya, na-agbasakwa igwe ojii ya nʼelu ya,
遮蔽他的宝座, 将云铺在其上;
10 O kewapụtara oke nʼelu ogbu mmiri, ka ọ bụrụ oke dị nʼetiti ìhè na ọchịchịrị.
在水面的周围划出界限, 直到光明黑暗的交界。
11 Ogidi niile nke eluigwe na-ama jijiji, tụọkwa oke egwu nʼihi ịba mba ya.
天的柱子因他的斥责震动惊奇。
12 Nʼike ya ka o ji kpalie oke osimiri; ọ bụ amamihe ya ka o ji tigbuo Rehab.
他以能力搅动大海; 他借知识打伤拉哈伯,
13 Ọ bụ site na nkuume ya ka mbara eluigwe ji maa mma; aka ya dupuru agwọ na-agba ọsọ.
借他的灵使天有妆饰; 他的手刺杀快蛇。
14 Ihe ndị a bụ ọnụ ọnụ ọrụ aka ya; lee ka o si dị nta bụ okwu ntakwu anyị na-anụ gbasara ya! Onye pụrụ ịghọtacha ịda ụda nke ike ya?”
看哪,这不过是 神工作的些微; 我们所听于他的是何等细微的声音! 他大能的雷声谁能明透呢?