< Job 25 >

1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:
Nígbà náà ní Bilidadi, ará Ṣuhi, dáhùn wí pé,
2 “Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke; Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.
“Ìjọba àti ẹ̀rù ń bẹ lọ́dọ̀ Ọlọ́run rẹ̀, òun ní i ṣe ìlàjà ní ibi gíga gíga ọ̀run.
3 Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ? Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?
Àwọn ọmọ-ogun rẹ̀ ha ní ìyè bí, tàbí ara ta ni ìmọ́lẹ̀ rẹ̀ kò tàn sí?
4 Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke? Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha?
Èéha ti ṣe tí a ó fi dá ènìyàn láre lọ́dọ̀ Ọlọ́run? Tàbí ẹni tí a bí láti inú obìnrin wá yóò ha ṣe mọ́?
5 Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta, ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,
Kíyèsi i, òṣùpá kò sì lè tàn ìmọ́lẹ̀, àní àwọn ìràwọ̀ kò mọ́lẹ̀ ní ojú rẹ̀,
6 ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru, mmadụ, nke bụ naanị idide.”
kí a má sọ ènìyàn tí i ṣe ìdin, àti ọmọ ènìyàn tí í ṣe kòkòrò!”

< Job 25 >