< Job 25 >

1 Mgbe ahụ, Bildad onye Shua zara sị:
Then Bildad the Shuhite answered,
2 “Ike ọchịchị na oke egwu bụ nke Chineke; Ọ bụ ya na-eme ka udo dịrị nʼeluigwe.
"Dominion and fear are with him. He makes peace in his high places.
3 Onye pụrụ ịgụta usuu ndị agha ya ọnụ? Onye kwa ka ìhè ya na-adịghị enwukwasị?
Can his armies be counted? On whom does his light not arise?
4 Mmadụ ọ ga-esi aṅaa bụrụ onye ezi omume nʼihu Chineke? Mmadụ nwanyị mụrụ ọ ga-esi aṅaa dị ọcha?
How then can man be just with God? Or how can he who is born of a woman be clean?
5 Lee, ọ bụladị ọnwa adịghị achawapụta, ọzọ kpakpando adịghị ọcha nʼanya ya,
Look, even the moon has no brightness, and the stars are not pure in his sight;
6 ka ọfọdụzie nwa mmadụ efu mụrụ, nke bụ naanị ikpuru, mmadụ, nke bụ naanị idide.”
How much less man, who is a worm, the son of man, who is a worm."

< Job 25 >