< Job 24 >
1 “Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe? Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a?
Kungani izikhathi zingafihlelwanga uSomandla, labamaziyo bengaboni insuku zakhe?
2 Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala, na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi.
Bathuthukisa imingcele, baphange imihlambi bayeluse.
3 Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei, ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe.
Baxotsha ubabhemi wezintandane, bathathe inkabi yomfelokazi ibe yisibambiso.
4 Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa. Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha.
Baphambula abaswelayo emigwaqweni; abayanga bomhlaba bacatsha ndawonye.
5 Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara, otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri, ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri.
Khangelani, bangobabhemi beganga enkangala, baphumela emsebenzini wabo, badinge impango ngovivi; inkangala ibe yikudla kwakhe lokwabantwana.
6 Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi, na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume.
Emasimini bavuna ukudla kwakhe, bakhothoze esivinini somubi.
7 Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị, ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi.
Balala beze ebusuku bengelasembatho, bengelasigubuzelo emqandweni.
8 Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ, ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba.
Bamanzi ngezihlambo zezintaba, babambelela edwaleni ngoba bengelasiphephelo.
9 Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara. Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe.
Bahluthuna intandane ebeleni, bathathe lesibambiso kumyanga.
10 Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị, ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ.
Bahamba beze bengelasigqoko, labalambileyo bathwala isithungo.
11 Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya, ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.
Phakathi kwemiduli yabo bahluza amafutha, banyathela izikhamelo zewayini, kodwa bomile.
12 Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili, mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka. Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a.
Abantu bayabubula besemzini, lomphefumulo wabalimeleyo uyakhala; kodwa uNkulunkulu kababaleli ukungalungi.
13 “Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè, ndị na-amaghị ụzọ ya maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya.
Bona baphakathi kwabavukela ukukhanya; kabazazi indlela zakhe, kabahlali emikhondweni yakhe.
14 Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili, gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa; nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi.
Umbulali uyavuka ngovivi, abulale umyanga loswelayo; lebusuku unjengesela.
15 Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji; ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’ ọ na-ekpuchikwa ihu ya.
Lelihlo lesiphingi lilindela ukuhlwa, sisithi: Kakulalihlo elizangibona; sifake isimbombozo ebusweni baso.
16 Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa, ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ; o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.
Emnyameni ugebha aphutshele ezindlini abaziphawulele zona emini; kabakwazi ukukhanya.
17 Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha, ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi.
Ngoba ikuseni kanyekanye ilithunzi lokufa kubo; uba besaziwa bakuzesabiso zethunzi lokufa.
18 “Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri; ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ, nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.
Ulula phezu kobuso bamanzi; isabelo sabo siqalekisiwe emhlabeni; kaphendukeli endleleni yezivini.
19 Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. (Sheol )
Imbalela lokutshisa kuqeda amanzi eliqhwa elikhithikileyo, ngokunjalo ingcwaba abonileyo. (Sheol )
20 Akpanwa na-echefu ha, ikpuru na-eji ha mere ihe oriri; anaghị echetakwa ndị ajọọ omume kama a na-etiji ha dịka osisi.
Isizalo sizamkhohlwa, impethu izammunya, engabe esakhunjulwa, lenkohlakalo izakwephulwa njengesihlahla.
21 Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa, ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ.
Udla ngokuminza inyumba engazaliyo, kamenzeli okuhle umfelokazi.
22 Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ.
Njalo udonsa abalamandla ngamandla akhe, uyavuka, njalo kungabi lolethemba lempilo.
23 Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha, ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile.
Uyamnika ukuze alondolozeke, eseyama kukho, kodwa amehlo akhe aphezu kwendlela zabo.
24 A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị, a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ, a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka.
Bayaphakanyiswa okwesikhatshana, babesebengasekho, behliselwa phansi, bavalelwe njengaye wonke, bayaqunywa njengesihloko sesikhwebu.
25 “Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha si otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”
Uba-ke kungenjalo, ngubani ongangenza umqambimanga, enze inkulumo yami ibe yize?