< Job 24 >
1 “Gịnị mere Onye pụrụ ime ihe niile adịghị ahọpụta oge maka ikpe ikpe? Gịnị mere ndị maara ya ga-eji na-ele anya nʼefu maka oge ndị a?
Why are times for judging wicked people not set by the Almighty? Why do not those who are faithful to God see his days of judgment come?
2 Ụfọdụ ụmụ mmadụ na-ewezuga nkume oke ala, na-elekọta igwe atụrụ ha zutere nʼohi.
There are wicked people who remove boundary markers; there are wicked people who take away flocks by force and put them in their own pastures.
3 Ha na-apụnara ịnyịnya ibu nke nwa mgbei, ha na-anarakwa ehi nke nwanyị di ya nwụrụ nʼihe ebe.
They drive away the donkey of those without fathers; they take the widow's ox as security.
4 Site nʼokporoụzọ ka ha na-akwapụ ndị nọ na mkpa. Ha na-ejikwa aka ike mee ka ndị ogbenye dị nʼala ahụ zoo onwe ha.
They force needy people out of their path; poor people of the earth all hide themselves from them.
5 Dịka ịnyịnya ibu ọhịa nọ nʼọzara, otu a ka ndị ogbenye si agagharị na-achọgharị ihe oriri, ala na-adịghị epupụta ihe na-enye ụmụ ha nri.
See, these poor people go out to their work like wild donkeys in the wilderness, looking carefully for food; perhaps the Arabah will provide them food for their children.
6 Ha na-ekpokọta ahịhịa anụ ụlọ na-ata nʼubi, na-atụtụkọtakwa mkpụrụ vaịnị nke fọdụrụ nʼubi ndị ajọ omume.
Poor people reap in the night in other people's fields; they glean grapes from the harvest of those wicked people.
7 Nʼihi enweghị uwe, ha na-agba ọtọ nʼabalị, ha enwekwaghị akwa iji kpuchie onwe ha oyi.
They lie naked all night without clothing; they have no covering in the cold.
8 Oke mmiri ozuzo nke ugwu na-ede ha ahụ, ha na-amaku nkume nʼihi enweghị ebe mgbaba.
They are wet with the showers of the mountains; they lie next to large rocks because they have no shelter.
9 Nwa na-enweghị nna ka a na-eji ike napụ ara. Nwa ọhụrụ nke onye ogbenye ka a na-anara nʼihe ebe.
There are wicked people who pluck orphans from their mothers' breast, and wicked people who take children as security from poor people.
10 Nʼihi enweghị akwa ha na-agba ọtọ na-agagharị, ha na-ebu ukwu ọka ma nọrọ nʼagụụ.
But the poor people go about naked without clothing; although they go hungry, they carry bundles of grain belonging to other people.
11 Ha na-asụpụta mmanụ oliv nʼelu ebe e mebere maka ya, ha na-azọchapụta mmanya vaịnị ma akpịrị na-akpọ ha nkụ.
The poor people make oil within the walls of those wicked men; they tread the wicked men's winepresses, but they themselves suffer thirst.
12 Ụzụ ịsụ ude ndị na-anwụ si nʼobodo na-ebili, mkpụrụobi nke ndị e merụrụ ahụ na-eti mkpu enyemaka. Ma ọ dịghị onye Chineke na-ahụta ka onye ikpe mara nʼihi ihe ndị a.
From out of the city the dying groan, and the throat of the wounded cries out for help. But God does not ascribe blame
13 “Ọ dị ndị na-enupu isi megide ìhè, ndị na-amaghị ụzọ ya maọbụ na-anọgide nʼụzọ ya.
Some of these wicked people rebel against the light; they know not its ways, nor do they stay in its paths.
14 Mgbe ìhè nke ụbọchị gafere, ogbu mmadụ na-ebili, gbuo onye ogbenye na onye nọ na mkpa; nʼabalị kwa, ọ na-ezoba dịka onye ohi.
Before daylight the murderer rises and he kills poor and needy people; in the night he is like a thief.
15 Anya onye na-akwa iko na-ele anya chi ojiji; ọ na-eche nʼobi ya sị, ‘Ọ dịghị onye ọbụla ga-ahụ m,’ ọ na-ekpuchikwa ihu ya.
Also, the eye of the adulterer waits for the twilight; he says, 'No eye will see me.' He disguises his face.
16 Nʼọchịchịrị, ndị ohi na-egbuka ụlọ ndị mmadụ baa, ma nʼehihie ha na-emechibido onwe ha ụzọ nʼime ụlọ; o nweghị ihe ha na ìhè jikọrọ.
In the darkness wicked people dig into houses; but they shut themselves up in the daytime; they do not care for the light.
17 Nʼebe ha niile nọ, etiti abalị bụ ụtụtụ ha, ha na ihe egwu nke ọchịchịrị bụ enyi.
For all of them, thick darkness is like the morning; for they are friends with the terrors of thick darkness.
18 “Ma ha bụ ụfụfụ dị nʼelu mmiri; ala ha ketara bụ ihe a bụrụ ọnụ, nke mere na ọ dịghị onye na-agakwa nʼubi vaịnị ha.
Swiftly they pass away, however, like foam on the surface of the waters; their portion of the land is cursed; no one goes to work in their vineyards.
19 Dịka okpomọkụ na ọkọchị si eme ka mkpụrụ mmiri oyi gbazee, otu a ka ala ili si ewere ndị mehiere nʼike. (Sheol )
As drought and heat melt away the snow into waters, so Sheol takes away those who have sinned. (Sheol )
20 Akpanwa na-echefu ha, ikpuru na-eji ha mere ihe oriri; anaghị echetakwa ndị ajọọ omume kama a na-etiji ha dịka osisi.
The womb that bore him will forget him; the worm will feed sweetly on him; he will be remembered no more; in this way, wickedness will be broken like a tree.
21 Ha na-akpagbu nwanyị aga na nwanyị na-enweghị nwa, ha adịghị elekọta nwanyị di ya nwụrụ.
The wicked one devours the barren women who have not borne children; he does no good to the widow.
22 Ma Chineke na-eji ike ya dọkpụrụ ndị dị ike nke ukwuu pụọ, ọ bụ ezie na ha bụ ndị ihe na-agara nke ọma, ma ha enweghị nkwa nke ndụ.
Yet God drags away the mighty people by his power; he rises up and does not strengthen them in life.
23 Ọ nwere ike ime ka ha dabere na ntụkwasị obi na o nweghị ihe pụrụ ịmetụ ha, ma anya ya dịkwasịrị ụzọ ha niile.
God allows them to think they are secure, and they are happy about that, but his eyes are on their ways.
24 A na-ebuli ha elu nwa mgbe nta, ma e mesịa, ha anọkwaghị, a na-eweda ha nʼala chikọtakwa ha dịka ndị ọzọ, a na-ebipụ ha dịka ukwu ọka.
These people are exalted; still, in only a little while, they will be gone; indeed, they will be brought low; they will be gathered up like all the others; they will be cut off like the tops of ears of grain.
25 “Ọ bụrụ na ọ bụghị otu a, onye pụrụ ị sị na ihe m kwuru bụ okwu ụgha si otu a mee ka okwu m bụrụ ihe efu?”
If it is not so, who can prove me to be a liar; who can make my speech worth nothing?”