< Job 23 >

1 Mgbe ahụ, Job zara sị:
Pamenepo Yobu anayankha kuti,
2 “Ọ bụladị taa, mkpesa m dị ilu; aka ya dị arọ megide m nʼagbanyeghị ịsụ ude m.
“Leronso kudandaula kwanga nʼkwakukulu kwambiri; Iye akundilanga kwambiri ngakhale ndi kubuwula.
3 A sịkwa na m maara ebe m ga-achọta ya; a sịkwa na m nwere ike ijeru ebe obibi ya!
Ndikanangodziwa kumene ndikanamupeza Mulungu; ndikanangopita kumene amakhalako!
4 Aga m edozi mkpesa m nʼusoro nʼihu ya were ịrụ ụka mejuo ọnụ m.
Ndikanafotokoza mlandu wanga pamaso pake ndipo ndikanayankhula mawu odziteteza.
5 Aga m achọpụta ihe o ga-aza m ma tuleekwa ihe ọ ga-agwa m.
Ndikanadziwa mawu amene Iye akanandiyankha, ndi kulingalira bwino zimene akananena!
6 Ọ ga-eji ike dị egwu megide m? Mba, ọ gaghị ebo m ebubo.
Kodi Iye akanalimbana nane mwa mphamvu zake zazikulu? Ayi, Iye sakanayankhula zinthu zotsutsana nane.
7 Nʼebe ahụ, onye ziri ezi ga-eme mkpesa nʼihu ya. Nʼebe ahụ, a ga-anapụtakwa m site nʼaka onye ikpe m rụọ mgbe ebighị ebi.
Kumeneko munthu wolungama akanafotokoza mlandu wake pamaso pake, ndipo woweruzayo akanandipeza wosalakwa nthawi zonse.
8 “Ma ọ bụrụ na m agaa nʼọwụwa anyanwụ ọ nọghị nʼebe ahụ; ọ bụrụ na m gaa nʼọdịda anyanwụ, agaghị m achọta ya.
“Taonani, ndikapita kummawa, Iye kulibe kumeneko, ndikapita kumadzulo sinditha kumupeza kumeneko.
9 Mgbe ọ nọ nʼọrụ nʼugwu anaghị m ahụ ya, mgbe ọ lọghachiri na ndịda anaghị m ahụkwa ya.
Akamagwira ntchito kumpoto, sindimuona kumeneko akapita kummwera, sindimuona.
10 Ma ọ maara ụzọ m na-aga, mgbe ọ nwapụtasịrị m, aga m apụta dịka ọlaedo,
Koma Iye amadziwa mmene ndimayendera; Iyeyo akandiyesa adzandipeza kuti ndili ngati golide.
11 ụkwụ m abụọ na-agbaso nzọ ụkwụ ya; ana m eso ụzọ ya na-atụgharịghị nʼaka nri maọbụ aka ekpe.
Mapazi anga akhala akuponda mʼmapazi ake; ndasunga njira yake ndipo sindinayitaye.
12 Esibeghị m nʼiwu nke si nʼọnụ ya pụta wezuga onwe m; a na m echekwa okwu ọnụ ya karịa nri nke m na-eri kwa ụbọchị.
Sindinapatuke kusiya malamulo ochokera pakamwa pake; ndasunga mawu a pakamwa pake kupambana chakudya changa cha tsiku ndi tsiku.
13 “Ma o guzo naanị ya, onye pụrụ iguzogide ya? Ọ na-eme ihe ọbụla masịrị ya.
“Koma Iyeyo ndi wosasinthika, ndipo ndani angatsutsane naye? Iye amachita chilichonse chimene wafuna.
14 Ọ na-emezu ụkpụrụ ya niile o zubere megide m, ọ ka nwekwara nzube ndị ọzọ yiri nke a o dobere imegide m.
Iye amachita chimene watsimikiza kuti chindichitikire, ndipo malingaliro oterowa ali nawobe.
15 Nʼihi ya ka obi ji ama m jijiji nʼihu ya; mgbe m chetara banyere ihe ndị a niile, ana m atụ egwu ya.
Nʼchifukwa chake ndikuchita mantha kwambiri pamaso pake; ndikamaganiza zonsezi ndimamuopa.
16 Chineke emeela ka obi m daa mba; Onye pụrụ ime ihe niile emeela ka m maa jijiji.
Mulungu walefula mtima wanga; Wamphamvuzonse wandiopseza kwambiri.
17 Ma ọchịchịrị emeghị ka m mechie ọnụ m, bụ oke ọchịchịrị nke kpuchiri ihu m.
Komatu sindinachititsidwe mantha ndi mdima, ndi mdima wandiweyani umene waphimba nkhope yanga.

< Job 23 >