< Job 22 >

1 Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
Kisha Elifazi Mtemani akajibu na kusema,
2 “Mmadụ ọ pụrụ ịbara Chineke uru? Ọ bụladị onye nwere uche ọ pụrụ ịbara Chineke uru?
Je mtu anaweza kumfaa Mungu “Je mwenye hekima anaweza kufaa kwake.
3 O nwere ọṅụ ọ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na ị bụ onye ezi omume? Uru gịnị ka ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na ụzọ gị niile enweghị ịta ụta?
Je inafurahisha kwa Mwenyezi ikiwa u mwenye haki? Je ni faida yake ukiyafanya safi maisha yako?
4 “Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo nʼihi na ị na-atụ egwu ya?
Je ni kwa sababu ya uchaji wako kwake hata akukemee na kukuadhibu?
5 Ọ bụ na mmebi iwu gị adịghị ukwuu? Mmehie gị o nwere ọgwụgwụ?
Je si kwa sababu ya wingi wa uovu wako? Je hakuna mwisho wa makosa yako?
6 Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu; ị yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ.
Kwa maana umechukua dhamana kutoka kwa ndugu yako bila sababu; umechukua mavazi ya mtu na kumwacha uchi.
7 I nyeghị ndị ike gwuru mmiri, i nyeghịkwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri.
Haukuwapa wenye kiu maji ya kunywea; umewanyima chakula wenye njaa
8 Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya,
japokuwa wewe, mwenye uwezo, uliimiliki nchi, japokuwa wewe, mwenye kuheshimiwa, uliishi ndani yake.
9 Ị na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha, Ị na-anyaji ogwe aka nke ụmụ na-enweghị nna.
Umewaacha wajane waondoke bila kitu; umewatesa yatima.
10 Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu, bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu.
Kwa hiyo, mabaya yanakuzunguka, na hofu za ghafla zinakusumbua.
11 Ọ bụkwa ya mere ọchịchịrị ji gbaa gị gburugburu ka ị ghara ịhụ ụzọ, meekwa ka idee mmiri kpuchie gị.
Kuna giza, hata usione; gharika inakufunika.
12 “Ọ bụ na Chineke anọghị nʼebe dị elu nke eluigwe? Lee ka ịdị elu nke kpakpando dị elu si dị.
Je Mungu hayupo juu mbinguni? Anaangalia juu ya nyota, jinsi zilivyo juu!
13 Kama ị na-asị, ‘Gịnị ka Chineke maara? Ọ na-esite nʼoke ọchịchịrị dị otu a ekpe ikpe?
Unasema, 'Mungu anajua nini? Je anaweza kuamua kupitia giza totoro?
14 Oke ọchịchịrị kpuchiri ya, nke mere na ọ naghị ahụ anyị mgbe ọ na-agagharị nʼebe dị elu nke eluigwe.’
Mawingu ni kifuniko chake, hata asituone; anatembea anga la mbinguni.'
15 Ị ga-agbaso ụzọ ochie nke ndị na-eme ihe ọjọọ zoro ije na ya?
Je utayaishi maisha ya zamani walioishi waovu -
16 E bupụrụ ha tupu oge ha eruo. Ntọala ndụ ha ka idee mmiri sachapụrụ
walioondolewa kabla ya siku zao, ambao misingi yao imeondolewa kama mto,
17 Ha sịrị Chineke, ‘Hapụ anyị aka! Gịnị ka Onye pụrụ ime ihe niile ga-eme anyị?’
waliomwambia Mungu, 'Ondoka kwetu'; waliosema, 'Mwenyezi anaweza kututenda nini?
18 Ma ọ bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha, ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
Hata hivyo bado alizijaza nyumba zao kwa mema; mipango ya waovu iko mbali nami.
19 Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa; ndị aka ha dị ọcha na-akwa ha emo sị:
Wenye haki wanayaona yawapatayo waovu na kufurahi; wasio na hatia wanawacheka kwa dhihaka.
20 ‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị, ọkụ erepịala akụnụba ha.’
Wanasema, 'Bila shaka walioinuka kinyume chetu wameondolewa; moto umeteketeza mali zao.'
21 “Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo, nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.
Basi patana na Mungu na uwe na amani naye; kwa njia hiyo, mema yatakujia.
22 Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ, doo okwu ya niile nʼobi gị.
Nakusihi, pokea, maelekezo yake; uyatii maneno yake.
23 Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị; ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị,
Ukimrudia Mwenyezi, utajengwa, ukiacha kutenda uovu makaoni mwako.
24 tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja, tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta.
Weka hazina zako mavumbini, dhahabu ya Ofiri kati ya mawe ya vijito,
25 Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo, bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma.
na Mwenyezi atakuwa hazina zako, fedha ya thamani kwako.
26 Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ, ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke.
Nawe utajifurahisha katika Mwenyezi; utamwangalia Mungu.
27 Ị ga-ekpe ekpere, ọ ga-azakwa gị ekpere gị, ị ga-emezukwa nkwa i kwere.
Utamwomba, naye atakusikiliza; utamtolea nadhiri.
28 Ihe i kpebiri ga-emezukwa, ìhè ga-amụkwasị nʼụzọ gị niile.
Lakini pia utatamka lolote, nawe utapewa; nuru itaangaza maishani mwako.
29 Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’ mgbe ahụ ọ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala.
Mungu humshusha mwenye kiburi, naye humwinua mnyenyekevu.
30 Ọ ga-azọpụta ọ bụladị onye ahụ nke aka ya na-adịghị ọcha, bụ onye nke a ga-azọpụta site nʼịdị ọcha nke aka gị.”
Atamwokoa asiye na hatia; utaokolewa kupitia usafi wa mikono yako.”

< Job 22 >