< Job 22 >

1 Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
Then Eliphaz the Temanite answered and said:
2 “Mmadụ ọ pụrụ ịbara Chineke uru? Ọ bụladị onye nwere uche ọ pụrụ ịbara Chineke uru?
Can a man, then, profit God? Behold, the wise man profiteth himself.
3 O nwere ọṅụ ọ ga-enye Onye pụrụ ime ihe niile ma a sị na ị bụ onye ezi omume? Uru gịnị ka ọ ga-enweta ma ọ bụrụ na ụzọ gị niile enweghị ịta ụta?
Is it a pleasure to the Almighty, that thou art righteous; Or a gain to him, that thou walkest uprightly?
4 “Chineke ọ na-abara gị mba na-ebo gị ebubo nʼihi na ị na-atụ egwu ya?
Will he contend with thee because he feareth thee? Will he enter with thee into judgment?
5 Ọ bụ na mmebi iwu gị adịghị ukwuu? Mmehie gị o nwere ọgwụgwụ?
Hath not thy wickedness been great? Have not thine iniquities been numberless?
6 Ị naara ụmụnne gị ihe ebe nʼefu; ị yipụrụ ndị mmadụ uwe ha gbawa ha ọtọ.
For thou hast taken a pledge from thy brother unjustly, And stripped the poor of their clothing.
7 I nyeghị ndị ike gwuru mmiri, i nyeghịkwa ndị agụụ na-agụ ihe oriri.
Thou hast given the weary no water to drink, And withholden bread from the hungry.
8 Ọ bụ eziokwu na ị bụ nwoke dị ike na onye nwere ala, bụrụkwa onye a na-asọpụrụ bi nʼala ya,
But the man of power, his was the land, And the honorable man dwelt in it.
9 Ị na-agbaba ụmụ nwanyị di ha nwụrụ aka, zipụ ha, Ị na-anyaji ogwe aka nke ụmụ na-enweghị nna.
Thou hast sent widows away empty, And broken the arms of the fatherless.
10 Ọ bụ ya mere ọnya jiri gbaa gị gburugburu, bụrụkwa ihe mbibi ji eyi gị egwu.
Therefore snares are round about thee, And sudden fear confoundeth thee;
11 Ọ bụkwa ya mere ọchịchịrị ji gbaa gị gburugburu ka ị ghara ịhụ ụzọ, meekwa ka idee mmiri kpuchie gị.
Or darkness, through which thou canst not see, And floods of water cover thee.
12 “Ọ bụ na Chineke anọghị nʼebe dị elu nke eluigwe? Lee ka ịdị elu nke kpakpando dị elu si dị.
Is not God in the height of heaven? And behold the stars, how high they are!
13 Kama ị na-asị, ‘Gịnị ka Chineke maara? Ọ na-esite nʼoke ọchịchịrị dị otu a ekpe ikpe?
Hence thou sayest, “What doth God know? Can he govern behind the thick darkness?
14 Oke ọchịchịrị kpuchiri ya, nke mere na ọ naghị ahụ anyị mgbe ọ na-agagharị nʼebe dị elu nke eluigwe.’
Dark clouds are a veil to him, and he cannot see; And he walketh upon the arch of heaven.”
15 Ị ga-agbaso ụzọ ochie nke ndị na-eme ihe ọjọọ zoro ije na ya?
Wilt thou take the old way Which wicked men have trodden,
16 E bupụrụ ha tupu oge ha eruo. Ntọala ndụ ha ka idee mmiri sachapụrụ
Who were cut down before their time, And whose foundations were swept away by a flood?
17 Ha sịrị Chineke, ‘Hapụ anyị aka! Gịnị ka Onye pụrụ ime ihe niile ga-eme anyị?’
Who said unto God, “Depart from us!” And, “What can the Almighty do to us?”
18 Ma ọ bụ ya ji ihe dị mma dị iche iche mejupụta ụlọ ha, ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
And yet he filled their houses with good things!—Far from me be the counsel of the wicked!
19 Ndị ezi omume na-ahụ mbibi ndị dị otu a ma ṅụrịa; ndị aka ha dị ọcha na-akwa ha emo sị:
The righteous see their fate, and rejoice; And the innocent hold them in derision.
20 ‘Nʼezie, e bibiela ndị iro anyị, ọkụ erepịala akụnụba ha.’
“Truly our adversary is destroyed, And fire hath consumed his abundance!”
21 “Doo onwe gị nʼokpuru Chineke ka gị na ya nọọ nʼudo, nʼụzọ dị otu a, ọganihu ga-abịara gị.
Acquaint now thyself with him, and be at peace: Thus shall prosperity return to thee.
22 Gee ntị, nabata ndụmọdụ si ya nʼọnụ, doo okwu ya niile nʼobi gị.
Receive, I pray thee, instruction from his mouth, And lay up his words in thy heart.
23 Ọ bụrụ na ịlaghachikwute Onye pụrụ ime ihe niile, ọ ga-eweghachi gị nʼọnọdụ gị; ọ bụrụ na iwezuga ihe mmebi iwu mee ka ọ dị anya site nʼebe ụlọ ikwu gị dị,
If thou return to the Almighty, thou shalt be built up; If thou put away iniquity from thy tent.
24 tọgbọ ọkpụrụkpụ ọlaedo gị nʼaja, tụpụkwa ọlaedo nke Ọfịa gị nʼelu nkume dị nʼime ọdọ mmiri nta.
Cast to the dust thy gold, And the gold of Ophir to the stones of the brook:
25 Mgbe ahụ, Onye pụrụ ime ihe niile ga-abụrụ gị ọlaedo, bụkwara gị ọlaọcha kachasị mma.
Then shall the Almighty be thy gold, Yea, treasures of silver unto thee;
26 Nʼezie, mgbe ahụ kwa, ihe nke Onye pụrụ ime ihe niile ga-atọ mkpụrụobi gị ụtọ, ị ga-ewelikwa ihu gị nye Chineke.
For then shalt thou have delight in the Almighty, And shalt lift up thy face unto God.
27 Ị ga-ekpe ekpere, ọ ga-azakwa gị ekpere gị, ị ga-emezukwa nkwa i kwere.
Thou shalt pray to him, and he shall hear thee, And thou shalt perform thy vows.
28 Ihe i kpebiri ga-emezukwa, ìhè ga-amụkwasị nʼụzọ gị niile.
The purpose which thou formest shall prosper with thee, And light shall shine upon thy ways.
29 Mgbe a na-eweda ndị mmadụ ala, ọ bụrụkwa na ị sị, ‘Bulienụ ha elu,’ mgbe ahụ ọ ga-azọpụta ndị e wedara nʼala.
When men are cast down, thou shalt say, “There lifting up!” And the humble person he will save.
30 Ọ ga-azọpụta ọ bụladị onye ahụ nke aka ya na-adịghị ọcha, bụ onye nke a ga-azọpụta site nʼịdị ọcha nke aka gị.”
He will deliver even him that is not innocent. The purity of thy hands shall save him.

< Job 22 >