< Job 21 >
UJobe wasephendula wathi:
2 “Gee ntị nke ọma nʼokwu m; ka nke a bụrụ nkasiobi ị ga-enye m.
“Lalelani kuhle amazwi ami; lokhu akube yinduduzo elingipha yona.
3 Nwee ndidi ka m kwuchaa okwu m, mgbe m kwuchara, gaa nʼihu ịkwa m emo.
Ake lingibekezelele nxa ngisakhuluma, ngithi nxa sengikhulumile liklolode.
4 “Ọ bụ mmadụ ka m na-ekpesara? Gịnị ka m ga-eji ghara ịbụ onye na-enweghị ndidi?
Ukusola kwami kuqonde umuntu yini? Ngingayekelelani ukucunuka pho?
5 Lee m anya ka ahụ maa gị jijiji; were aka gị kpuchie ọnụ gị.
Ngikhangelani, lizamangala; vulani imilomo yenu ngezandla.
6 Mgbe m chere echiche maka nke a, egwu tụrụ m meekwa ka ahụ m maa jijiji.
Nxa ngikhumbula ngalokhu ngitshaywa luvalo; ngizwa umzimba wami uqhaqhazela.
7 Gịnị mere ndị ajọ omume ji enwe ndụ ogologo, ghọọ okenye, baakwa ụba nʼịdị ike?
Kungani ababi bephila impilo ende, baluphale nje amandla abo esanda?
8 Ha na-ahụ ụmụ ka ha na-akwụsike ike gburugburu ha, ụmụ ha ka ha ji anya ha ahụ.
Babona abantwababo bezinza benamile, inzalo yabo layo beyikhangele.
9 Ha na-ebi ndụ udo nʼezinaụlọ ha na-atụghị egwu na ihe ọjọọ ọbụla ga-adakwasị ha; mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha.
Imizi yabo ihlezi kayilakwesaba; induku kaNkulunkulu kayikho phezu kwabo.
10 Oke ehi ha na-agba nne ehi ha na-esepụghị aka; nne ehi ha na-amụ ụmụ, ha adịghị ekwo ime.
Inkunzi zabo zikhuthele ziyazala; amankomokazi abo azala kuhle kawaphunzi.
11 Ha na-ezipụ ụmụ ha dịka igwe atụrụ; ụmụntakịrị ha na-etegharị egwu.
Abantwababo bayazihambela njengomhlambi; izingane zabo ziyazigidela zichelesile.
12 Ha na-abụ abụ nʼụda egwu otiti na ụbọ akwara; ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda nke ọja.
Bayahlabela betshaya izigubhu lamachacho; bayazithokozisa ngomsindo wemiqangala.
13 Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu, ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo. (Sheol )
Yonke iminyaka yabo ngeyokuphumelela baze bayongena egodini belokuthula. (Sheol )
14 Ma ndị a na-asị Chineke, ‘Hapụ anyị aka, ọ dịghị anyị mkpa ịmata ụzọ gị.
Kodwa bathi kuNkulunkulu, ‘Tshiyana lathi! Kasifisi ukuzazi izindlela zakho.
15 Onye ka Onye pụrụ ime ihe niile bụ, anyị ga-eji jeere ya ozi? Uru gịnị ka ịrịọ ya arịrịọ ga-abara anyị?’
Ungubani yena uSomandla ofuna ukuthi simkhonze na? Sizazuzani nxa sikhuleka kuye na?’
16 Ma ọganihu ha adịghị nʼaka ha ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
Kodwa ukuphumelela kwabo kakukho ezandleni zabo, ngakho kangisondeli ezelulekweni zababi.
17 “Ma ugboro ole ka a na-emenyụ ọkụ oriọna nke ndị na-emebi iwu? Ugboro ole ka nhụju anya na-adakwasị ha, bụ nke Chineke kenyere ha nʼiwe ya?
Kodwa kukangaki na isibane sababi sicinywa? Kukangaki besehlelwa ngamabhadi na, abawabelwa nguNkulunkulu ezondile?
18 Ugboro ole ka ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ nʼihu ikuku, maọbụ dịka igbugbo ọka nke ikuku siri ike na-efesasị?
Kukangaki besiba njengomule emoyeni na, njengamakhoba ephetshulwa yisivunguzane?
19 A na-asị, ‘Chineke na-akpakọtara ụmụ ha ntaramahụhụ nke njehie ha.’ Ka a kwụghachi ha ya, ka ha nwee ike mata ya.
Kuthiwa, ‘UNkulunkulu ulomba isijeziso somuntu asibekele amadodana akhe.’ Kajezise yena umuntu ngokwakhe ukuze akwazi!
20 Ka anya ha hụ mbibi nke onwe ya, ka ha ṅụọ ọnụma nke Onye pụrụ ime ihe niile dịka mmiri.
Amehlo akhe kawakubone ukuchithwa kwakhe; kalunathe ulaka lukaSomandla.
21 Gịnị gbasara ha banyere ezinaụlọ ha hapụrụ mgbe ọnwa ndị e kenyere ya bịara na ngwụcha?
Ngoba uvele uzihlupha ngani ngemuli avele ezayitshiya nxa izinyanga zakhe azabelweyo seziphelile na?
22 “Ọ dị onye pụrụ izi Chineke ihe ọmụma, ebe ọ bụ ya na-ekpe ndị kachasị elu ikpe?
Kambe ukhona ongafundisa uNkulunkulu ulwazi, njengoba yena esahlulela labaphezulu na?
23 Otu onye na-anwụ mgbe o jupụtara nʼike na ume, mgbe ọ nọ na nchekwa na udo,
Umuntu uyafa ephilile kuhle, kukuhle konke ekhululekile,
24 mgbe ahụ ya bụ nke eji ezi nri zụọ nke ọma, ọkpụkpụ ya jupụtakwara nʼụmị.
umzimba wakhe uzimukile, amathambo akhe egcwele umnkantsho.
25 Onye ọzọ na-anwụ nʼihe ilu nke mkpụrụobi, nʼihi na o nweghị mgbe o riri ezi ihe ọbụla.
Omunye ufa elobuhlungu emphefumulweni wakhe, evele engakaze akholise lutho oluhle.
26 Nke ọbụla nʼime ha dina nʼakụkụ ibe ya nʼime aja, ikpuru kpuchikwara ha abụọ.
Bobabili balaliswe ndawonye eceleni komunye othulini, impethu zinyakaze phezu kwabo bobabili.
27 “Amaara m nke ọma ihe bụ echiche unu na nzube unu ji emegide m.
Ngiyazi kamhlophe ukuthi licabangani, amacebo elidinga ukungilimaza ngawo.
28 Unu ga-ajụ m ajụjụ sị, ‘Ugbu a, ole ụlọ oke mmadụ ahụ. Ụlọ ikwu ndị ahụ ebe ndị na-emebi iwu biiri?’
Lithi, ‘Ingaphi-ke manje indlu yesikhulu, amathente okwakuhlala kuwo abantu ababi?’
29 Ọ bụ na unu ajụbeghị ndị njem ajụjụ? Ọ bụ na unu ejighị ihe ha kọrọ mere ihe,
Kalikaze libuze labo abahambayo na? Kalize lananzelela izinto abazilandisayo,
30 na a na-echebe ndị ọjọọ pụọ nʼụbọchị nhụju anya, na a na-anapụta ha site nʼụbọchị oke iwe?
ukuthi umuntu omubi uyaphepha ngosuku lokubhujiswa na, ukuthi uyakhululwa ngosuku lwesiphithiphithi?
31 Onye na-atụ ha mmehie ha nʼihu? Onye kwa na-akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere?
Kambe ngubani omtshela ngobubi bakhe ebusweni bakhe na? Ngubani ophindiselayo ngalokho akwenzileyo na?
32 A na-eburu ha gaa nʼili, a na-echekwa ili ha nche.
Uthwalelwa engcwabeni, lilindwe ingcwaba lakhe ngemfanelo.
33 Aja dị na ndagwurugwu na-atọ ha ụtọ; Mmadụ niile na-eso ha nʼazụ, na ọtụtụ a na-apụghị ịgụta ọnụ na-ebu ha ụzọ nʼaga.
Inhlabathi esigodini leso imnandi kuye; bonke abantu bayamlandela, banengi kakhulu njalo abahamba kuqala kulaye.
34 “Ya mere, olee otu unu ga-esi were okwu na-enweghị isi kasịe m obi? Ọ dịghị ihe fọdụrụ nʼọsịịsa unu ma ọ bụghị naanị okwu ụgha.”
Pho-ke lingangiduduza njani likhuluma ize nje? Akusalanga lutho elilutshoyo ngaphandle kwenkohliso.”