< Job 21 >

1 Mgbe ahụ, Job zara sị:
ויען איוב ויאמר
2 “Gee ntị nke ọma nʼokwu m; ka nke a bụrụ nkasiobi ị ga-enye m.
שמעו שמוע מלתי ותהי-זאת תנחומתיכם
3 Nwee ndidi ka m kwuchaa okwu m, mgbe m kwuchara, gaa nʼihu ịkwa m emo.
שאוני ואנכי אדבר ואחר דברי תלעיג
4 “Ọ bụ mmadụ ka m na-ekpesara? Gịnị ka m ga-eji ghara ịbụ onye na-enweghị ndidi?
האנכי לאדם שיחי ואם-מדוע לא-תקצר רוחי
5 Lee m anya ka ahụ maa gị jijiji; were aka gị kpuchie ọnụ gị.
פנו-אלי והשמו ושימו יד על-פה
6 Mgbe m chere echiche maka nke a, egwu tụrụ m meekwa ka ahụ m maa jijiji.
ואם-זכרתי ונבהלתי ואחז בשרי פלצות
7 Gịnị mere ndị ajọ omume ji enwe ndụ ogologo, ghọọ okenye, baakwa ụba nʼịdị ike?
מדוע רשעים יחיו עתקו גם-גברו חיל
8 Ha na-ahụ ụmụ ka ha na-akwụsike ike gburugburu ha, ụmụ ha ka ha ji anya ha ahụ.
זרעם נכון לפניהם עמם וצאצאיהם לעיניהם
9 Ha na-ebi ndụ udo nʼezinaụlọ ha na-atụghị egwu na ihe ọjọọ ọbụla ga-adakwasị ha; mkpara Chineke adịghịkwa adakwasị ha.
בתיהם שלום מפחד ולא שבט אלוה עליהם
10 Oke ehi ha na-agba nne ehi ha na-esepụghị aka; nne ehi ha na-amụ ụmụ, ha adịghị ekwo ime.
שורו עבר ולא יגעל תפלט פרתו ולא תשכל
11 Ha na-ezipụ ụmụ ha dịka igwe atụrụ; ụmụntakịrị ha na-etegharị egwu.
ישלחו כצאן עויליהם וילדיהם ירקדון
12 Ha na-abụ abụ nʼụda egwu otiti na ụbọ akwara; ha na-aṅụrịkwa ọṅụ nʼụda nke ọja.
ישאו כתף וכנור וישמחו לקול עוגב
13 Ha na-anọ ụbọchị ndụ ha niile nʼọganihu, ha na-arịdakwa nʼili ha nʼudo. (Sheol h7585)
יבלו (יכלו) בטוב ימיהם וברגע שאול יחתו (Sheol h7585)
14 Ma ndị a na-asị Chineke, ‘Hapụ anyị aka, ọ dịghị anyị mkpa ịmata ụzọ gị.
ויאמרו לאל סור ממנו ודעת דרכיך לא חפצנו
15 Onye ka Onye pụrụ ime ihe niile bụ, anyị ga-eji jeere ya ozi? Uru gịnị ka ịrịọ ya arịrịọ ga-abara anyị?’
מה-שדי כי-נעבדנו ומה-נועיל כי נפגע-בו
16 Ma ọganihu ha adịghị nʼaka ha ya mere ana m ewezuga onwe m site na ndụmọdụ ndị na-emebi iwu.
הן לא בידם טובם עצת רשעים רחקה מני
17 “Ma ugboro ole ka a na-emenyụ ọkụ oriọna nke ndị na-emebi iwu? Ugboro ole ka nhụju anya na-adakwasị ha, bụ nke Chineke kenyere ha nʼiwe ya?
כמה נר-רשעים ידעך-- ויבא עלימו אידם חבלים יחלק באפו
18 Ugboro ole ka ha dịka ahịhịa kpọrọ nkụ nʼihu ikuku, maọbụ dịka igbugbo ọka nke ikuku siri ike na-efesasị?
יהיו כתבן לפני-רוח וכמץ גנבתו סופה
19 A na-asị, ‘Chineke na-akpakọtara ụmụ ha ntaramahụhụ nke njehie ha.’ Ka a kwụghachi ha ya, ka ha nwee ike mata ya.
אלוה יצפן-לבניו אונו ישלם אליו וידע
20 Ka anya ha hụ mbibi nke onwe ya, ka ha ṅụọ ọnụma nke Onye pụrụ ime ihe niile dịka mmiri.
יראו עינו כידו ומחמת שדי ישתה
21 Gịnị gbasara ha banyere ezinaụlọ ha hapụrụ mgbe ọnwa ndị e kenyere ya bịara na ngwụcha?
כי מה-חפצו בביתו אחריו ומספר חדשיו חצצו
22 “Ọ dị onye pụrụ izi Chineke ihe ọmụma, ebe ọ bụ ya na-ekpe ndị kachasị elu ikpe?
הלאל ילמד-דעת והוא רמים ישפוט
23 Otu onye na-anwụ mgbe o jupụtara nʼike na ume, mgbe ọ nọ na nchekwa na udo,
זה--ימות בעצם תמו כלו שלאנן ושליו
24 mgbe ahụ ya bụ nke eji ezi nri zụọ nke ọma, ọkpụkpụ ya jupụtakwara nʼụmị.
עטיניו מלאו חלב ומח עצמותיו ישקה
25 Onye ọzọ na-anwụ nʼihe ilu nke mkpụrụobi, nʼihi na o nweghị mgbe o riri ezi ihe ọbụla.
וזה--ימות בנפש מרה ולא-אכל בטובה
26 Nke ọbụla nʼime ha dina nʼakụkụ ibe ya nʼime aja, ikpuru kpuchikwara ha abụọ.
יחד על-עפר ישכבו ורמה תכסה עליהם
27 “Amaara m nke ọma ihe bụ echiche unu na nzube unu ji emegide m.
הן ידעתי מחשבותיכם ומזמות עלי תחמסו
28 Unu ga-ajụ m ajụjụ sị, ‘Ugbu a, ole ụlọ oke mmadụ ahụ. Ụlọ ikwu ndị ahụ ebe ndị na-emebi iwu biiri?’
כי תאמרו איה בית-נדיב ואיה אהל משכנות רשעים
29 Ọ bụ na unu ajụbeghị ndị njem ajụjụ? Ọ bụ na unu ejighị ihe ha kọrọ mere ihe,
הלא שאלתם עוברי דרך ואתתם לא תנכרו
30 na a na-echebe ndị ọjọọ pụọ nʼụbọchị nhụju anya, na a na-anapụta ha site nʼụbọchị oke iwe?
כי ליום איד יחשך רע ליום עברות יובלו
31 Onye na-atụ ha mmehie ha nʼihu? Onye kwa na-akwụghachi ha ụgwọ ihe ha mere?
מי-יגיד על-פניו דרכו והוא-עשה מי ישלם-לו
32 A na-eburu ha gaa nʼili, a na-echekwa ili ha nche.
והוא לקברות יובל ועל-גדיש ישקוד
33 Aja dị na ndagwurugwu na-atọ ha ụtọ; Mmadụ niile na-eso ha nʼazụ, na ọtụtụ a na-apụghị ịgụta ọnụ na-ebu ha ụzọ nʼaga.
מתקו-לו רגבי-נחל ואחריו כל-אדם ימשוך ולפניו אין מספר
34 “Ya mere, olee otu unu ga-esi were okwu na-enweghị isi kasịe m obi? Ọ dịghị ihe fọdụrụ nʼọsịịsa unu ma ọ bụghị naanị okwu ụgha.”
ואיך תנחמוני הבל ותשובתיכם נשאר-מעל

< Job 21 >