< Job 2 >

1 Ụbọchị ọzọkwa, ụmụ Chineke bịakwara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị. Ekwensu sonyekwaara ha ọzọ bịakwa igosi onwe ya nʼihu ya.
Kwakulosuku futhi lapho amadodana kaNkulunkulu afika ukuzimisa phambi kweNkosi, uSathane laye wafika phakathi kwawo ukuzimisa phambi kweNkosi.
2 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụkwara ekwensu ajụjụ sị, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”
INkosi yasisithi kuSathane: Uvela ngaphi? USathane wasephendula iNkosi wathi: Ekuzulazuleni emhlabeni lekuhambahambeni kuwo.
3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ dị nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla. Ọ ka jidekwara izuoke ya, nʼagbanyeghị na ị kpaliri m imegide ya ka m laa ya nʼiyi mgbe ọ na-adịghị ihe o mere.”
INkosi yasisithi kuSathane: Ubekile yini inhliziyo yakho encekwini yami uJobe? Ngoba kakho onjengaye emhlabeni, umuntu opheleleyo loqondileyo, owesaba uNkulunkulu, loxwaya ububi? Usabambelele kubo ubuqotho bakhe, lanxa ungivuse ukuze ngimchithe kungelasizatho.
4 Ekwensu zaghachiri Onyenwe anyị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya.
USathane wasephendula iNkosi wathi: Isikhumba ngesikhumba, yebo, konke umuntu alakho uzakunikelela impilo yakhe.
5 Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.”
Kodwa khathesi yelula isandla sakho, uthinte ithambo lakhe lenyama yakhe; isibili uzakuthuka ebusweni bakho.
6 Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Lee, ọ nọ nʼaka gị. Kama ị ghaghị idebe ndụ ya.”
INkosi yasisithi kuSathane: Khangela, usesandleni sakho; kodwa gcina impilo yakhe.
7 Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya.
USathane wasephuma phambi kweNkosi, wamtshaya uJobe ngamathumba amabi, kusukela ngaphansi konyawo lwakhe kuze kube enkanda yakhe.
8 Job tụtụụrụ mpekele ite wara awa, jiri ya na-akọ onwe ya ọkọ nʼahụ, ma dinara nʼebe e kpokọtara ntụ.
Wasezithathela udengezi ukuziphala ngalo, wahlala phakathi kwesilotha.
9 Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.”
Umkakhe wasesithi kuye: Usabambelele yini kubuqotho bakho? Thuka uNkulunkulu, ufe.
10 Ma ọ zara, “Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?” Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.
Kodwa wathi kuye: Ukhuluma njengokukhuluma komunye wabesifazana abayiziwula. Kambe, sizakwemukela okuhle kuNkulunkulu, singemukeli lokubi yini? Kukho konke lokhu uJobe konanga ngendebe zakhe.
11 Mgbe ndị enyi Job atọ, Elifaz onye Teman, Bildad onye Shua na Zofa onye Neama, nụrụ banyere nsogbu niile dakwasịrị ya, ha biliri ije site nʼụlọ ha, ha zukọtara site na nkwekọrịta ịga nọnyere ya na ịkasị ya obi.
Abangane abathathu bakaJobe sebezwile ngakho konke lokhu okubi okumehleleyo, beza, lowo lalowo evela endaweni yakhe, uElifazi umThemani, loBilidadi umShuhi, loZofari umNahama; bavumelana ndawonye ukuthi beze bamkhalele bamduduze.
12 Mgbe ha hụrụ ya site nʼebe dị anya, ha amataghị ya, ha weliri olu bido iti mkpu akwa, dọkaa uwe ha yi nʼahụ ha, kporo aja kpokwasị onwe ha nʼisi.
Lapho bephakamisa amehlo abo bekhatshana, kabamazanga, baphakamisa ilizwi labo, bakhala inyembezi, badabula ngulowo ibhatshi lakhe, bavuvuzela uthuli emakhanda abo ngasemazulwini.
13 Ha sooro Job nọdụ nʼala ụbọchị asaa, ehihie na abalị. Ọ dịghị onye gwara ya okwu nʼihi na ha hụrụ otu ihe mgbu ya si dị ukwuu.
Basebehlala laye emhlabathini insuku eziyisikhombisa lobusuku obuyisikhombisa, njalo kakho owakhuluma ilizwi kuye, ngoba babona ukuthi ubuhlungu bukhulu kakhulu.

< Job 2 >