< Job 2 >

1 Ụbọchị ọzọkwa, ụmụ Chineke bịakwara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị. Ekwensu sonyekwaara ha ọzọ bịakwa igosi onwe ya nʼihu ya.
Again, on the day when God’s sons came to present themselves before the LORD, Satan came also amongst them to present himself before the LORD.
2 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị jụkwara ekwensu ajụjụ sị, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”
The LORD said to Satan, “Where have you come from?” Satan answered the LORD, and said, “From going back and forth in the earth, and from walking up and down in it.”
3 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ dị nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla. Ọ ka jidekwara izuoke ya, nʼagbanyeghị na ị kpaliri m imegide ya ka m laa ya nʼiyi mgbe ọ na-adịghị ihe o mere.”
The LORD said to Satan, “Have you considered my servant Job? For there is no one like him in the earth, a blameless and an upright man, one who fears God, and turns away from evil. He still maintains his integrity, although you incited me against him, to ruin him without cause.”
4 Ekwensu zaghachiri Onyenwe anyị, “Akpụkpọ anụ ahụ lara akpụkpọ anụ ahụ; mmadụ ga-enye ihe niile o nwere nʼọnọdụ ndụ ya.
Satan answered the LORD, and said, “Skin for skin. Yes, all that a man has he will give for his life.
5 Setịpụ aka gị metụ akpụkpọ anụ ahụ ya na ọkpụkpụ ya, ọ ghakwaghị ị bụ gị ọnụ nʼihu gị.”
But stretch out your hand now, and touch his bone and his flesh, and he will renounce you to your face.”
6 Onyenwe anyị sịrị ekwensu, “Lee, ọ nọ nʼaka gị. Kama ị ghaghị idebe ndụ ya.”
The LORD said to Satan, “Behold, he is in your hand. Only spare his life.”
7 Mgbe ahụ, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ. O were ọnya ọjọọ na-egbu mgbu tie Job, site nʼọbọ ụkwụ ya ruo nʼopi isi ya.
So Satan went out from the presence of the LORD, and struck Job with painful sores from the sole of his foot to his head.
8 Job tụtụụrụ mpekele ite wara awa, jiri ya na-akọ onwe ya ọkọ nʼahụ, ma dinara nʼebe e kpokọtara ntụ.
He took for himself a potsherd to scrape himself with, and he sat amongst the ashes.
9 Nwunye ya sịrị ya, “Ị ka na-eguzo nʼizuoke gị? Bụọ Chineke ọnụ, nwụọ.”
Then his wife said to him, “Do you still maintain your integrity? Renounce God, and die.”
10 Ma ọ zara, “Ị na-ekwu okwu dịka otu nʼime ndị inyom nzuzu. Anyị ga-anata ihe ọma site nʼaka Chineke, hapụ ịnata ihe ọjọọ?” Ma nʼime nsogbu a niile, Job emehieghị site nʼikwu okwu ọjọọ ọbụla.
But he said to her, “You speak as one of the foolish women would speak. What? Shall we receive good at the hand of God, and shall we not receive evil?” In all this Job didn’t sin with his lips.
11 Mgbe ndị enyi Job atọ, Elifaz onye Teman, Bildad onye Shua na Zofa onye Neama, nụrụ banyere nsogbu niile dakwasịrị ya, ha biliri ije site nʼụlọ ha, ha zukọtara site na nkwekọrịta ịga nọnyere ya na ịkasị ya obi.
Now when Job’s three friends heard of all this evil that had come on him, they each came from his own place: Eliphaz the Temanite, Bildad the Shuhite, and Zophar the Naamathite; and they made an appointment together to come to sympathise with him and to comfort him.
12 Mgbe ha hụrụ ya site nʼebe dị anya, ha amataghị ya, ha weliri olu bido iti mkpu akwa, dọkaa uwe ha yi nʼahụ ha, kporo aja kpokwasị onwe ha nʼisi.
When they lifted up their eyes from a distance, and didn’t recognise him, they raised their voices, and wept; and they each tore his robe, and sprinkled dust on their heads towards the sky.
13 Ha sooro Job nọdụ nʼala ụbọchị asaa, ehihie na abalị. Ọ dịghị onye gwara ya okwu nʼihi na ha hụrụ otu ihe mgbu ya si dị ukwuu.
So they sat down with him on the ground seven days and seven nights, and no one spoke a word to him, for they saw that his grief was very great.

< Job 2 >