< Job 19 >

1 Job zara sị:
ויען איוב ויאמר׃
2 “Ruo ole mgbe ka unu ga-anọgide na-ata m ahụhụ? Ruo ole mgbe ka unu ga-ewere okwu ọnụ unu zọpịa m?
עד אנה תוגיון נפשי ותדכאונני במלים׃
3 Ugboro iri ndị a ka unu kọcharala m, ihere adịghị eme unu na unu na-ebuso m agha?
זה עשר פעמים תכלימוני לא תבשו תהכרו לי׃
4 A sịkwarị na m bụ onye mmehie, ọ bụ naanị mụ onwe m ka ọ gbasara.
ואף אמנם שגיתי אתי תלין משוגתי׃
5 Ọ bụrụ na unu na-ebuli onwe unu elu karịa m, ma were ọnọdụ ịdị ala m megide m,
אם אמנם עלי תגדילו ותוכיחו עלי חרפתי׃
6 mgbe ahụ, maranụ na Chineke emejọọla m, were ụgbụ ya tụọ m gburugburu.
דעו אפו כי אלוה עותני ומצודו עלי הקיף׃
7 “Ọ bụ ezie na m na-eti mkpu akwa sị: ‘A na-emejọ m.’ Ma ọ dịghị ọsịsa m na-anata; ọ bụ ezie na m na-eti mkpu ka e nyere m aka ma ikpe ziri ezi adịghị.
הן אצעק חמס ולא אענה אשוע ואין משפט׃
8 Ọ nọchiela ụzọ m ka m ghara ịgafe; o jirila ọchịchịrị kpuchie ụzọ m.
ארחי גדר ולא אעבור ועל נתיבותי חשך ישים׃
9 O yipụla m ugwu m, wepụkwa okpueze m kpu nʼisi.
כבודי מעלי הפשיט ויסר עטרת ראשי׃
10 Ọ na-eti m ihe otiti nʼakụkụ niile, ruo mgbe m gabigara; ọ na-ehopu olileanya m dịka osisi.
יתצני סביב ואלך ויסע כעץ תקותי׃
11 Iwe ya dị ọkụ megide m; ọ na-agụnyekwa m dịka onye iro ya.
ויחר עלי אפו ויחשבני לו כצריו׃
12 Ndị agha ya ji ike na-abịa; ha ewuola mgbidi were nnọchibido m ha agbaala ụlọ ikwu m gburugburu imegide m.
יחד יבאו גדודיו ויסלו עלי דרכם ויחנו סביב לאהלי׃
13 “O meela ka ụmụnne m na ndị enyi m si nʼebe m nọ pụọ.
אחי מעלי הרחיק וידעי אך זרו ממני׃
14 Ndị ikwu m anaghị etinyekwa uche nʼihe banyere m; ndị ezi enyi m niile echefuola m.
חדלו קרובי ומידעי שכחוני׃
15 Ndị ọbịa nọ nʼụlọ m na ndị odibo m nwanyị na-agụ m dịka onye ala ọzọ; adị m ka onye mba ọzọ nʼebe ha nọ.
גרי ביתי ואמהתי לזר תחשבני נכרי הייתי בעיניהם׃
16 Ana m akpọ odibo m oku ma ọ dịghị aza m, ọ bụladị mgbe m jiri ọnụ m rịọ ya.
לעבדי קראתי ולא יענה במו פי אתחנן לו׃
17 Iku ume m abụrụla ihe nwunye m apụghị ịnagide; abụrụla m ihe arụ nye ụmụnne m.
רוחי זרה לאשתי וחנתי לבני בטני׃
18 Ọ bụladị ụmụntakịrị nwoke na-akwa m emo; ha na-ejikwa m eme ihe ọchị mgbe ọbụla m pụtara.
גם עוילים מאסו בי אקומה וידברו בי׃
19 Ndị ahụ m kpọrọ ndị enyi ọma m na-ele m anya dịka m bụ ihe arụ; ndị ahụ niile m hụrụ nʼanya echigharịakwala megide m
תעבוני כל מתי סודי וזה אהבתי נהפכו בי׃
20 Abụ m naanị ọkpụkpụ ọkpụkpụ; ihe m ji gbanarị ọnwụ adịghị ukwuu.
בעורי ובבשרי דבקה עצמי ואתמלטה בעור שני׃
21 “Meerenụ m ebere, ndị enyi m, meerenụ m ebere, nʼihi na aka Chineke na-emegide m.
חנני חנני אתם רעי כי יד אלוה נגעה בי׃
22 Gịnị mere unu ji achụ m dịka Chineke si achụ m? Ọ ga-abụ na ahụhụ m ejubeghị unu afọ?
למה תרדפני כמו אל ומבשרי לא תשבעו׃
23 “Ọ gaara atọ m ụtọ ma a sị na e dekọrọ okwu m nʼakwụkwọ,
מי יתן אפו ויכתבון מלי מי יתן בספר ויחקו׃
24 na e ji mkpisi igwe dee ha, maọbụ kakwasị ha nʼelu mbadamba nkume ruo mgbe ebighị ebi.
בעט ברזל ועפרת לעד בצור יחצבון׃
25 Amara m na onye mgbapụta m na-adị ndụ, amakwaara m na ọ ga-eguzo nʼelu ụwa nʼoge ikpeazụ.
ואני ידעתי גאלי חי ואחרון על עפר יקום׃
26 Mgbe e mebisikwara akpụkpọ ahụ m, ma nʼanụ ahụ m aga m ahụ Chineke.
ואחר עורי נקפו זאת ומבשרי אחזה אלוה׃
27 Mụ onwe m ga-eji anya m abụọ hụ ya, mụ onwe m, ọ bụghị onye ọzọ. Lee ka obi m si anụ ọkụ nʼime m maka nke a!
אשר אני אחזה לי ועיני ראו ולא זר כלו כליתי בחקי׃
28 “Ọ bụrụ na unu asị, ‘Anyị ga-emegide ya nʼihi na nsogbu a si nʼaka ya,’
כי תאמרו מה נרדף לו ושרש דבר נמצא בי׃
29 unu onwe unu kwesiri ịtụ egwu mma agha; nʼihi na iwe ga-ebute ịta ahụhụ nke mma agha, mgbe ahụ, unu ga-ama na ikpe dị.”
גורו לכם מפני חרב כי חמה עונות חרב למען תדעון שדין׃

< Job 19 >