< Job 18 >

1 Mgbe ahụ Bildad onye Shua zara sị:
Sai Bildad mutumin Shuwa ya amsa,
2 “Ruo ole mgbe ka ị ga-ekwubi okwu ndị a ị na-ekwu? Nwee ezi uche ka anyị kparịtaa ụka.
“Yaushe za ka gama maganganun nan? Ka dawo da hankalinka sa’an nan za mu iya yin magana.
3 Gịnị mere i ji were anyị dịka anụ ọhịa, gụọ anyị dịka ndị na-enweghị uche nʼanya gị?
Don me muke kamar shanu a wurinka, ka ɗauke mu mutanen wofi?
4 Gị onye na-eji iwe adọkasị onwe gị, a ga-ahapụ ụwa nʼihi gị? Ka a ga-enupu oke nkume nʼọnọdụ ha?
Kai da ka yayyage kanka don haushi, za a yashe duniya saboda kai ne? Ko kuma duwatsu za su matsa daga wurinsu?
5 “A na-afụnyụ oriọna nke onye na-emebi iwu; ire ọkụ ya ga-akwụsịkwa inwu enwu,
“An kashe fitilar mugu; harshen wutarsa ya daina ci.
6 ìhè nke dị nʼime ụlọ ikwu ya na-abụ ọchịchịrị, oriọna nke dị nʼakụkụ ya na-anyụkwa.
Wutar cikin tentinsa ta zama duhu; fitilar da take kusa da shi ta mutu.
7 Ike agakwaghị adị na nzọ ukwu ya; atụmatụ ya onwe ya ga-atụda ya nʼala.
Ƙarfin takawarsa ya ragu; dabararsa ta ja fāɗuwarsa.
8 Ụkwụ ya na-eduba ya nʼọnya; ọ na-akpagharị na-adaba nʼime oghere.
Ƙafafunsa sun kai shi cikin raga, yana ta yawo a cikin ragar.
9 Ọnya na-ejide ikiri ụkwụ ya, ọnya ahụ na-ejidesi ya ike.
Tarko ya kama ɗiɗɗigensa; tarko ya riƙe shi kam.
10 E zobere ya ụdọ ọnya igbudu nʼala, ihe e ji ejide ya na-echere ya nʼụzọ ya.
An ɓoye masa igiya da za tă zarge shi a ƙasa; an sa masa tarko a kan hanyar da zai bi.
11 Ihe egwu na-emenye ya ụjọ nʼakụkụ niile, na-agbasokwa nzọ ụkwụ ya niile.
Tsoro duk ya kewaye shi ta kowane gefe yana bin shi duk inda ya je.
12 Ịla nʼiyi na-achọsi ya ike; mbibi nọkwa na njikere na-eche mgbe ọ ga-ada.
Masifa tana jiransa; bala’i yana shirye yă fāɗa masa a lokacin da zai fāɗi.
13 Mbibi na-eripịa akụkụ anụ ahụ ya; ọkpara ọnwụ na-eripịa ahụ ya niile.
Ya cinye wani sashe na gaɓar jikinsa; ɗan fari na mutuwa ya cinye ƙafafunsa.
14 Esi na nchekwa nke ụlọ ikwu ya dọpụta ya duru ya jekwuru eze nke ihe egwu niile.
An yage shi daga zaman lafiyar da yake yi a cikin tentinsa aka sa shi tsoro sosai.
15 Ọkụ na-ebi nʼime ụlọ ikwu ya; a ga-efesasị nkume na-enwu ọkụ nʼebe obibi ya.
Wuta ta cinye tentinsa; farar wuta ta rufe wurin da yake zama.
16 Mgbọrọgwụ ya na-akpọ nkụ nʼime ala, alaka ya ga-akpọnwụ nʼelu.
Jijiyoyinsa sun bushe a ƙasa rassansa sun mutu a sama.
17 A gaghị echeta echiche ya nʼụwa ọzọ, o nweghị onye ọbụla na-echetakwa aha ya.
An manta da shi a duniya; ba wanda yake ƙara tunawa da shi.
18 A na-esite nʼìhè chụba ya nʼọchịchịrị, otu a kwa, a na-achụpụkwa ya site nʼụwa.
An tura shi daga cikin haske zuwa cikin duhu, an kore shi daga duniya.
19 O nweghị ụmụ, o nwekwaghị ụmụ ụmụ nʼetiti ndị ya, ọ dịghị onye fọdụrụ nʼebe o bi na mbụ.
Ba shi da’ya’ya ko zuriya cikin mutanensa, ba sauran wanda yake a raye a wurin da ya taɓa zama.
20 Ọnọdụ ya na-eju ndị si nʼọdịda anyanwụ anya; oke egwu na-ejidekwa ndị si nʼọwụwa anyanwụ nʼihi ya.
Mutanen Yamma suna mamakin abin da ya faru da shi; tsoro ya kama mutanen gabas.
21 Nʼezie, otu a ka ebe obibi nke onye ajọ omume dị, ee, bụ onye ahụ nke na-amaghị Chineke.”
Ba shakka haka wurin zaman mugun mutum yake, haka wurin zaman wanda bai san Allah ba yake.”

< Job 18 >