< Job 17 >

1 Mmụọ m tiwara etiwa, ụbọchị m niile dị mkpụmkpụ, ili na-echere ịnabata m.
わが氣息は已にくさり 我日すでに盡なんとし墳墓われを待つ
2 Nʼezie ndị na-akwa emo gbara m gburugburu; anya m na-elekwasịkwa mkpasu iwe ha.
まことに嘲弄者等わが傍に在り 我目は彼らの辨爭ふを常に見ざるを得ず
3 “Debere m ihe ebe nʼebe gị Chineke nọ. Olee onye ọzọ pụrụ ịnara m nʼakaebe?
願くは質を賜ふて汝みづから我の保證となりたまへ 誰か他にわが手をうつ者あらんや
4 I mechiela uche ha ka ha ghara inwe nghọta; ya mere, i gaghị ekwe ka ha nwee mmeri.
汝彼らの心を閉て悟るところ無らしめたまへり 必ず彼らをして愈らしめたまはじ
5 Ọ bụrụ na mmadụ ekwujọọ enyi ya ka o were nweta uru dị nʼime ya, anya ụmụ ya ga-ada mba.
朋友を交付して掠奪に遭しむる者は其子等の目潰るべし
6 “Chineke emeela ka m bụrụ okwu ilu nye onye ọbụla, meekwa ka m bụrụ onye ha na-agbụsa asọ mmiri nʼihu.
彼われを世の民の笑柄とならしめたまふ 我は面に唾せらるべき者となれり
7 Anya m na-ahụ inyogho inyogho nʼihi iru ụjụ; ahụ m aghọọla onyinyo nke ihe m bụ na mbụ.
かつまた我目は憂愁によりて昏み 肢體は凡て影のごとし
8 Ndị na-eme ihe ziri ezi na-akụja mgbe ha hụrụ nke a; ndị aka ha dị ọcha na-enwe mkpali megide ndị ajọ omume.
義しき者は之に驚き 無辜者は邪曲なる者を見て憤ほる
9 Ma otu ọbụla ọ dị, ndị ezi omume ga-aga nʼihu nʼiso ụzọ ha, ndị aka ha dị ọcha ga-aga nʼihu nʼịdị ike.
然ながら義しき者はその道を堅く持ち 手に潔淨き者はますます力を得るなり
10 “Ma bịanụ, unu niile, bidonụ okwu unu ọzọ! Agaghị m achọta onye maara ihe nʼetiti unu.
請ふ汝ら皆ふたたび來れ 我は汝らの中に一人も智き者あるを見ざるなり
11 Ụbọchị m niile agafeela, atụmatụ m abụrụla ihe lara nʼiyi. Ma ọchịchọ nke obi m
わが日は已に過ぎ わが計る所わが心に冀ふ所は已に敗れたり
12 na-edo abalị nʼọnọdụ ehihie; nʼihu ọchịchịrị ka ìhè dị nso.
彼ら夜を晝に變ふ 黒暗の前に光明ちかづく
13 Ọ bụrụ na ebe obibi m na-ele anya ya bụ ili, ọ bụrụ na m agbasaa ihe ndina m nʼelu ọchịchịrị, (Sheol h7585)
我もし俟つところ有ば是わが家たるべき陰府なるのみ 我は黒暗にわが牀を展ぶ (Sheol h7585)
14 a sikwa na m asị ire ure, ‘Nna m ka ị bụ,’ maọbụ sị ikpuru ‘Nne m’ maọbụ ‘Nwanne m nwanyị,’
われ朽腐に向ひては汝はわが父なりと言ひ 蛆に向ひては汝は我母わが姉妹なりと言ふ
15 ebeekwa ka olileanya m dị? Onye pụrụ ịhụ ma m nwere olileanya?
然ばわが望はいづくにかある 我望は誰かこれを見る者あらん
16 Olileanya m ọ ga-arịda ruo nʼọnụ ụzọ ama nke ọnwụ? Anyị ga-esokọta rịdaruo nʼuzuzu?” (Sheol h7585)
是は下りて陰府の關に到らん 之と齊しく我身は塵の中に臥靜まるべし (Sheol h7585)

< Job 17 >