< Job 16 >

1 Mgbe ahụ, Job zara sị:
Then Job answered, and said,
2 “Anụla m ọtụtụ ihe dịka ndị a; ndị nkasiobi na-eweta ọnọdụ ọjọọ ka unu niile bụ.
I have heard many such things. Miserable comforters are ye all.
3 Ogologo okwu efu ndị a niile unu na-ekwu, ọ naghị akwụsị? Gịnị bụ nsogbu unu nke mere unu ji aga nʼihu na-arụ ụka niile ndị a?
Shall vain words have an end? Or what provokes thee that thou answer?
4 Mụ onwe m nwekwara ike ikwu okwu dịka unu, ma ọ bụrụ na unu nọ nʼọnọdụ m; enwere m ike kwuo okwu dị ụtọ na ntị megide unu, ma fufekwaa isi m megide unu.
I also could speak as ye do, if your soul were in my soul's stead. I could join words together against you, and shake my head at you.
5 Ma ọnụ m ga-agba unu ume; nkasiobi si nʼegbugbere ọnụ m ga-emekwa ka ihe mgbu unu dajụọ.
But I would strengthen you with my mouth, and the solace of my lips would assuage your grief.
6 “Ma ọ bụrụ na m ekwuo, adịghị egbochi ihe mgbu m, ọ bụrụ na m ahapụ ikwu okwu, ọdịghị esi nʼahụ m pụọ?
Though I speak, my grief is not assuaged, and though I forbear, what am I eased?
7 Nʼezie o Chineke, i meela ka ike gwụ m, i tidakwala ezinaụlọ m.
But now he has made me weary. Thou have made desolate all my company.
8 I keela m agbụ; agbụ m abụrụla ihe akaebe megide m; ịta ahụ m ebiliela ịgba akaebe megide m.
And thou have laid fast hold on me, which is a witness against me. And my leanness rises up against me; it testifies to my face.
9 Chineke na-eweso m iwe, jiri iwe ya na-adọwasị m, ọ na-atakwa ikikere eze ya megide m; onye iro m na-achịchapụrụ m anya ya.
He has torn me in his wrath, and persecuted me. He has gnashed upon me with his teeth. My adversary sharpens his eyes upon me.
10 Ụmụ mmadụ na-asaghe ọnụ ka ha chịa m ọchị, ha ji iti m aka nʼọnụ na-akwa m emo, jikọtakwa onwe ha megide m.
They have gaped upon me with their mouth. They have smitten me upon the cheek reproachfully. They gather themselves together against me.
11 Chineke ewerela m nyefee nʼaka ndị ajọ omume, tụbakwa m nʼaka ndị na-emebi iwu.
God delivers me to the perverse, and casts me into the hands of the wicked.
12 Ihe na-agara m nke ọma, ma Chineke tipịara m. O jidere m nʼolu ma tiwasịa m. O meela m ihe ịgba ụta ya;
I was at ease, and he broke me apart. Yea, he has taken me by the neck, and dashed me to pieces. He has also set me up for his mark.
13 ndị ọgba ụta ya agbaala m gburugburu. Ọ na-agbawa akụrụ m na-enweghị ọmịiko mee ka oluilu m wụsịa nʼala.
His archers encompass me round about. He splits my reins apart, and does not spare. He pours out my gall upon the ground.
14 Mgbe niile, ọ na-emegide m; ọ na-achụso m dịka dike nʼagha.
He breaks me with breach upon breach. He runs upon me like a giant.
15 “Adụkọtala m akwa mkpe were ya kpuchie anụ ahụ m, liekwa ikuanya m nʼime ntụ.
I have sewed sackcloth upon my skin, and have laid my horn in the dust.
16 Ihu m na-acha ọbara ọbara site nʼakwa nke m na-akwa, onyinyo nke ọnwụ dịkwa gburugburu egbugbere anya m abụọ;
My face is red with weeping, and the shadow of death is on my eyelids,
17 ma aka m emeghị ihe ike ọbụla, ọzọ ekpere m dịkwa ọcha.
although there is no violence in my hands, and my prayer is pure.
18 “Ala, biko, ezokwala ọbara m; mee ka akwa m ghara ịbụ ihe lara nʼiyi!
O earth, do not cover thou my blood, and let my cry have no resting place.
19 Ọ bụladị ugbu a, onye akaebe m nọ nʼeluigwe, onye nkwuchite ọnụ m nọ nʼebe dị elu.
Even now, behold, my witness is in heaven, and he who vouches for me is on high.
20 Onye na-arịọrọ m arịrịọ bụ enyi m, dịka m na-awụsara Chineke anya mmiri m.
My friends scoff at me. My eye pours out tears to God
21 Nʼọnọdụ mmadụ ka ọ na-arịọ Chineke dịka mmadụ na-arịọ nʼihi enyi ya.
that he would maintain the right of a man with God, and of a son of man with his neighbor!
22 “Naanị afọ ole na ole ga-agabiga tupu m ga nʼụzọ nke nlọghachi m na-adịghị.
For when a few years are come, I shall go the way where I shall not return.

< Job 16 >