< Job 15 >

1 Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
Sai Elifaz mutumin Teman ya amsa,
2 “Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi? Ọ ga-emeju afọ ya nʼifufe na-ekpo ọkụ nke si nʼọwụwa anyanwụ?
“Mutum mai hikima zai amsa da surutai marasa kan gado ko yă cika cikinsa da iskar gabas?
3 Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka, maọbụ kwuo okwu na-enweghị isi?
Ko zai yi gardama da maganganun wofi maganganu marasa amfani?
4 Ma ị na-eleda ezi omume anya na-egbochikwa ịsọpụrụ Chineke.
Amma ka ma rena Allah ka hana a yi addu’a gare shi.
5 Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa; ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka i nwere.
Zunubanka ne suke gaya maka abin da za ka ce; kana magana kamar mai wayo.
6 Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m, egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu megide gị.
Bakinka zai kai ka yă baro, ba nawa ba; maganar bakinka za tă juya a kanka.
7 “Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ? A mụọla gị tupu e kee ugwu niile?
“Kai ne mutum na farko da aka fara haihuwa? Ko kai ne aka fara halitta kafin tuddai?
8 Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke? Amamihe niile ọ bụ nʼime gị ka ha juru?
Kana sauraron shawarar Allah? Ko kana gani kai kaɗai ne mai hikima?
9 Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị? Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị?
Me ka sani da ba mu sani ba? Wane fahimi kake da shi da ba mu da shi?
10 Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị, ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị.
Masu furfura da tsofaffi suna gefenmu mutanen da sun girme babanka.
11 Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta, ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị?
Ta’aziyyar Allah ba tă ishe ka ba. Maganarsa mai laushi ba tă ishe ka ba?
12 Gịnị mere obi gị ji duhie gị, gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa,
Don me ka bar zuciyarka ta kwashe ka, kuma don me idanunka suke haske,
13 nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke, meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta?
har kake fushi da Allah kake kuma faɗar waɗannan maganganu daga bakinka?
14 “Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi, gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume?
“Mene ne mutum, har da zai zama da tsarki, ko kuma mace ta haife shi, har yă iya zama mai adalci?
15 Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi, ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya,
In Allah bai nuna amincewa ga tsarkakansa ba, in har sammai ba su da tsarki a idonsa,
16 ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi, bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.
mutum fa, wanda yake da mugunta da lalacewa, wanda yake shan mugunta kamar ruwa!
17 “Gee m ntị ka m kọwaara gị; kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ,
“Ka saurare ni, zan kuma yi maka bayani; bari in gaya maka abin da na gani,
18 bụ ihe ndị amamihe kwuru, ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,
abin da masu hikima suka ce, ba tare da sun ɓoye wani abu da suka samu daga wurin iyayensu ba
19 bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha.
(waɗanda su ne masu ƙasar kafin baƙi su shigo ƙasar).
20 Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ, bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike.
Dukan kwanakin ransa mugu yana shan wahala, wahala kaɗai zai yi ta sha.
21 Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị, mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya.
Ƙara mai bantsoro za tă cika kunnuwansa’yan fashi za su kai masa hari.
22 O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị; mma agha nọ na-echere ya.
Yana jin tsoron duhu domin za a kashe shi da takobi.
23 Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele; ọ makwara na ụbọchị ọchịchịrị nọ nso.
Yana ta yawo, abinci don ungulaye; ya san ranar duhu tana kusa.
24 Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu, nsogbu na-abịakwasị ya dịka eze nke nọ na njikere ibuso ndị iro ya agha.
Ɓacin rai da baƙin ciki sun cika shi, kamar sarkin da yake shirin yaƙi,
25 Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu, dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile.
domin ya nuna wa Allah yatsa ya rena Allah Maɗaukaki,
26 O ji ikwesi olu ike, dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke.
ya tasar masa da faɗa da garkuwa mai kauri da kuma ƙarfi.
27 “Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya, abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa,
“Ko da yake fuskarsa ta cika da kumatu kuma yana da tsoka ko’ina,
28 ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi, nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha, ụlọ nke na-adakasị adakasị.
zai yi gādon garuruwan da suka lalace, da kuma gidajen da ba wanda yake zama a ciki, gidajen da sun zama tarkace.
29 Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa. Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ.
Ba zai sāke zama mai arziki ba, dukiyarsa ba za tă dawwama ba, abin da ya mallaka kuma ba zai bazu a ƙasar ba.
30 Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị, ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ, iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya.
Ba zai tsere wa duhu ba; wuta za tă ƙona rassansa, kuma numfashi daga bakin Allah zai hallaka shi.
31 Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu, nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta.
Kada yă ruɗi kansa ta wurin dogara ga abin da ba shi da amfani domin ba zai samu wani abu ba daga ciki.
32 Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju, ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ
Kafin lokacinsa yă cika, za a gama biyansa duka, kuma rassansa ba za su ba da amfani ba.
33 Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha, dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
Zai zama kamar itacen inabi wanda’ya’yansa suka kakkaɓe kafin su nuna, kamar itacen zaitun zai zubar da furensa.
34 Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga, ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.
Gama marasa tsoron Allah za su zama marasa ba da’ya’ya, wuta kuma za tă ƙona tenti na masu son cin hanci.
35 Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume; naanị aghụghọ ka akpanwa ha na-arụpụta.”
Suna yin cikin rikici su kuma haifi mugunta; cikinsu yana cike da ruɗami.”

< Job 15 >