< Job 15 >

1 Mgbe ahụ, Elifaz onye Teman zara sị:
Elifaz van Teman nam het woord en sprak:
2 “Onye maara ihe ọ ga-eji okwu na-abaghị uru zaghachi? Ọ ga-emeju afọ ya nʼifufe na-ekpo ọkụ nke si nʼọwụwa anyanwụ?
Antwoordt een wijze met bluf, En blaast hij zich op met oostenwind;
3 Ọ ga-eji okwu na-abaghị uru rụọ ụka, maọbụ kwuo okwu na-enweghị isi?
Verdedigt hij zich met beuzelpraat En met holle frasen?
4 Ma ị na-eleda ezi omume anya na-egbochikwa ịsọpụrụ Chineke.
Gij breekt zowaar de godsvrucht af, En verstoort de overpeinzing voor het aanschijn van God.
5 Mmehie gị na-eme ka ọnụ gị kwuo okwu ngwangwa; ọ bụkwa ire ndị aghụghọ ka i nwere.
Daar uw schuldig geweten uw mond onderricht, En gij de taal van bedriegers kiest,
6 Ọnụ gị na-ama gị ikpe, ọ bụghị mụ onwe m, egbugbere ọnụ gị na-ekwu okwu megide gị.
Is het uw eigen mond, die u vonnist: niet ik, Zijn het uw eigen lippen, die tegen u getuigen.
7 “Ị bụ mmadụ mbụ a mụrụ? A mụọla gị tupu e kee ugwu niile?
Zijt gij als eerste der mensen geboren, Nog vóór de heuvelen ter wereld gebracht;
8 Ọ getụla ntị nʼizu nzuzo nke Chineke? Amamihe niile ọ bụ nʼime gị ka ha juru?
Luistert ge toe in de raad van God, En hebt ge beslag op de Wijsheid gelegd?
9 Gịnị ka ị maara nke anyị na-amaghị? Ụdị nghọta dị aṅaa ka i nwere nke anyị na-enweghị?
Wat weet gij, wat wij niet weten, Wat begrijpt gij, wat wij niet verstaan?
10 Ndịisi awọ na ndị kara nka nọ nʼetiti anyị, ndị ikom mere agadi karịa nna mụrụ gị.
Ook onder ons zijn bejaarden en grijsaards, Ouder van dagen nog dan uw vader!
11 Ọ ga-abụ na nkasiobi Chineke bụrụ gị ihe nta, ka ọ bụ okwu dị nro nke ọ gwara gị?
Zijn soms voor ú de vertroostingen Gods te gering, Het woord, met zachtheid tot u gesproken?
12 Gịnị mere obi gị ji duhie gị, gịnị mekwara anya gị abụọ ji chagharịa,
Hoe sleept uw hartstocht u mee, En hoe rollen uw ogen:
13 nke mere iwe gị jiri dị ọkụ megide Chineke, meekwa ka okwu ọjọọ ndị a niile si nʼọnụ gị pụta?
Dat ge uw wrevel tegen God durft keren, En zulke woorden aan uw mond laat ontglippen!
14 “Gịnị ka mmadụ efu bụ, ọ ga-eji dị ọcha nʼobi, gịnị ka mmadụ nwanyị mụrụ bụ, na ha nwere ike ị bụ ndị ezi omume?
Wat is een mens, dat hij rein zou zijn, Rechtschapen, die uit een vrouw is geboren?
15 Ọ bụrụ na Chineke atụkwasịghị ndị nsọ ya obi, ọ bụrụkwa na eluigwe adịghị ọcha nʼanya ya,
Zie, zelfs op zijn Heiligen kan Hij niet bouwen, En de hemel is niet rein in zijn oog;
16 ọ ga-esi aṅaa tụkwasị mmadụ efu onye rụrụ arụ obi, bụ onye na-aṅụ ajọ omume dịka mmiri.
Hoeveel minder de mens, afschuwelijk, bedorven, Die de ongerechtigheid als water drinkt!
17 “Gee m ntị ka m kọwaara gị; kwerekwa ka m gwa gị ihe m hụrụ,
Ik zal het u tonen, luister naar mij; Wat ik gezien heb, u gaan vertellen.
18 bụ ihe ndị amamihe kwuru, ndị na-ezobeghị ihe ha natara nʼaka nna nna ha,
Het is hetzelfde, wat de wijzen verkonden, En wat hun vaderen hun niet hadden verborgen,
19 bụ ndị e nyefere ala ndị a nʼaka ha mgbe ọ dịghị onye ọbịa gabigara nʼetiti ha.
Aan wie alleen het land was geschonken, En bij wie nog geen vreemde was binnengedrongen
20 Ụbọchị ndụ ya niile, onye ajọ omume na-ata ahụhụ mmekpa ahụ, bụ nke e debere ogologo afọ nye nwoke ahụ na-eme ihe ike.
De goddeloze verkeert heel zijn leven in angst, De tyran al de jaren, die voor hem zijn bedongen;
21 Ụzụ na-eweta oke egwu na-eju ya ntị, mgbe ọ dị ka ihe niile na-aga nke ọma, ndị na-apụnara mmadụ ihe na-abịakwasị ya.
Schrikgeluiden treffen zijn oren, In volle vrede stormt de plunderaar op hem af.
22 O nweghị olileanya ịgbanarị ọchịchịrị; mma agha nọ na-echere ya.
Hij hoopt niet eens, aan de duisternis te ontsnappen, En is bestemd voor het zwaard;
23 Ọ na-akpagharị na-achọ ebe nri dịka udele; ọ makwara na ụbọchị ọchịchịrị nọ nso.
Hij wordt als een aas voor de gieren geworpen, En weet, dat sombere dagen hem wachten.
24 Ahụhụ na mkpagbu na-eme ka ọ tụọ oke egwu, nsogbu na-abịakwasị ya dịka eze nke nọ na njikere ibuso ndị iro ya agha.
Benauwdheid en angst grijpt hem aan, Als een koning ten aanval gereed:
25 Nʼihi na ọ na-atụ Chineke aka nʼihu, dokwaa onwe ya imegide Onye pụrụ ime ihe niile.
Want hij heeft zijn hand tegen God opgeheven, Den Almachtige durven trotseren;
26 O ji ikwesi olu ike, dịka ọta siri ike, na-emegide Chineke.
Is met trotse nek op Hem afgestormd, Met zijn zwaar beslagen rondas!
27 “Ọ bụ ezie na abụba kpuchiri ihu ya, abụba nke dị nʼukwu ya na-eme ka anụ ahụ nupụtakwa,
Omdat hij zijn gelaat met vet heeft bedekt, En een vetlaag gelegd op zijn lenden:
28 ọ ga-ebi nʼobodo e bibiri ebibi, nʼụlọ nke mmadụ na-ekwesighị ibi nʼime ha, ụlọ nke na-adakasị adakasị.
Daarom vestigt hij zich in verwoeste steden, In onbewoonbare huizen, die tot puin zijn vervallen;
29 Ma ọ gaghị aga nʼihu ị bụ ọgaranya, akụ ya agaghị adịgidekwa. Ihe o nwere agakwaghị agbasapụ nʼala niile ahụ.
Hij blijft niet rijk, En zijn vermogen houdt geen stand;
30 Ọ gaghị agbanarị ọchịchịrị, ire ọkụ ga-eme ka ome ya kpọnwụọ, iku ume nke ọnụ Chineke ga-ebufu ya.
Zijn schaduw breidt zich niet uit op de grond, En hij ontsnapt de duisternis niet; Het vuur zal zijn loten verschroeien, De wind zijn bloesem verwaaien!
31 Ka onye dị otu a hapụ ịghọgbu onwe ya site nʼịtụkwasị uche nʼihe efu, nʼihi na ọ dịghị ụgwọ ọrụ ọbụla ọ ga-enweta.
Laat hem niet op zijn gestalte vertrouwen, Hij komt bedrogen uit, ze is enkel schijn.
32 Tụpụ oge ya eruo, ọ ga-anata ụgwọ ọrụ ya nʼuju, ọzọ, alaka ya ga-akpọnwụ
Zijn ranken verdorren vóór de tijd, En zijn twijgen groenen niet meer;
33 Ọ ga-adị ka osisi vaịnị nke mkpụrụ ya dapụsịrị na-achaghị acha, dịka osisi oliv nke akwụkwọ ya kpọnwụrụ akpọnwụ.
Hij is als de wijnstok, die zijn druiven laat vallen, En als de olijf, die zijn bloesem verliest!
34 Nʼihi na ndị na-amaghị Chineke ga-adị ka nwanyị aga, ọkụ ga-erepịa ụlọ ikwu niile nke ndị hụrụ iri ngarị nʼanya.
Ja, de bent der goddelozen is onvruchtbaar, En het vuur verteert de tenten der omkoperij;
35 Ha na-atụrụ ihe ọjọọ dịka ime, ma mụọkwa ajọọ omume; naanị aghụghọ ka akpanwa ha na-arụpụta.”
Ze gaan zwanger van ellende, en baren onheil, Hun schoot draagt ontgoocheling!

< Job 15 >