< Job 14 >
1 “Mmadụ nke nwanyị mụrụ nwere ụbọchị ole na ole nke jupụtara na nsogbu.
“Munhu akazvarwa nomukadzi ane mazuva mashoma azere nokutambudzika.
2 Ọ na-awalite dịka okoko osisi, ma kpọnwụọkwa mgbe na-adịghị anya, dịka onyinyo, ọ na-agabiga agabiga.
Anobuda seruva agosvava; anotiza somumvuri, haagari.
3 Ị na-elegide onye dị otu a anya? Ị ga-akpọ ya ikpe nʼihu gị?
Ko, munotarisisa munhu akadai here? Ko, muchamuuyisa kuzotongwa pamberi penyu here?
4 Onye pụrụ iwepụta ihe dị ọcha site nʼihe na-adịghị ọcha? Ọ dịghị onye ọ bụ.
Ndianiko angabudisa chinhu chakachena kubva pane chine tsvina? Hakuna!
5 Ị kpebiela ụbọchị ndụ nke mmadụ; ị kabiela ọnụọgụgụ nke ọnwa ya niile, kpaakwa oke ebe ọ na-agaghị agabiga.
Mazuva omunhu akatarwa; makatema kuwanda kwemwedzi yake, mukamutarira miganhu yaasingagoni kudarika.
6 Nʼihi nke a, wepụ anya gị nʼebe ọ nọ, hapụ ya ka ọ nọọrọ onwe ya ruo mgbe ụbọchị ya ga-ezu dịka onye e goro ọrụ.
Naizvozvo regai kumutarisa uye mumusiye ari oga, kusvikira apedza nguva yake somunhu anoshanda.
7 “Ma olileanya dịịrị osisi; nʼihi na ọ bụrụ na e gbutuo ya, ọ ga-epuchikwa, alaka ọhụrụ ya aghaghị ịwapụtakwa.
“Asi kumuti kune tariro: Kana ukatemwa, unobukirazve, uye mabukira awo matsva haasvavi.
8 A sịkwarị na mgbọrọgwụ ya emeela ochie nʼala, maọbụ na ogwe ya anwụọ nʼaja,
Midzi yawo ingava yakwegura hayo muvhu uye hunde yawo ichifa muvhu,
9 mgbe ọbụla mmiri zokwasịrị ya, ọ na-epupụta dịka ihe a kụrụ akụ.
asi uchabukira pakunhuhwira kwemvura ugomera somuti uchangotanga kumera.
10 Ma mmadụ na-anwụ, e lie ya; ọ na-ekubikwa ume si otu a gabiga.
Asi munhu anofa agoradzikwa pasi; anofema kokupedzisira uye haazovapozve.
11 Dịka mmiri dị nʼoke osimiri si ata, maọbụ ka mmiri dị nʼiyi si ata nʼoge ọkọchị,
Sokupera kunoita mvura mugungwa, kana kupwa nokuoma kworwizi,
12 otu a ka mmadụ si e dinaa ma ọ dịghị etetakwa ọzọ; tutu ruo mgbe eluigwe na-agaghị adịkwa; mmadụ ọbụla apụghị i si nʼụra kpọtee ya, agaghị akpọtekwa ha site nʼụra ha.
saizvozvo munhu anovata pasi asingazomuki; kusvikira matenga asisiko, vanhu havazomukizve kana kumutswa pakuvata kwavo.
13 “A sị na ị ga-ezo m nʼala mmụọ, na ị ga-ezobe m tutu ruo mgbe iwe gị gabigara. A sị na ị ga-akanyere m oge ma mesịa cheta m. (Sheol )
“Haiwa, dai mandiviga henyu muguva chete, uye mandiviga kusvikira kutsamwa kwenyu kwapfuura! Dai chete manditarira nguva, uye ipapo mugondirangarira! (Sheol )
14 Ọ bụrụ na mmadụ anwụọ, ọ ga-adị ndụ ọzọ? Ụbọchị niile nke ọrụ ahụhụ m, aga m echere mgbe nnapụta m ga-abịa.
Kana munhu akafa, angazoraramazve here? Mazuva ose okushanda kwangu kwakaoma, ndicharindira kusvikira kuvandudzwa kwangu kwasvika.
15 Ị ga-akpọ, aga m azakwa gị, agụụ ọrụ aka gị ga-agụ gị.
Muchadana uye ini ndichakupindurai; muchashuva chisikwa chamakaita namaoko enyu.
16 Nʼihi mgbe ahụ ị ga-agụ nzọ ụkwụ m niile ọnụ, ma ị gaghị agụkọ mmehie m.
Zvirokwazvo muchaverenga nhambwe dzangu ipapo, asi musingarondi chivi changu.
17 A ga-ekechi njehie m nʼakpa, ị ga-ekpuchi mmehie m.
Kudarika kwangu kuchasungirwa musaga; muchafukidzira chivi changu.
18 “Ma dịka ugwu si erichasi daa, na dịka a na-enupu oke nkume nʼọnọdụ ya,
“Asi sokupfupfunyuka kunoita gomo rigoondomoka, uye sokubviswa kwedombo panzvimbo yaro,
19 dịka mmiri si akwọchasị nkume, na dịka oke mmiri ozuzo si akwazekwa aja ala, otu a ka i si eme ka olileanya mmadụ laa nʼiyi.
semvura inochera mabwe, uye sokuyerera kwemvura zhinji inokukura ivhu, saizvozvo munoparadza tariro yomunhu.
20 Ị na-egosi ya na ị karịrị ya ike, ma ha na-agabiga; ị na-eme ka ihu ya gbanwee, ma zilaga ya.
Munomukunda kamwe chete zvachose, uye akasazovapo; munoshandura chiso chake mobva mamudzinga.
21 Ọ bụrụ na a na-asọpụrụ ụmụ ha, ha adịghị amata nke a; ọ bụrụkwa na a na-eweda ha nʼala, ha ọ dịghị ahụ ya.
Kana vanakomana vake vachikudzwa, iye haazvizivi; kana vakadzikisirwa pasi, iye haazvioni.
22 Ihe mgbu nke anụ ahụ ya ka ọ na-ama ma na-erukwara naanị onwe ya ụjụ.”
Anongonzwa kurwadza kwomuviri wake chete, agozvichema iye pachake bedzi.”