< Job 12 >

1 Mgbe ahụ, Job zara:
And Job answered and said,
2 “Nʼezie, naanị unu bụ ndị maara ihe, unu na amamihe ga-anwụkọ nʼotu.
No doubt but ye are the people, and wisdom shall die with you.
3 Ma enwere m mmụọ iche uche dịka unu; abụghị m onye na-erughị eru nʼebe unu nọ. Onye bụ onye na-amaghị ihe ndị a unu na-ekwu?
But I have understanding as well as you; I am not inferior to you: yea, who knoweth not such things as these?
4 “Abụzi m ihe ọchị nʼebe ndị enyi m nọ, nʼagbanyeghị na m kpọkuru Chineke, ọ za, onye ezi omume, onye na-enweghị ịta ụta bụzikwa ihe eji akpa ọchị!
I am as one mocked by his neighbour, who calleth upon God, and he answereth him: the just upright man is mocked.
5 Ndị na-enweghị nsogbu na-eleda ndị ọdachi dakwasịrị anya dịka nsogbu si eche ndị ụkwụ ha na-amịchapụ amịchapụ.
He that is ready to slip with his feet is as a lamp despised in the thought of him that is at ease.
6 Ụlọ ikwu nke ndị na-apụnara mmadụ ihe na-adị jụụ; ndị na-akpasu Chineke iwe na-adị nʼudo, bụ ndị na-ebugharị chi ha nʼaka ha.
The tents of robbers prosper, and they that provoke God are secure; into whose hand God bringeth abundantly.
7 “Ma jụọ ụmụ anụmanụ, ha ga-akụziri gị, maọbụ ụmụ nnụnụ, ha ga-agwa gị.
But ask now the beasts, and they shall teach thee; and the fowls of the air, and they shall tell thee:
8 Ma ọ bụkwanụ gwa ala okwu, ọ ga-akụziri gị, maọbụ kwere ka azụ nọ na mmiri kọọrọ gị.
Or speak to the earth, and it shall teach thee: and the fishes of the sea shall declare to thee.
9 Olee otu nʼime ihe ndị a nke na-amaghị na ọ bụ aka Onyenwe anyị mere nke a?
Who knoweth not in all these that the hand of the LORD hath wrought this?
10 Nʼaka ya ka ndụ ihe niile e kere eke dị, ya na ndụ ụmụ mmadụ
In whose hand is the soul of every living thing, and the breath of all mankind.
11 Ọ bụ na ntị adịghị anwale okwu, otu ire si anwale ihe oriri?
Doth not the ear try words? and the mouth taste its food?
12 Ọ bụ na-adịghị ahụ amamihe nʼetiti ndị okenye? Ogologo ndụ, ọ dịghị eweta nghọta?
With the ancient is wisdom; and in length of days understanding.
13 “Ọ bụ Chineke nwe amamihe na ike, ndụmọdụ na nghọta bụkwa nke ya.
With him is wisdom and strength, he hath counsel and understanding.
14 Ihe o tidara enweghị mwugharị ọzọ; mgbapụta adịghị nye onye o tụbara nʼụlọ mkpọrọ.
Behold, he breaketh down, and it cannot be built again: he shutteth up a man, and there can be no opening.
15 Ọ bụrụ na o gbochie mmiri, ebe niile atakọrọchaa. Ọ bụrụ na o zipụ ha, ha erikpuo ala niile.
Behold, he withholdeth the waters, and they dry up: also he sendeth them out, and they overturn the earth.
16 Nʼaka ya ka ike na nzube ihe dị; ndị a ghọgburu na ndị na-aghọgbu bụkwa nke ya.
With him is strength and wisdom: the deceived and the deceiver are his.
17 Ọ na-anapụ ndị ndụmọdụ ọkwa ha chụpụ ha, ma ndị ikpe ka ọ na-eme ka ha ghọọ ndị nzuzu.
He leadeth counsellors away spoiled, and maketh the judges fools.
18 Ọ na-atọpụ mkpọrọ igwe ndị eze kere, ma were akwa mgbochi kee ha nʼukwu.
He looseth the bond of kings, and girdeth their loins with a belt.
19 Ọ na-agbawa ndị nchụaja ọtọ chụpụ ha, kwatuokwa ndị ọnọdụ ha sirila ike ogologo oge gara aga.
He leadeth princes away spoiled, and overthroweth the mighty.
20 Ọ na-emechi ọnụ ndị ndụmọdụ a tụkwasịrị obi, wepụkwa nghọta nke ndị okenye.
He removeth away the speech of the trusty, and taketh away the understanding of the aged.
21 Ọ na-eji ndị ọgaranya eme ihe ọchị, napụkwa ngwa agha nke ndị dị ike.
He poureth contempt upon princes, and weakeneth the strength of the mighty.
22 Ọ na-ekpughe ihe omimi nke ọchịchịrị meekwa ka oke ọchịchịrị pụta ìhè.
He revealeth deep things out of darkness, and bringeth to light the shadow of death.
23 Ọ na-eme ka mba dị ukwuu, ọ na-emekwa ka ha laa nʼiyi; Ọ na-eme ka mba baa ụba, ma chụsakwaa ha.
He increaseth nations, and destroyeth them: he enlargeth nations, and leadeth them away.
24 Ọ na-anapụ ndị ndu nke ụwa amamihe ha, zipụkwa ha ka ha na-awagharị nʼọzara ebe ụzọ na-adịghị.
He taketh away the heart of the chief of the people of the earth, and causeth them to wander in a wilderness where there is no way.
25 Ha na-asọgharị ìsì nʼọchịchịrị na-enweghị ìhè. Ọ na-eme ha ka ha na-adagharị dịka ndị mmanya na-egbu.
They grope in the dark without light, and he maketh them to stagger like a drunken man.

< Job 12 >