< Job 11 >

1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
Wasephendula uZofari umNahama wathi:
2 “Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a? A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?
Kambe kabuphendulwa yini ubunengi bamazwi? Njalo isilawuli singalungisiswa yini?
3 Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị? Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?
Ukulawula kwakho kuzathulisa abantu yini? Lapho ukloloda, kakho ongakuyangisa yini?
4 Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ, adịkwa m ọcha nʼanya gị.’
Ngoba uthe: Imfundiso yami ihlanzekile, ngihlambulukile emehlweni akho.
5 Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu, na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.
Kodwa-ke kungathi uNkulunkulu angakhuluma, avule indebe zakhe kuwe,
6 Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe, nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ. Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.
ukuze akwazise imfihlakalo zenhlakanipho, ukuthi ziphindwe kabili ngenhlakanipho eqotho. Yazi-ke ukuthi uNkulunkulu ubiza kuwe okulutshwana kulecala lakho.
7 “I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke? I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?
Ungafumana ukujula kukaNkulunkulu na? Ungamfumana yini uSomandla kuze kube sekupheleleni?
8 Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime? Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma? (Sheol h7585)
Kuphakeme njengamazulu, ungenzani? Kutshonile kulesihogo, ungazini? (Sheol h7585)
9 Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa, dị obosara karịa oke osimiri.
Isilinganiso sakho side kulomhlaba, sibanzi kulolwandle.
10 “Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ, kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?
Uba esedlula avalele kumbe abuthanise, ngubani-ke ongamnqanda?
11 Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie, mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?
Ngoba yena uyabazi abantu abayize, uyabona ububi; ngakho kayikukuqaphelisa yini?
12 Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.
Ngoba umuntu oyisiphukuphuku angaba lokuqedisisa, lanxa umuntu engazalwa njengethole likababhemi weganga.
13 “Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya, setịpụ aka gị abụọ nye ya,
Uba wena ulungisa inhliziyo yakho, welulele izandla zakho kuye,
14 ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka, ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị
uba ububi busesandleni sakho, bubeke khatshana, lobubi kabungahlali emathenteni akho.
15 mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị, ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.
Ngoba lapho uzaphakamisa ubuso bakho ungelasici, njalo uqine, ungesabi.
16 Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị, na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.
Ngoba wena uzakhohlwa usizi lwakho, ulukhumbule njengamanzi asedlulile.
17 Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie, ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.
Lobude bempilo yakho buzakhanya kulemini enkulu; loba kulomnyama kuzakuba njengekuseni.
18 Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị; ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.
Njalo uzakuba lethemba ngoba kulethemba; uzagebha, uzalala ngokuvikeleka.
19 Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla, ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.
Uzalala, njalo kakho ozakwethusa, labanengi bazancenga phambi kwakho.
20 Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada, ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ; olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ.”
Kodwa amehlo ababi azafiphala, lesiphephelo sizachitheka kubo, lethemba labo lizakuba yikuphela komphefumulo.

< Job 11 >