< Job 11 >

1 Mgbe ahụ, Zofa onye Neama zara sị:
And Zophar the Naamathite answereth and saith: —
2 “Ọ dịghị nzaghachi dịịrị ọtụtụ okwu niile ndị a? A ga-agụ onye ekwurekwu a dịka onye ikpe na-amaghị?
Is a multitude of words not answered? And is a man of lips justified?
3 Okwu efu gị ndị a ha ga-eme ka mmadụ gba nkịtị? Ọ bụ na ọ dịghị onye ga-abara gị mba mgbe ị na-akwa emo?
Thy devices make men keep silent, Thou scornest, and none is causing blushing!
4 Ị na-asị Chineke, ‘Okwukwe m enweghị ntụpọ, adịkwa m ọcha nʼanya gị.’
And thou sayest, 'Pure [is] my discourse, And clean I have been in Thine eyes.'
5 Ọ ga-adị m nnọọ mma ma a si na Chineke ga-ekwu okwu, na ọ ga-asaghe egbugbere ọnụ ya imegide gị.
And yet, O that God had spoken! And doth open His lips with thee.
6 Kpugheere gị ihe nzuzo niile nke amamihe, nʼihi na ezi amamihe nwere akụkụ abụọ. Mara nke a: Chineke echefuola ụfọdụ mmehie gị.
And declare to thee secrets of wisdom, For counsel hath foldings. And know thou that God forgetteth for thee, [Some] of thine iniquity.
7 “I nwere ike ịchọpụta ihe omimi Chineke? I nwere ike ịnwapụta nsọtụ nke Onye pụrụ ime ihe niile?
By searching dost thou find out God? Unto perfection find out the Mighty One?
8 Ha dị elu karịa eluigwe, gịnị ka ị pụrụ ime? Ha dị ogbu karịa ala ili, gịnị ka ị pụrụ ịma? (Sheol h7585)
Heights of the heavens! — what dost thou? Deeper than Sheol! — what knowest thou? (Sheol h7585)
9 Ọtụtụ ha dị ogologo karịa ụwa, dị obosara karịa oke osimiri.
Longer than earth [is] its measure, And broader than the sea.
10 “Ọ bụrụ na ọ bịa tụba gị nʼime ụlọ mkpọrọ, kpọkọta ndị ikpe, onye ga-egbochi ya?
If He pass on, and shut up, and assemble, Who then dost reverse it?
11 Nʼezie, ya onwe ya na-amata ndị nduhie, mgbe ọ hụrụ ajọ ihe, ọ bụ na ọ dịghị amatakwa ya?
For he hath known men of vanity, And He seeth iniquity, And one doth not consider [it]!
12 Onye nzuzu ga-aghọ onye maara ihe naanị mgbe nwa ịnyịnya ibu ọhịa mụrụ ghọrọ mmadụ.
And empty man is bold, And the colt of a wild ass man is born.
13 “Ma ọ bụrụ na i were obi gị nye ya, setịpụ aka gị abụọ nye ya,
If thou — thou hast prepared thy heart, And hast spread out unto Him thy hands,
14 ọ bụrụ na i wezuga mmehie nke dị gị nʼaka, ghara ikwe ka ihe ọjọọ dịrị nʼụlọ ikwu gị
If iniquity [is] in thy hand, put it far off, And let not perverseness dwell in thy tents.
15 mgbe ahụ, ihere agaghị eme gị iwelite ihu gị, ị ga-eguzokwa chịm na-atụghị egwu.
For then thou liftest up thy face from blemish, And thou hast been firm, and fearest not.
16 Nʼezie ị ga-echefukwa nsogbu gị, na-echeta ya dịka mmiri gabigara agabiga.
For thou dost forget misery, As waters passed away thou rememberest.
17 Ndụ gị ga-amụke karịa etiti ehihie, ọchịchịrị ya ga-adịkwa ka ụtụtụ.
And above the noon doth age rise, Thou fliest — as the morning thou art.
18 Ị ga-anọkwa nʼudo nʼihi na olileanya dị; ị ga-elegharịkwa anya gburugburu gị zuo ike na-atụghị ụjọ.
And thou hast trusted because their is hope, And searched — in confidence thou liest down,
19 Ị ga-edina ala na-atụghị egwu onye ọbụla, ọtụtụ ndị mmadụ ga-achọ ịnata amara nʼihu gị.
And thou hast rested, And none is causing trembling, And many have entreated thy face;
20 Ma anya ndị na-emebi iwu ga-ada, ha agaghị achọta ụzọ mgbapụ; olileanya ha ga-abụ nkubi ume nke ọnwụ.”
And the eyes of the wicked are consumed, And refuge hath perished from them, And their hope [is] a breathing out of soul!

< Job 11 >