< Job 10 >
1 “Ike ịdị ndụ agwụla m. Hapụnụ m ka m kwuo ihe dị m nʼobi, kwupụta ya dịka obi ilu nke mkpụrụobi m si dị.
Min Sjæl er led ved mit Liv, frit Løb vil jeg give min Klage over ham, i min bitre Sjælenød vil jeg tale,
2 Ihe m ga-agwa Chineke bụ nke a: Apụtala maa m ikpe, kama gwa m ihe mere i ji ama m ikpe.
sige til Gud: Fordøm mig dog ikke, lad mig vide, hvorfor du tvister med mig!
3 Ọ dị gị mma nʼobi imegbu m, si otu a leda ọrụ aka gị anya, mgbe ị na-anabata atụmatụ nke ndị na-emebi iwu?
Gavner det dig at øve Vold, at forkaste det Værk, dine Hænder danned, men smile til gudløses Raad?
4 Ị nwere anya nke anụ ahụ? Ị na-ahụ ụzọ dịka mmadụ si ahụ?
Har du da Kødets Øjne, ser du, som Mennesker ser,
5 Ụbọchị nke gị, ha dịka nke ndị nwere anụ ahụ, ka afọ nke gị, ha dịka nke mmadụ dị ike?
er dine Dage som Menneskets Dage, er dine Aar som Mandens Dage,
6 Nke ga-eme na i na-achọpụta ikpe ọmụma m ma nyochaa mmehie m?
siden du søger efter min Brøde, leder efter min Synd,
7 Ọ bụ ezie na ị maara na ikpe amaghị m, na ọ dịghị onye pụrụ ịnapụta m site nʼaka gị.
endskønt du ved, jeg ikke er skyldig; men af din Haand er der ingen Redning!
8 “Ọ bụ aka gị kpụrụ m kee m. Ọ ga-atụgharịa ugbu a bibie m?
Dine Hænder gjorde og danned mig først, saa skifter du Sind og gør mig til intet!
9 Cheta na ị kpụrụ m dịka ụrọ. Ị ga-eme ka m laghachi nʼaja ọzọ?
Kom i Hu, at du dannede mig som Ler, og til Støv vil du atter gøre mig!
10 Ọ bụ na ị wụpụghị m dịka mmiri ara ehi mee ka m kpụkọta dịka mmiri ara rahụrụ arahụ?
Mon du ikke hældte mig ud som Mælk og lod mig skørne som Ost,
11 Yikwasị m akpụkpọ ahụ na anụ ahụ, werekwa ọkpụkpụ na akwara kpaa m dịka uwe?
iklædte mig Hud og Kød og fletted mig sammen med Ben og Sener?
12 I nyere m ndụ gosikwa m obiọma gị, nʼịdị mma gị chebekwara mmụọ m.
Du gav mig Liv og Livskraft, din Omhu vogted min Aand —
13 “Ma nke a bụ ihe i zoro nʼime obi gị, amakwa m na ọ bụ ihe dị gị nʼuche.
og saa gemte du dog i dit Hjerte paa dette, jeg skønner, dit Øjemed var:
14 Ọ bụrụ na m mehiere, ị ga na-ele m anya, ị gaghị ekwe ka m ghara ịta ahụhụ nʼihi mmehie m.
Synded jeg, vogted du paa mig og tilgav ikke min Brøde.
15 Ọ bụrụ na ikpe mara m, ahụhụ na-adịrị m! A sịkwarị na aka m dị ọcha, apụghị m iweli isi m elu nʼihi na ejupụtara m nʼihere, bụrụkwa onye e mibara nʼime nsogbu m.
I Fald jeg forbrød mig, da ve mig! Var jeg retfærdig, jeg skulde dog ikke løfte mit Hoved, men mættes med Skændsel, kvæges med Nød.
16 Ọ bụrụ na m welie m isi elu, dịka ọdụm ị ga-eji nwayọọ na-eso m nʼazụ ma werekwa ike gị dị egwu megide m.
Knejsed jeg, jog du mig som en Løve, handlede atter ufatteligt med mig;
17 I na-eweta ndị ama ọhụrụ megide m, mee ka iwe gị baa ụba nʼebe m nọ; ị na-eme ka ndị agha gị na-abịakwute m, otu nʼelu ibe ya dịka ebili mmiri.
nye Vidner førte du mod mig, øged din Uvilje mod mig, opbød atter en Hær imod mig!
18 “Gịnị mere i ji wepụta m site nʼafọ nne m? Ọ gaara aka m mma ịnwụ tupu anya ọbụla ahụ m.
Hvi drog du mig da af Moders Liv? Jeg burde have udaandet, uset af alle;
19 A sịkwarị na amụpụtaghị m maọbụ na e sitere nʼafọ nne m buba m nʼime ili!
jeg burde have været som aldrig født, været ført til Graven fra Moders Skød.
20 Ụbọchị ndụ m ọ dịghị ole na ole? Si nʼebe m nọ wezuga onwe gị ka m nwetu ọṅụ nwa mgbe nta,
Er ej mine Livsdage faa? Saa slip mig, at jeg kan kvæges lidt,
21 tupu m hapụ laa nʼala ọchịchịrị na onyinyo nke ọnwụ ebe m na-agaghị esi pụtakwa.
før jeg for evigt gaar bort til Mørkets og Mulmets Land,
22 Nʼala nke oke ọchịchịrị, ala nke onyinyo ọnwụ, nke usoro na-adịghị, ebe ọbụladị ìhè dịkwa ka ọchịchịrị.”
Landet med bælgmørkt Mulm, med Mørke og uden Orden, hvor Lyset selv er som Mørket.