< Job 1 >

1 Otu nwoke aha ya bụ Job bi nʼobodo Uz. Nwoke a bụ Job bụ onye na-enweghị ịta ụta ọbụla, bụrụkwa onye ezi omume nke na-atụ egwu Chineke ma na-agbara mmehie ọsọ.
There was a man in the land of Uz whose name was Job. And this man was blameless and upright, fearing God and shunning evil.
2 Ọ mụrụ ụmụ ndị ikom asaa na ụmụ agbọghọ atọ.
He had seven sons and three daughters,
3 O nwere puku atụrụ asaa, na puku ịnyịnya kamel atọ, na ehi ọnụọgụgụ ha dị otu puku e jikọrọ abụọ abụọ, na narị ịnyịnya ibu ise, na ọtụtụ ndị na-ejere ya ozi. Ọ bụ nwoke dị ukwuu karịa ndị niile bi nʼọwụwa anyanwụ.
and he owned 7,000 sheep, 3,000 camels, 500 yoke of oxen, 500 female donkeys, and a very large number of servants. Job was the greatest man of all the people of the East.
4 Ụmụ ya ndị ikom na-eme mmemme oriri na ọṅụṅụ nʼụbọchị ọmụmụ ha nʼụlọ ha, nke ọbụla nʼime ya nʼusoro. Mgbe ha na-eme nke a, ha na-akpọkwa ụmụnne ha ndị nwanyị atọ ka ha bịa soro ha rie ma ṅụkwaa.
Job’s sons would take turns holding feasts in their homes, and they would invite their three sisters to eat and drink with them.
5 Mgbe oge mmemme ndị ahụ gwụsịrị, Job na-akpọkọta ụmụ ya doo ha nsọ. Nʼisi ụtụtụ ya, ọ na-achụ aja nsure ọkụ nʼihi onye ọbụla nʼetiti ụmụ ya. Echiche ya bụ, “Ma eleghị anya, ụmụ ya emehiela kọchaa Chineke nʼime obi ha.” Nke a bụ ihe Job na-eme mgbe niile.
And when the days of feasting were over, Job would send for his children to purify them, rising early in the morning to offer burnt offerings for all of them. For Job thought, “Perhaps my children have sinned and cursed God in their hearts.” This was Job’s regular practice.
6 Otu ụbọchị ụmụ Chineke bịara igosi onwe ha nʼihu Onyenwe anyị ma ekwensu sonyekwara ha bịa.
One day the sons of God came to present themselves before the LORD, and Satan also came with them.
7 Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “Ebee ka i si abịa?” Ekwensu zara Onyenwe anyị, “Site nʼịwagharị nʼụwa na site nʼịgagharị ihu na azụ nʼime ya.”
“Where have you come from?” said the LORD to Satan. “From roaming through the earth,” he replied, “and walking back and forth in it.”
8 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị sịrị Ekwensu, “I leziela ohu m nwoke Job anya? Ọ dịghị onye ọzọ nọ nʼụwa nke dịka ya. Ọ bụ nwoke zuruoke, onye na-emekwa ihe ziri ezi. Ọ bụ onye na-atụ egwu Chineke, na-adịghị etinye aka ya nʼihe ọjọọ ọbụla.”
Then the LORD said to Satan, “Have you considered My servant Job? For there is no one on earth like him, a man who is blameless and upright, who fears God and shuns evil.”
9 Ekwensu zara Onyenwe anyị sị, “Job ọ na-atụ Chineke egwu nʼefu?
Satan answered the LORD, “Does Job fear God for nothing?
10 Ọ bụ na ị gbaghị Job na ezinaụlọ ya na ihe niile o nwere ogige gburugburu nʼakụkụ niile? I gọziela ọrụ aka ya, nke mere na igwe ewu na atụrụ ya na igwe ehi ya jupụtara ebe niile.
Have You not placed a hedge on every side around him and his household and all that he owns? You have blessed the work of his hands, and his possessions have increased in the land.
11 Ngwa, setịpụ aka gị metụ ihe niile o nwere aka, ka ị hụ ma ọ gaghị abụ gị ọnụ.”
But stretch out Your hand and strike all that he has, and he will surely curse You to Your face.”
12 Mgbe ahụ, Onyenwe anyị zara ekwensu sị ya, “Lee Job, jiri niile o nwere mee ihe ọbụla ị chọrọ, kama emetụkwala ndụ ya aka.” Emesịa, ekwensu sitere nʼihu Onyenwe anyị pụọ.
“Very well,” said the LORD to Satan. “Everything he has is in your hands, but you must not lay a hand on the man himself.” Then Satan went out from the presence of the LORD.
13 Otu ụbọchị, mgbe ụmụ Job ndị nwoke na ụmụnne ya ndị nwanyị zukọrọ iri ihe oriri na ịṅụ ihe ọṅụṅụ nʼụlọ nwanne ha nwoke nke okenye.
One day, while Job’s sons and daughters were eating and drinking wine in their oldest brother’s house,
14 Otu onye nʼime ndị na-eje ozi bịakwutere Job sị, “Mgbe ehi anyị na-akọ ọrụ na mgbe ịnyịnya ibu anyị na-ata nri nʼebe dị nso,
a messenger came and reported to Job: “While the oxen were plowing and the donkeys were grazing nearby,
15 ndị Sheba bịara lụsoo anyị ọgụ ma chịkọrọ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ọhụ gị, maọbụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị.”
the Sabeans swooped down and took them away. They put the servants to the sword, and I alone have escaped to tell you!”
16 Mgbe ọ ka kpụ okwu nʼọnụ, onyeozi ọzọ gbabatara kwuo sị, “Ọkụ Chineke zitere sitere na mbara eluigwe daa rechapụ igwe atụrụ na ndị ohu niile. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
While he was still speaking, another messenger came and reported: “The fire of God fell from heaven. It burned and consumed the sheep and the servants, and I alone have escaped to tell you!”
17 Mgbe onye nke ahụ nọ na-ekwu okwu, onyeozi ọzọ batara kwuokwa sị, “Ndị agha ndị Kaldịa kere onwe ha ụzọ atọ bịakwasị ịnyịnya kamel gị niile, dọta ha nʼagha, kpụrụ ha laa. Ha ji mma agha gbuo ndị ohu gị niile gbalaa. Ọ bụ naanị m bụ onye gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
While he was still speaking, another messenger came and reported: “The Chaldeans formed three bands, raided the camels, and took them away. They put the servants to the sword, and I alone have escaped to tell you!”
18 Mgbe ọ kpụ okwu ya nʼọnụ, onyeozi ọzọ batakwara kwuo sị, “Ụmụ gị ndị ikom na ndị inyom nọ nʼụlọ nwanne ha nke okenye na-eri na-aṅụ,
While he was still speaking, another messenger came and reported: “Your sons and daughters were eating and drinking wine in their oldest brother’s house,
19 na mberede, oke ifufe dị ukwuu nke si nʼọzara feere tie akụkụ anọ nke ụlọ ahụ, mee ka ọ dakwasị ha. Ha niile nwụrụ, ma ọ bụkwa naanị m gbapụtara ịgwa gị ihe mere.”
when suddenly a mighty wind swept in from the desert and struck the four corners of the house. It collapsed on the young people and they are dead, and I alone have escaped to tell you!”
20 Mgbe Job nụrụ ihe ndị a, o sitere nʼebe ọ nọ bilie ọtọ, dọwaa uwe ya, kpụchaa agịrị isi ya, ọ dara nʼala ma kpọọ isiala,
Then Job stood up, tore his robe, and shaved his head. He fell to the ground and worshiped,
21 kwuo sị: “Ọtọ ka m gba mgbe m si nʼafọ nne m pụta nʼọnọdụ ịgba ọtọ ka m ga-eji laghachikwa. Onyenwe anyị nyere ihe niile, Onyenwe anyị ewerekwala ihe niile, ka aha Onyenwe anyị bụrụ ihe a gọziri agọzi.”
saying: “Naked I came from my mother’s womb, and naked I will return. The LORD gave, and the LORD has taken away. Blessed be the name of the LORD.”
22 Nʼime ihe ndị a niile, Job emehieghị site nʼibo Chineke ebubo ime ihe ọjọọ.
In all this, Job did not sin or charge God with wrongdoing.

< Job 1 >