< Jeremaya 9 >
1 Ọ gaara adị m mma ma a sị na isi m bụ isi iyi, ebe mmiri si asọpụta; ọ gaara adị m mma ma a sịkwa na anya mmiri akwa jupụtara m nʼanya. Agaara m akwagide akwa ehihie na abalị nʼihi ndị m niile e gburu egbu.
O that my head were waters, And mine eyes a fountain of tears, That I might weep day and night For the slain of the daughter of my people!
2 Ọ gaara adị m mma ma a sị na m nwere ụlọ ndị ije e wuru nʼime ọzara. Ka m nwee ike hapụ ndị m site nʼebe ha nọ pụọ. Nʼihi na ha niile bụ ndị na-akwa iko, igwe ndị na-ekwesighị ntụkwasị obi.
O that I had a traveller's lodge in the wilderness, That I might leave my people, and go from them! For they are all adulterers; An assembly of revolters.
3 “Ha na-ekwe ire ha dịka ụta, ịgbapụ okwu ụgha dịka àkụ; Ọ bụghị site nʼeziokwu ka ihe ji agara ha nke ọma nʼala ahụ. Ha na-esite nʼotu mmehie gaa nʼọzọ; ọ dịkwaghị mgbe ha ji mara m,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
They bend their tongues, like their bows, for lies, And not by truth do they grow mighty in the earth; They proceed from wickedness to wickedness, And have no regard to me, saith Jehovah.
4 “Lezie anya, gbaara enyi gị ọsọ. Atụkwasịkwala nwanne gị obi. Nʼihi na nwanne ọbụla na-aghọ aghụghọ. Ndị enyi niile bụkwa ndị nkwutọ.
Be on your guard each one against his neighbor, And trust ye not in any brother; For every brother will supplant, And every neighbor will slander.
5 Enyi na-aghọgbu enyi ya, ọ dịkwaghị onye na-agwa ibe ya eziokwu. Ha azụọla ire ha ikwu naanị okwu ụgha; ha emeekwala ka ike gwụ anụ ahụ ha ime mmehie.
They deceive every one his neighbor, And do not speak the truth; They have accustomed their tongues to speak lies; They weary themselves in doing iniquity.
6 I bi nʼetiti aghụghọ. Ha jụkwara ịmara m nʼime aghụghọ ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Thy habitation is in the midst of deceit, [[O prophet!]] Through deceit they refuse to know me, saith Jehovah.
7 Ya mere, ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Lee, aga m anụcha ha, nwaa ha ọnwụnwa. Gịnị ọzọ ka m kwesiri ime nʼihi mmehie ndị m?
Therefore thus saith Jehovah of hosts: Behold I will melt them and try them; For what else can I do on account of the daughter of my people?
8 Ire ha na-egbu dịka àkụ. Ọ bụ naanị okwu aghụghọ si na ya apụta. Ha ji ọnụ ha na-agwarịta ibe ha okwu udo, ma nʼime obi ha, ha na-esirịtara onwe ha ọnya igbudu.”
Their tongue is a deadly arrow; Every one of them speaketh treachery; With their mouth they speak peace to their neighbor, But in their heart they lay snares for him.
9 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara sị, “M ga-aghara ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?”
Shall I not punish them for these things? saith Jehovah; Shall I not be avenged on such a nation as this?
10 Aga m anọ nʼelu ugwu ukwu kwa akwa. Nʼebe ahụ ka m ga-anọ kwaa ụwa m nʼihi ebe ịta nri nke anụmanụ ndị ahụ dị nʼọzara. Ha tọgbọrọ nʼefu. Ọ dịghị onye na-ejegharị nʼime ya. A naghị anụkwa olu anụ ụlọ nʼebe ahụ. Ụmụ nnụnụ efefusịala. Otu a kwa, ụmụ anụmanụ alaala.
For the mountains will I lift up a weeping and wailing, And for the pastures of the plains a lamentation, For they are burned up, so that none can pass through them; No more is heard the voice of the cattle; Both the birds of the heavens and the beasts have fled, and are gone.
11 “Aga m eme ka Jerusalem ghọọ ebe a na-awụfu unyi. Ọ ga-aghọ ebe nkịta ọhịa na-awagharị na-achọ nri. Aga m ekposa obodo niile nke Juda. Ọ dịkwaghị onye ga-ebi na ya.”
I will make Jerusalem heaps of stones, The dwelling-place of jackals; And I will make the cities of Judah desolate, without an inhabitant.
12 Olee onye ahụ maara ihe, nke nwere ike ịghọta ihe ndị a niile? Onye ka Onyenwe anyị ziri ihe ndị a, nke ga-akọwa ya? Gịnị mere e ji bibie ala a, kposaa ya, mee ka ọ tọgbọrọ nʼefu dịka ọzara mmadụ na-enweghị ike ịgafe?
Who is the wise man, that he may understand this, And he to whom the mouth of the Lord hath spoken, that he may declare it? Why is it that the land perisheth, That it is burned up like a desert, which none passeth through?
13 Onyenwe anyị kwuru sị, “Ọ bụ nʼihi na ha agbakụtala iwu ahụ m nyere ha idebe azụ. Ha jụrụ irubere m isi, jụkwa ịgbaso iwu m.
Jehovah himself hath said: It is because they have forsaken my law, Which I set before them, And have not hearkened to my voice, Nor walked according to it;
14 Kama, ha na-agbaso isiike nke obi ha, ha gbasoro chi Baal dịka nna nna ha si kuziere ha.”
But have walked after the obstinacy of their own heart, And after the Baals, as their fathers taught them.
15 Nʼihi ya, nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, Chineke nke Izrel kwuru, “Lee, aga m eme ka ndị a rie nri na-akụ ilu. Ha ga-aṅụkwa mmiri e tinyere nsi.
Therefore thus saith Jehovah of hosts, the God of Israel: Behold, I will feed this people with wormwood, And give them water of hemlock to drink.
16 Aga m ekposa ha na mba niile nke ụwa. Ha ga-ebi na mba nke ha na nna ha na-amaghị. Aga m eji mma agha chụọ ha ọsọ tutu ruo mgbe m bibiri ha niile.”
I will also scatter them among nations Which neither they nor their fathers have known, And I will send after them the sword, Till I have made an end of them.
17 Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Tụgharịanụ uche unu ugbu a. Kpọọnụ ụmụ nwanyị ndị ọrụ ha bụ ịbụ abụ akwa. E, zienụ ozi ka ndị ọkachamara nʼetiti ha bịa.
Thus saith Jehovah of hosts: Consider ye, and call for the mourning women, that they may come, And send to the skilful ones, that they may come;
18 Ha bịa ngwangwa kwaa akwa nʼihi anyị, tutu anya mmiri akwa ejupụta ha nʼanya, tutu anya mmiri akwa esite anyị nʼanya na-asọda ruo na ntị anyị.
Let them make haste, and lift up a wailing for us, That our eyes may run down with tears, And our eyelids gush forth with waters.
19 Olu ụzụ ịkwa akwa ka a nụrụ site na Zayọn ‘Lee ka anyị si laa nʼiyi! Lee ka ihe ihere anyị si dị ukwuu! Nʼihi na anyị hapụrụ ala anyị, nʼihi na ha etikpọsịala ebe obibi anyị niile.’”
Behold, a voice of wailing is heard from Zion: “How are we spoiled! How are we put to shame! We must leave our native land; They have cast down our habitations.”
20 Ugbu a, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ụmụ nwanyị, megheenụ ntị unu nụrụ okwu si ya nʼọnụ. Kuzierenụ ụmụ unu ndị inyom otu e si eti mkpu akwa, kuziekwaranụ ibe unu abụ akwa.
Hear, O ye women, the word of Jehovah! Let your ear receive the word of his mouth! Teach your daughters a lamentation, And every one her companion a mournful dirge!
21 Nʼihi na ọnwụ abatala nʼetiti anyị, o si na oghereikuku niile nke ụlọ anyị bata nʼebe niile e wusiri ike nke ala anyị. O gbuola ụmụntakịrị ndị na-ejegharị nʼokporoụzọ, gbukwaa ụmụ okorobịa ndị na-anọ nʼama.
For death cometh in through our windows, It entereth our palaces; It cutteth off the children from the street, And the young men from the public places.
22 Gwa ha, sị, “Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “‘Ozu ndị nwụrụ anwụ ga-atọgbọrọ dịka unyi e kpofuru nʼọhịa, dịka ukwu ọka nke e gbuturu nʼazụ onye na-aghọ mkpụrụ ubi, nke ọ dịghị onye ga-achịkọta ha.’”
Declare it, saith Jehovah! The dead bodies of men shall fall as dung upon the open field, And as the handful behind the reaper, Which none gathereth up.
23 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ka onye maara ihe hapụ ịnya isi nʼihi amamihe ya, ka onye dị ike ghara ịnya isi nʼihi ịdị ike ya, ka ọgaranya hapụkwa ịnya isi nʼihi ịba ụba nke akụ ya,
Thus saith Jehovah: Let not the wise man glory in his wisdom, Nor let the mighty glory in his might, Nor let the rich glory in his riches!
24 kama, onye ọbụla na-anya isi, ya nyaa isi nʼihi nke a: na o nwere uche ịghọta na mụ onwe m bụ, Onyenwe anyị nke na-eme obi ebere, na-ekpe ikpe ziri ezi na ezi omume nʼụwa. Nʼihi nʼihe ndị a ka m na-enwe obi ụtọ,” ka Onyenwe anyị kwubiri.
But let him that glorieth glory in this, That he hath regard to me, and knoweth me, That I am Jehovah, who exercise loving-kindness, Justice, and righteousness upon the earth; For in these do I delight, saith Jehovah.
25 “Lee, ụbọchị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata ndị ahụ niile nke e biri ugwu naanị nʼanụ ahụ ha ahụhụ.
Behold the days come, saith Jehovah, That I will punish all the circumcised with the uncircumcised,
26 Ya bụ ndị Ijipt, Juda, Edọm, Amọn, na Moab, na ndị ahụ niile bi nʼọzara nʼebe dị anya. Nʼihi na, nʼezie, mba ndị a niile bụ ndị a na-ebighị ugwu. Ọ bụladị ụlọ Izrel niile bụ ndị a na-ebighị ugwu nʼime obi ha.”
Egypt, and Judah, and Edom, And the sons of Ammon and Moab, And all with shaven cheeks, that dwell in the wilderness. For all the nations are uncircumcised, And all the house of Israel is uncircumcised in heart.