< Jeremaya 8 >

1 “‘Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, nʼoge ahụ a ga-esi nʼili ha wezuga ọkpụkpụ ndị eze, na ọkpụkpụ ndịisi ọchịchị Juda, na ọkpụkpụ ndị nchụaja na ndị amụma, na ọkpụkpụ ndị niile bi na Jerusalem.
Na tango wana, elobi Yawe, bakobimisa mikuwa ya bakonzi mpe ya bakalaka ya Yuda, mikuwa ya Banganga-Nzambe mpe ya basakoli elongo na mikuwa ya bato ya Yelusalemi, wuta na malita na bango.
2 A ga-agbasapụ ha nye anyanwụ, na ọnwa, na kpakpando niile nke mbara eluigwe, bụ ihe ndị ahụ niile ha hụrụ nʼanya na ihe ha na-akpọ isiala nye. Bụkwa ihe ndị ahụ ha na-agbaso, nke ha na-ajụta ase site nʼaka ha, na-efekwa. A gaghị ekpokọta ọkpụkpụ ndị a niile, maọbụ lie ha nʼala. Kama ha ga-aghasara nʼala dịka unyi.
Bakotanda yango na se ya moyi, na se ya sanza mpe na se ya mampinga nyonso ya likolo, oyo balingaki, basalelaki na esengo, balandaki, batunaki makambo mpe bafukamelaki. Bakosangisa lisusu mikuwa yango te mpo na kokunda yango, kasi ekokoma lokola matiti ya kopola, na mabele.
3 Nʼebe niile nke m chụsara ha, bụ ndị fọdụrụ ndụ site na mba ọjọọ a, ha ga-ahọrọ ọnwụ karịa ịdị ndụ. Otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwubiri.’
Na bisika nyonso oyo nakopanza bango, elobi Yawe, Mokonzi ya mampinga, bato nyonso oyo bakotikala na bomoi kati na ekolo oyo ya mabe bakoluka kufa na esika ya bomoi. ›
4 “Ị ga-asịkwa ha, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru: “‘Mgbe mmadụ dara ada, ọ dịghị ebili ọtọ? Mgbe mmadụ daghachiri azụ, ha ọ dịghị alaghachi azụ?
Loba na bango: ‹ Tala liloba oyo Yawe alobi: Boni, soki moto akweyi, atelemaka te? Soki moto abungi nzela, azongaka lisusu na nzela te?
5 Gịnịkwa mere ndị a ji tụgharịa site nʼịgbaso ụzọ ọjọọ ha? Gịnị mere Jerusalem ji nọgide na-agbaso ụzọ ọjọọ? Lee, ha na-ejidesi aghụghọ aka ike; ha jụrụ ịtụgharị.
Mpo na nini bato ya Yelusalemi babungi nzela? Mpo na nini bazali kokangama kaka na nzela na bango ya mabe? Bamipesi makasi na makambo ya lokuta mpe baboyi kozongela Ngai.
6 Aṅaala m ntị, ma anụbeghị m ka ihe ọma ọbụla si ha nʼọnụ na-apụta. O nweghị onye nʼime ha chegharịrị tie aka nʼobi sị, “Gịnị bụ ihe a m mere?” Kama onye ọbụla na-agbaso ụzọ nke aka ya, dịka ịnyịnya nke na-agbaba nʼọgbọ agha.
Nayokaka na bokebi makambo nyonso oyo balobaka, kasi balobaka makambo ya solo te. Moko te kati na bango ayokaka motema pasi mpo na mabe oyo asalaka, alobaka: ‘Nasali nini?’ Moto na moto akangamaka kaka na nzela na ye lokola mpunda oyo ezali kokende na bitumba.
7 Ọ bụladị ụgbala na-efegharị na mbara eluigwe maara oge ya a kara aka. Nduru, na eleke, na okwolo makwaara mgbe ha kwesiri isite nʼotu ebe obibi ha gafee nʼebe obibi ọzọ. Ma ndị m amaghị ihe Onyenwe anyị chọrọ site nʼaka ha.
Ezala kutu nkongi, kati na likolo, eyebaka bileko ya kokende na bisika mosusu; ebenga, ndeke ya mayi mpe mbilambila eyebaka ata tango ya kozonga, kasi bato na Ngai bayebi mibeko ya Yawe te.
8 “‘Unu si aṅaa kwuo, “Ndị maara ihe ka anyị bụ, nʼihi na iwu Onyenwe anyị dị nʼaka anyị,” ebe ọ bụ na mkpisi akwụkwọ aghụghọ ndị ode akwụkwọ unu adịghị akọwa iwu ya otu o kwesiri?
Ndenge nini bokoki koloba: ‘Tozali bato ya bwanya, pamba te toyebi Mobeko ya Yawe,’ tango sik’oyo ekomeli ya balakisi ya Mobeko ebongoli yango lokuta?
9 A ga-eme ka ihere mee ndị maara ihe; a ga-eme ka ụjọ jupụta ha obi, meekwa ka ha maa nʼọnya. Ebe ọ bụ na ha ajụla okwu Onyenwe anyị, ọ bụ ụdị amamihe dị aṅaa ka ha nwere?
Bato ya bwanya bakoyokisama soni, bakoyoka somo mpe bakokende na bowumbu, pamba te batiolaki Liloba na Yawe. Bazali na bwanya ya ndenge nini?
10 Ya mere, aga m akpọnye ndị ikom ọzọ nwunye ha, werekwa ubi ha nyefee nʼaka ndị ọrụ ubi ọzọ. Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
Yango wana, nakokaba basi na bango epai ya mibali mosusu, mpe bilanga na bango epai ya bato mosusu; pamba te bango nyonso, ezala mikolo to bana mike, batondi na lokoso ya mbongo; basakoli mpe Banganga-Nzambe nyonso bakomi se kotambola na lokuta;
11 Ha na-ekechi ọnya ndị m dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, “Udo dị, udo dị,” mgbe udo na-adịghị.
bazali kosalisa bapota ya bato na Ngai likolo-likolo mpe bazali koloba: ‘Makambo nyonso ezali malamu, nyonso ezali kotambola malamu!’ Nzokande, ata likambo moko ya malamu ezali te.
12 Ihere o mere ha nʼihi omume arụ ha niile? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị; nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere. Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada; ha ga-asọ ngọngọ mgbe e nyere ha ntaramahụhụ. Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
Boni, bazali koyokela makambo na bango ya nkele soni? Te! Bazali koyoka ata soni te; bayebi kutu te ndenge bayokaka soni! Yango wana, bakokufa lokola bato nyonso, bakokweyisama tango bakozwa etumbu, elobi Yawe.
13 “‘Aga m anapụ ha ihe owuwe ubi niile ha nwetara, otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. Ha agaghị enwekwa mkpụrụ vaịnị, maọbụ mkpụrụ osisi fiig nʼelu osisi fiig ha. Akwụkwọ osisi ndị a niile ga-akpọnwụ. A ga-anapụkwa ha ihe niile m nyere ha.’”
Nakobebisa milona na bango, elobi Yawe. Bambuma ya vino ekozala lisusu te na banzete ya vino, mbuma ya figi ekozala lisusu te na banzete ya figi, mpe makasa ya banzete yango ekokawuka. Bakobotola bango biloko oyo napesaki bango. › »
14 Gịnị ka unu na-eme nʼebe a unu nọdụrụ ala? Kwakọtaanụ ihe unu niile. Ngwa, ka anyị gbapụnụ ọsọ gaa nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike nọdụ nʼebe ahụ nwụọ! Nʼihi na Onyenwe anyị Chineke anyị amaala anyị ikpe ọnwụ. O nyela anyị mmiri e tinyere nsi ka anyị ṅụọ, nʼihi na anyị emehiela megide ya.
Mpo na nini tozali kovanda awa? Tosangana esika moko! Tika ete tokima kati na bingumba batonga makasi mpo ete tokufela kuna! Pamba te Yawe, Nzambe na biso, afungoleli biso ekuke ya kufa mpe apesi biso mayi oyo ezali na ngenge mpo ete tomela, pamba te tosalaki masumu liboso na Ye.
15 Anyị lere anya udo, ma o nweghị ihe ọma ọbụla anyị hụrụ. Anyị lere anya ọgwụgwọ ọrịa anyị, maọbụ naanị ihe egwu ka anyị hụrụ.
Tozalaki na elikya ete tokozala na kimia, kasi tomoni likambo moko te ya malamu; tozalaki na elikya ete tokobika, kasi pasi na pasi nde ezali kolanda biso!
16 E sitere na Dan nụ ụda ịma imi ịnyịnya ndị iro. Ala a niile mara jijiji mgbe ha nụrụ akwa nke ịnyịnya ndị ahụ dị ike. Ha na-abịa ịla ala a na ihe niile dị nʼime ya nʼiyi. Ọ bụkwa otu ihe ahụ ka ha na-abịa ime obodo a na ndị bi nʼime ya.
Lokito ya bampunda ya banguna mpe makelele ya makolo na yango ezali koyokana wuta na Dani, ezali koya mpo na kobebisa mokili mpe biloko nyonso oyo ezali kati na yango, engumba mpe bavandi na yango nyonso, bongo mokili mobimba eningani.
17 “Lee, ana m ezibata agwọ ọjọọ, ndị na-atagbu atagbu, nʼetiti unu. Ajụala nke ọ dịkwaghị ụra ga-arata ha. Ana m ezibata ha ka ha taa unu.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
« Botala, nakotindela bino banyoka oyo ebomaka, bitupa oyo moto akoki kosakana na yango te, mpo ete eswa bino, » elobi Yawe.
18 Ọ ga-adị mma ma ọ bụrụ na m hụrụ onye ga-akasị m obi nʼime ọnọdụ iru ụjụ m, nʼihi na obi m na-ada mba nʼime m.
Pasi na ngai ezangeli kisi mpo na kosilisa yango, motema na ngai elembi kati na ngai.
19 Gee ntị nụrụ akwa ndị m ka ọ na-ada site nʼebe dị anya. “Onyenwe anyị, ọ sitela na Zayọn pụọ? Ọ pụtara na Eze ha anọkwaghị nʼebe ahụ?” “Gịnị mere ha ji site nʼoyiyi a tụrụ atụ, na arụsị ndị mba ọzọ ha na-efe kpasuo m iwe?”
Yoka koganga ya bato na ngai wuta na mokili ya mosika: « Boni, Yawe azali lisusu te, kati na Siona? Mokonzi na yango azali lisusu kuna te? » « Mpo na nini batumbolaki kanda na Ngai na nzela ya banzambe na bango ya bikeko, na nzela ya banzambe ya bapaya oyo ezanga ata tina? »
20 “Oge owuwe ihe ubi agafeela, leekwa na ọkọchị agabigakwala, ma a zọpụtabeghị anyị.”
« Tango ya kobuka mbuma esili koleka, elanga mpe esili kokoma na suka, kasi biso tobikisami te. »
21 Ebe ọ bụ na a zọpịara ndị m, ọ bụkwa m ka azọpịara. Anam eru ụjụ, oke egwu jisikwara m aka ike.
Ndenge bato na ngai bazali koyoka pasi, ndenge wana mpe ngai nazali koyoka pasi, nazali kolela, mpe somo ekangi ngai makasi.
22 Ọ pụtara na o nweghị mmanụ otite na-eme ka ọnya laa dị na Gilead? Ọ bụ na e nwekwaghị dibịa nọ nʼebe ahụ? Gịnị mere o nweghị ọgwụgwọ dịrị ndị m nʼihi mmerụ ahụ ha niile?
Boni, kisi ezali te kati na Galadi? Minganga bazali kuna te? Bongo mpo na nini bato na ngai bazali kobika te?

< Jeremaya 8 >