< Jeremaya 6 >

1 “Gbalaganụ unu ụmụ Benjamin! Sitenụ na Jerusalem gbapụ! Gbuonụ opi ike na Tekoa! Bulienụ ihe ngosi elu na Bet-Hakerem! Nʼihi na lee, ihe ọjọọ si nʼakụkụ ugwu na-abịa, e, mbibi dị ukwuu na-abịa.
“Balekani ukuze liphephe, bantu bakoBhenjamini! Balekani eJerusalema! Tshayani icilongo eThekhowa! Phakamisani uphawu phezu kweBhethi-Hakheremi. Ngoba umonakalo uyabonakala ngasenyakatho, kanye lencithakalo eyesabekayo.
2 Aga m ebibi ada Zayọn, onye mara ezi mma, na onye dịkwa pekepeke.
Indodakazi yaseZiyoni enhle kangaka lebucayi ngizayibhubhisa.
3 Ndị na-azụ atụrụ ga-eduru igwe atụrụ bịa megide ya. Ha ga-ama ụlọ ikwu ha gburugburu ya. Onye ọbụla nʼime ha ga-elekọtazi akụkụ ala nke o ketara anya nke ọma.
Abelusi lemihlambi yabo bazakuza bamelane layo; bazamisa amathente abo eyihanqile, lowo lalowo elinde indawo yakhe.”
4 “Jikerenụ ibu agha megide ya! Bilienụ, ka anyị buso ha agha nʼehihie. Ma lee, anyanwụ ebidola ịda, onyinyo anyasị na-esetipụkwa onwe ya.
“Lungelani ukulwa layo! Vukani, kasihlaseleni emini! Kodwa, habe, ukukhanya sekufiphala, lamathunzi okuhlwa asesiba made.
5 Ya mere, bilienụ ka anyị buso ha agha, ọ bụladị nʼabalị! Ka anyị bibie ebe ha niile e wusiri ike!”
Ngakho vukani, kasihlaseleni ebusuku sidilize izinqaba zayo!”
6 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, kwuru, “Gbutusienụ osisi niile, wuonụ nkwasa ọgụ gburugburu Jerusalem. A ghaghị ịta obodo a ahụhụ, nʼihi na mmegbu jupụtara nʼime ya.
UThixo uSomandla uthi: “Gamulani izihlahla liziwise lakhe imiduli yokuvimbezela iJerusalema. Idolobho leli kumele lijeziswe, ligcwele ukuncindezela.
7 Dịka mmiri si esite nʼolulu mmiri na-asọpụta otu a ka ajọ omume na-esite nʼime ya na-asọpụta. Ihe ike na mbibi ka a na-anụ nʼime ya; ọrịa ya niile na ọnya ya niile ka a na-eche nʼihu m oge niile.
Njengomthombo ugobhoza amanzi awo, ngokunjalo lalo ligobhoza ububi balo. Udlakela lokubhubhisa kuyezwakala phakathi kwalo, umkhuhlane walo lamanxeba ngihlezi ngikukhangele.
8 Nabata ịdọ aka na ntị m, gị Jerusalem, ka m ghara ịgbakụta gị azụ, mee ka ala gị tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla hapụkwa inwe ike ibi nʼime ya.”
Xwayiseka, we Jerusalema, hlezi ngikutshiye, lelizwe lakho ngilichithe, kungabi lomuntu ohlala kulo.”
9 Nke a bụ ihe Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Ka ha tụtụkọtasịa ndị niile fọdụrụ nʼala Izrel nke ọma, dịka e si atụtụkọta mkpụrụ niile dị nʼosisi vaịnị; werenụ aka chọgharịa nʼalaka niile, dịka onye ọghọ mkpụrụ vaịnị si eme.”
UThixo uSomandla uthi: “Kababuthe izinsalela zako-Israyeli ngokupheleleyo njengevini, dlulisa futhi isandla sakho phezu kwezingatsha, njengomuntu ovuna amavini.”
10 Ma onye kwanụ ka m nwere ike ịgwa okwu ma dọọ aka na ntị? Onye ga-ege ntị ịnụrụ ihe m na-ekwu? Ntị ha emechiela ruo na ha enweghị ike ịnụ ihe ọbụla. Okwu Onyenwe anyị aghọọla ihe ha na-achọghị ịnụ ọzọ; nke na-adịghị ewetara ha obi ụtọ.
Ngubani engingakhuluma laye ngimxwayise na? Ngubani ozangilalela na? Indlebe zabo zivalekile ngakho abangeke bezwe. Ilizwi likaThixo liyisinengiso kubo. Kabafumani ntokozo kulo.
11 Ma ọnụma Onyenwe anyị juru m obi, apụghị m ịnagide ya nʼime m. “Wụkwasị ya nʼahụ ụmụntakịrị ndị nọ nʼokporoụzọ; wụkwasịkwa ya ụmụ okorobịa ebe ha zukọrọ. Ọ bụladị di na nwunye ga-anụrụ ụfụ ọnụma ahụ, ndị agadi na ndị ahụ merela nnọọ ezigbo agadi.
Kodwa mina ngiyafuthelana ngolaka lukaThixo, ngingeke ngibe ngisalugodla ngaphakathi. “Lwehlisele phezu kwabantwana emgwaqweni laphezu kwamajaha abuthene ndawonye, bobabili indoda lomkayo luzabehlela, kanye labadala, labo abakhulelwa yiminyaka.
12 A ga-ewere ụlọ ha nyefee nʼaka ndị ọzọ. A ga-ewerekwa ala ubi ha na ndị nwunye ha nye ndị ọzọ, mgbe m setịpụrụ aka m megide ndị ahụ bi nʼala ahụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Izindlu zabo zizanikwa abanye, konke lamasimu abo kanye labafazi babo, lapho ngiselula isandla sami ngimelana lalabo abahlala elizweni,” kutsho uThixo.
13 “Nʼihi na site nʼonye ukwu ruo nʼonye dịkarịsịrị nta, ọ bụ naanị akpịrị uru na-ezighị ezi ka e ji mara ha. Ọ bụladị ndị amụma na ndị nchụaja na-etinyekwa aka nʼọrụ aghụghọ.
“Kusukela kwabancane kusiya kwabakhulu, bonke bayizihwaba ezifuna inzuzo, banjalo abaphrofethi kanye labaphristi, bonke benza inkohliso.
14 Ha na-ekechi ọnya ndị m, dịka a ga-asị na ọ dịghị ihe ọ bụ. Ha na-asị, ‘Udo dị, udo dị,’ mgbe udo na-adịghị.
Babopha inxeba labantu bami kungathi kalilibi kakhulu. Bathi, ‘Ukuthula, ukuthula,’ khona ukuthula kungekho.
15 O nwere ụzọ omume ha ndị a rụrụ arụ si eme ha ihere? Mba! Ihere adịghị eme ha ma ọlị. Nʼezie, ha amakwaghị ihe a na-akpọ inwe ihere! Nʼihi ya, ha ga-ada nʼetiti ndị dara ada. Ha ga-asọ ngọngọ mgbe m tara ha ahụhụ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
Bayayangeka na ngokuziphatha kwabo okwenyanyekayo? Hatshi, bavele kabalazo inhloni lokuyangeka kabakwazi. Ngakho bazawela phakathi kwabawileyo, bazakwehliselwa phansi lapho sengibajezisa,” kutsho uThixo.
16 Ihe ndị a kwa bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Guzonụ nʼebe niile ụzọ gbara abụọ. Lee anya. Jụọnụ ajụjụ banyere okporoụzọ ochie ahụ. Jụpụtanụ ebe ụzọ ọma ahụ dị, jeenụ ije nʼime ya. Unu gbaso ya, unu ga-achọtara mkpụrụobi unu ebe izuike. Ma gịnị ka unu kwuru? Unu sịrị. ‘Anyị agaghị agbaso ụzọ ọma ahụ.’
UThixo, uthi: “Manini emahlanganweni emigwaqo likhangele, libuze izindledlana ezindala, libuze lapho okulendlela enhle khona, lihambe ngayo, lizathola ukuphumula kwemiphefumulo yenu. Kodwa lina lithe, ‘Kasiyikuhamba ngayo.’
17 Ahọpụtara m ndị nche doo ha ichebe unu. Agwakwara m unu okwu sị, ‘Ṅaanụ ntị nʼụda opi ike ha.’ Ma unu kwuru sị, ‘Anyị agaghị ege ntị!’
Ngalibekela abantu bokulilinda ngathi, ‘Lalelani ukukhala kwecilongo!’ Kodwa lina lathi, ‘Kasiyikulalela.’
18 Ya mere, nụrụnụ, unu mba niile; lezienụ anya, unu ndị akaebe niile, ka unu hụrụ ihe na-aga ịbịakwasị ha.
Ngakho zwanini, lina zizwe, khangelani, lina elingofakazi, libone okuzakwenzakala kubo.
19 Nụrụ, gị ụwa, lee, ana m aga iwetara ndị a ịla nʼiyi, nke bụ mkpụrụ atụmatụ ọjọọ ha niile, nʼihi na ha jụrụ ige ntị nʼokwu m. Ha jụkwara ịnabatara onwe ha iwu m.
Zwana, wena mhlaba, ngiletha umonakalo phezu kwabantu laba, izithelo zamaqhinga abo, ngoba kabawalalelanga amazwi ami njalo bawalile lomthetho wami.
20 Gịnị ka m ji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nke unu si nʼobodo Sheba bubata, eme? Gịnị ka m ji ụda kalamus ọma unu si mba dị anya bubata eme? Ajụla m ịnabata aja nsure ọkụ unu niile. Aja niile unu na-achụ adịghị atọ m ụtọ.”
Ngilani lempepha yaseShebha loba imfe evela elizweni elikude na? Iminikelo yenu yokutshiswa kayamukeleki, imihlatshelo yenu kayingithokozisi.”
21 Ya mere, ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “Aga m etinye ihe ịsọ ngọngọ nʼụzọ ndị a si agafe. Nna na nwa ya ga-asọ ngọngọ nʼelu ya; otu a kwa, ndị agbataobi na enyi ha ga-ala nʼiyi.”
Ngakho uThixo uthi: “Ngizabeka imigoqo phambi kwalababantu. Abazali labantwana bazakhubeka kuyo, omakhelwane labangane bazabhubha.”
22 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ndị agha si nʼala dị nʼebe ugwu na-abịa; mba dị ukwuu ka a na-akpọlitekwa site na nsọtụ niile nke ụwa.
UThixo uthi: “Khangelani, ibutho liyeza livela elizweni lasenyakatho, isizwe esikhulu siyadungwa kusukela emikhawulweni yomhlaba.
23 Ha ji ụta na ùbe, ha bụ ndị afọ tara mmiri, ndị na-adịghị eme obi ebere. Ha na-ebigbọ dịka mbigbọ nke osimiri, dịka ha na-anọkwasị nʼelu ịnyịnya ha. Ha na-abịa dịka ndị ikom e doro nʼusoro ibu agha, ibuso gị agha, Ada Zayọn.”
Bahlome ngamadandili langemikhonto, balesihluku kabalasihawu. Bezwakala njengolwandle oluhlokomayo lapho begade amabhiza abo, beza njengabantu abalungele impi ukuba bakuhlasele, wena Ndodakazi yaseZiyoni.”
24 Anyị anụla akụkọ banyere ude ha, ike agwụla aka anyị abụọ kpamkpam. Oke ihe mgbu na-ejide anyị dị ka nke nwanyị ime na-eme.
Sesizwe imibiko ngabo, njalo izandla zethu zilenga zingelamandla. Usizi lusibambile, ubuhlungu obunjengowesifazane ohelelwayo.
25 Ka onye ọbụla gharakwa ịga nʼubi, maọbụ ijegharị nʼokporoụzọ, nʼihi na ndị iro ji mma agha na-agagharị, egwu dịkwa nʼebe niile.
Lingayi phandle egangeni, loba lihambe emigwaqweni, ngoba isitha silenkemba, njalo silencithakalo emaceleni wonke.
26 Unu ndị m, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe. Tụrụọnụ onwe unu na ntụ, ruonụ uju, ma kwaanụ akwa, dịka nwanyị na-eru ụjụ nʼihi ọnwụ otu nwa nwoke ọ mụtara. Nʼihi na onye mbibi ahụ ga-abịakwasị anyị na mberede.
Awu bantu bami, gqokani amasaka, lizibhuqe emlotheni, khalani lilile kabuhlungu njengokwendodana eyiyo yodwa, ngoba masinyane nje umchithi uzafika kithi.
27 “Emeela m gị ka ị bụrụ onye na-anwapụta ọla, ma ọla ahụ bụkwa ndị m. Achọrọ m ka i nyochaa ma nwapụtakwa ụzọ ha niile.
“Ngikwenze umhloli wezinsimbi labantu bami babayilitshe elixubene lensimbi ukuba ukhangele ubone ube usuhlola izindlela zabo.
28 Ha bụ ndị nnupu isi, ndị nwere obi nʼazụ, ndị na-ejegharị na-ekwutọ ibe ha. Ha bụ bronz na igwe; ọ bụkwa ndụ rụrụ arụ ka ha na-ebi.
Bonke bangabahlamuki abalukhuni, abahamba behleba. Balithusi lensimbi, bonke benza ukuxhwala.
29 Ngwa ọrụ ọkpụ uzu na-afụnwu ọkụ ike ike, ime ka ọkụ rechapụ akụkụ igwe ahụ na-enweghị isi, ma nnụcha ahụ na-aga nʼihu abaghị uru, nʼihi na anụchapụghị ndị ajọ omume.
Imvutho ivutha okwesabekayo incibilikisa umnusu ngokutshisa komlilo kodwa ukucenga kuqhubeka kuyize, ababi kabakhutshwanga.
30 Ọlaọcha a jụrụ ajụ ka akpọrọ ha, nʼihi na Onyenwe anyị ajụla ha.”
Kuthiwa bayisiliva esilahliweyo, ngoba uThixo usebalahlile.”

< Jeremaya 6 >