< Jeremaya 51 >

1 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, aga m akpali mmụọ onye mbibi, ka ọ bịa megide Babilọn na ndị bi na Kaldịa.
Yehova akuti, “Taonani, ndidzadzutsa mphepo yowononga kuti iwononge Babuloni pamodzi ndi anthu a ku Lebi Kamai.
2 Aga m eziga ndị mba ọzọ nʼobodo Babilọn, ka ha gaa fụchaa ya, bibiekwa ala ya. Ha ga-emegide ya nʼakụkụ niile, nʼụbọchị ahụ ihe ọjọọ ga-abịakwasị ya.
Ndidzatuma alendo ku Babuloni kudzamupeta ndi kuwononga dziko lake kotheratu. Iwo adzalimbana naye ku mbali zonse pa tsiku la masautso ake.
3 Ekwela ka onye na-agba ụta kwee ụta ya, ekwekwala ka o yikwasị uwe agha ya. Enwekwala ọmịiko nʼebe ụmụ okorobịa ya nọ, kama bibie usuu ndị agha ya kpamkpam.
Okoka uta musawalekerere kapena wonyadira chovala chawo chankhondo. Musawasiye anyamata ake kuti akhale ndi moyo; koma muwononge ankhondo ake kotheratu.
4 Ha ga-ada, bụrụ ndị e gburu egbu nʼime Babilọn, ha ga-abụ ndị e merụrụ oke ahụ nʼokporoụzọ niile.
Adzavulazidwa ndi kufera mʼdziko la Babuloni lomwelo ndi mʼmisewu yawo yomwe.
5 Ọ bụ ezie nʼala ha jupụtara nʼikpe ọmụma, nʼihu Onye nsọ nke Izrel, ma Chineke bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile agbakụtabeghị ndị Izrel na Juda azụ.
Pakuti Yuda ndi Israeli sanasiyidwe ngati amasiye ndi Mulungu wawo, Yehova Wamphamvuzonse, koma ngakhale dziko la Babuloni ndi lodzaza ndi machimo pamaso pa Woyerayo wa Israeli.
6 “Sinụ na Babilọn gbapụ ọsọ. Gbasienụ ọsọ ike nʼihi ndụ unu. Unu ekwela ka e bibie unu nʼihi mmehie ya. Oge ịbọ ọbọ Onyenwe anyị eruola, ọ ga-akwụghachi ya ihe ruuru ya.
“Thawaniko ku Babuloni! Aliyense apulumutse moyo wake! Musawonongeke naye pamodzi chifukwa cha machimo ake. Imeneyi ndi nthawi yoti Yehova amulange; Yehova adzamulipsira.
7 Babilọn dị ka iko ọlaedo nʼaka Onyenwe anyị. O mere ka ụwa niile si nʼiko ahụ ṅụbiga ihe ọṅụṅụ oke. Mba niile nke ụwa ṅụrụ mmanya ya. Ugbu a ha niile na-ayị ara.
Babuloni anali ngati chikho cha golide mʼdzanja la Yehova; kuti aledzeretse dziko lonse lapansi. Mitundu yambiri ya anthu inamwa vinyo wake; nʼchifukwa chake tsopano inachita misala.
8 Na mberede, Babilọn ga-ada, a ga-etipịakwa ya. Kwasierenụ ya akwa ike. Wetanụ ọgwụ tee ya, ma eleghị anya ọnya ahụ ga-adị ya mma.
Babuloni wagwa mwadzidzidzi ndi kusweka. Mulireni! Mfunireni mankhwala opha ululu wake; mwina iye nʼkuchira.”
9 “‘Anyị gaara agwọ Babilọn, ma ọrịa ji ya enweghị ngwọta. Ka anyị hapụnụ ya; ka anyị niile nʼotu nʼotu laghachi nʼobodo nke aka anyị, nʼihi na ikpe ọmụma dịrị ya eruola mbara eluigwe. Ọ na-arịgokwa ruo nʼigwe ojii.’
Ena anati, “‘Ife tinayesa kumupatsa mankhwala Babuloni, koma sanachire; tiyeni timusiye ndipo aliyense apite ku dziko la kwawo, pakuti mlandu wake wafika mpaka mlengalenga, wafika mpaka kumwamba.’
10 “‘Onyenwe anyị emeela ka ezi omume anyị pụta ìhè. Ka anyị kwupụta ihe Onyenwe anyị Chineke anyị mere na Zayọn.’
“‘Yehova waonetsa poyera kuti ndife osalakwa; tiyeni tilengeze mu Ziyoni zimene Yehova Mulungu wathu wachita.’
11 “Mụọnụ ọnụ àkụ unu; bulienụ ọta unu! Onyenwe anyị akwaliela ndị eze ndị Midia, nʼihi na nzube ya bụ ịla Babilọn nʼiyi. Onyenwe anyị ga-abọrọ onwe ya ọbọ, ọ ga-abọtara ụlọnsọ ukwu ya ọbọ.
“Yehova wadzutsa mitima ya mafumu a Amedi, popeza cholinga chake ndi kuwononga Babuloni. Motero adzalipsira Ababuloni chifukwa chowononga Nyumba yake. Ndiye Yehova akuti, ‘Nolani mivi, tengani zishango.’
12 Bulienụ ọkọlọtọ nʼihi imegide mgbidi Babilọn. Tinyekwanụ ndị agha ọzọ nʼetiti ndị nche, ka ọnụọgụgụ ha hie nne Kwadoonụ ndị ga na-elepụ anya. Kwadoonụ ndị agha ga-ezo onwe ha, nʼihi na Onyenwe anyị ga-eme ka ihe o zubere mezuo, bụ ihe ahụ o kpebiri megide ndị Babilọn.
Kwezani mbendera yankhondo kuti muwononge malinga a Babuloni! Limbitsani oteteza, ikani alonda pa malo awo, konzekerani kulalira. Pakuti Yehova watsimikiza ndipo adzachitadi zomwe ananena za anthu a ku Babuloni.
13 Unu bụ ndị bi nʼakụkụ ọtụtụ mmiri, ndị nwere akụnụba dị ukwuu, ọgwụgwụ unu abịaruola. Oge ahụ eruola mgbe e ji wezuga unu.
Inu muli ndi mitsinje yambiri ndi chuma chambiri. Koma chimaliziro chanu chafika, moyo wanu watha.
14 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ji onwe ya ṅụọ iyi, sị, Nʼezie, aga m eme ka ndị mmadụ ọnụọgụgụ ha ga-aha ka igurube jupụta nʼime gị. Ha ga-etikwa mkpu ọṅụ megide gị.
Yehova Wamphamvuzonse analumbira pali Iye mwini kuti: Ndidzakutumizira adani ochuluka ngati dzombe, kuti adzakuthire nkhondo ndipo adzafuwula kuonetsa kuti apambana.
15 “O sitere nʼike ya mee ụwa; ọ tọrọ ntọala ụwa mee ka o guzosie ike site nʼamamihe ya, ọ jikwa nghọta ya setịpụ eluigwe niile.
“Yehova analenga dziko lapansi ndi mphamvu zake; Iye anapanga dziko lonse ndi nzeru zake ndipo anayala thambo mwaluso lake.
16 Mgbe o bigbọrọ, mmiri niile nke dị nʼeluigwe na-ebigbọkwa. Ọ na-eme ka igwe ojii site na nsọtụ niile nke ụwa kwụlie. Ọ na-ezipụ amụma mgbe mmiri na-ezo, na-esitekwa nʼụlọ nkwakọba ihe ya na-ewepụta ifufe.
Iye akayankhula, kumamveka mkokomo wamadzi akumwamba. Iyeyo amabweretsa mitambo kuchokera ku malekezero a dziko lapansi. Amabweretsa mphenzi pamodzi ndi mvula ndi kutulutsa mphepo yamkuntho kumalo kumene amasungira.
17 “Onye ọbụla bụ onye na-enweghị uche nke ihe ọmụma kọrọ. Emeela ka ihere mee onye ọkpụ ụzụ ọlaedo ọbụla site nʼarụsị ọ kpụrụ. Nʼihi na oyiyi niile ọ na-akpụ bụ aghụghọ; ha enweghị nkuume ọbụla nʼime ha.
“Anthu onse ndi opusa ndiponso opanda nzeru; mmisiri aliyense wosula golide akuchita manyazi ndi mafano ake. Mafano akewo ndi abodza; alibe moyo mʼkati mwawo.
18 Ha bụ ihe efu, na ihe ịkwa emo, mgbe ikpe ọmụma ha bịakwasịrị ha, ha ga-ala nʼiyi.
Mafanowo ndi achabechabe, zinthu zosekedwa nazo. Pamene anthuwo azidzaweruzidwa mafanowo adzawonongedwa.
19 Ma onye ahụ bụ Oke Jekọb adịghị ka ihe ndị a, nʼihi na Ọ bụ ya na-eke ihe niile, tinyere Izrel bụ ebo nke ihe nketa ya. Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile bụ aha ya.
Koma Yehova amene ndi Cholowa cha Yakobo sali ngati mafanowo. Iyeyu ndi Mlengi wa zinthu zonse, kuphatikizapo mtundu umene anawusankha kuti ukhale anthu ake. Dzina lake ndi Yehova Wamphamvuzonse.
20 “Ị bụ mkpọrọ osisi m ji ebu agha, na ngwa agha m ga-eji gaa nʼihu agha. Gị ka m ga-eji tipịa mba niile dị iche iche, gị ka m ga-eji laa alaeze niile nʼiyi;
“Iwe Babuloni ndi ndodo yanga, chida changa chankhondo. Ndi iwe ndimaphwanya mitundu ya anthu, ndi iwe ndimawononga maufumu,
21 gị ka m ga-eji tipịa ịnyịnya na onye na-agba ya, gị ka m ga-eji tipịa ụgbọ agha na onye na-anya ya;
ndi iwe ndimaphwanya kavalo ndi wokwerapo, ndi iwe ndimaphwanya galeta ndi woyendetsa wake.
22 gị ka m ga-eji tipịa nwoke na nwanyị, gị ka m ga-eji tipịa agadi nwoke na okorobịa, gị ka m ga-eji tipịa okorobịa na nwaagbọghọ,
Ndi iwe ndimaphwanya mwamuna ndi mkazi, ndi iwe ndimaphwanya nkhalamba ndi wachinyamata, ndi iwe ndimaphwanya mnyamata ndi namwali.
23 gị ka m ga-eji tipịa onye ọzụzụ atụrụ na igwe ewu na atụrụ ya, gị ka m ga-eji tipịa onye ọrụ ubi na ehi ya; gị ka m ga-ejikwa tipịa ndị na-achị achị na ndịisi ọchịchị eze.
Ndi iwe ndimaphwanya mʼbusa ndi ziweto, ndi iwe ndimaphwanya mlimi ndi ngʼombe, ndi iwe ndimaphwanya abwanamkubwa ndi atsogoleri a ankhondo.
24 “Nʼihu gị ka m ga-anọ kwụghachi Babilọn na ndị niile bi na Babilọn ihe ọjọọ niile ha mere na Zayọn,” ọ bụ ihe Onyenwe anyị kwubiri.
“Inu mukuona ndidzalanga Babuloni ndi onse amene amakhala mʼdziko la Babuloni chifukwa cha zolakwa zonse anachita ku Ziyoni,” akutero Yehova.
25 “Edoola m onwe m imegide gị, gị ugwu ukwu na-emebisi ihe, gị onye na-ala ụwa niile nʼiyi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m esetipụ aka m megide gị, kwapụ gị site na nkume dị elu. Aga m emekwa gị ka ị bụrụ ugwu ukwu e suru ọkụ.
“Taonani, ndikukuzenga mlandu, iwe phiri lowononga, amene umawononga dziko lonse lapansi,” akutero Yehova. “Ndidzatambalitsa dzanja langa pofuna kukulanga, kukugubuduzira pansi kuchokera pa matanthwe ako, ndi kukusandutsa kukhala phiri lopserera.
26 A gaghị esite nʼime gị weta nkume e ji ewu isi nkuku ụlọ, maọbụ nke e ji ewu ntọala ụlọ ọbụla, nʼihi na ị ga-abụ ebe tọgbọrọ nʼefu ruo mgbe ebighị ebi,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Palibe ngakhale ndi mwala wako umodzi umene anthu adzawutenga kuti awugwiritse ntchito kumangira nyumba, chifukwa iwe udzakhala chipululu mpaka muyaya,” akutero Yehova.
27 “Bulienụ ọkọlọtọ elu nʼala ahụ. Fụọnụ opi ike nʼetiti mba niile. Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ya; kpọkuonụ alaeze ndị a niile imegide ya: Ararat, na Mini, na Ashkenaz. Họpụtanụ ọchịagha ga-edu usuu ndị agha megide ya; ziganụ ịnyịnya ga-adị ukwuu nʼọnụọgụgụ, dịka igurube.
“Kwezani mbendera ya nkhondo mʼdziko! Lizani lipenga pakati pa mitundu ya anthu! Konzekeretsani mitundu ya anthu kuti ikamuthire nkhondo; itanani maufumu awa: Ararati, Mini ndi Asikenazi kuti adzamuthire nkhondo. Ikani mtsogoleri wankhondo kuti amenyane naye; tumizani akavalo ochuluka ngati magulu a dzombe.
28 Kwadoonụ mba niile maka ibu agha megide ha, kwadoonụ ndị eze Midia, na ndị ha na-achị achị, na ndịisi ọchịchị, na mba niile nke ha na-achị.
Konzekeretsani mitundu ya anthu. Amenewa ndiwo mafumu a Amedi, abwanamkubwa awo, atsogoleri a ankhondo, ndiponso ankhondo a mayiko amene amawalamulira, kuti idzathire nkhondo Babuloni.
29 Ala ahụ na-ama jijiji, na-atakwa ikikere eze nke ihe mgbu, nʼihi na nzube Onyenwe anyị zubere megide Babilọn ga-emezu. Ọ ga-eme ka ala Babilọn ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu, ka mmadụ ọbụla gharakwa ibi nʼime ya.
Dziko likunjenjemera ndi kunthunthumira, chifukwa zidzachitikadi zimene Yehova wakonzera Babuloni; kusakaza dziko la Babuloni kuti musapezeke wokhalamo.
30 Ndị bụ dike nʼagha na Babilọn akwụsịla ịlụ ọgụ; ha anọgidela nʼebe ha e wusiri ike. Ike agwụla ha; ha adịla ka ndị inyom. E sunyela ebe obibi ya niile ọkụ, tijiekwa mkpọrọ e ji akpọchi ọnụ ụzọ ama ya niile.
Ankhondo a ku Babuloni aleka kuchita nkhondo; iwo angokhala mʼmalinga awo. Mphamvu zawo zatheratu; ndipo akhala ngati akazi. Malo ake wokhala atenthedwa; mipiringidzo ya zipata zake yathyoka.
31 Otu onye na-agba ọsọ na-agbaso ọgba ọsọ ibe ya, otu onyeozi na-esochikwa onyeozi ọzọ nʼazụ; ha niile na-abịa izi eze Babilọn ozi sị ya na a dọtala obodo ya nʼagha,
Othamanga akungopezanapezana, amithenga akungotsatanatsatana kudzawuza mfumu ya ku Babuloni kuti alande mzinda wake wonse.
32 na ndị iro anọchiela ụzọ e si agafe iyi, na e sunyela ala mmiri mmiri niile ọkụ, na ndị agha niile na-amakwa jijiji.”
Madooko onse alandidwa, malo onse obisalamo alonda atenthedwa ndi moto, ndipo ankhondo onse asokonezeka.”
33 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ada Babilọn dịka ebe ịzọcha ọka, nʼoge a na-azọcha ya. Mgbe a ga-ewe ya dịka e si ewe ihe ubi na-abịa nso.”
Yehova Wamphamvuzonse, Mulungu wa Israeli akuti, “Babuloni wokongola uja wakhala ngati malo opunthirapo tirigu pa nthawi yake yopuntha tirigu; A ku Yerusalemu akuti, Posachedwapa nthawi yake yomukolola ifika.”
34 “Nebukadneza eze Babilọn eripịala anyị, o tinyela anyị nʼọnọdụ mgbagwoju anya. O meela ka anyị dịrị ka ite ihe na-adịghị nʼime ya. O lodara anyị dịka ọ bụ agwọ ọjọọ, jiri ihe ụtọ anyị niile mejuo afọ ya. Emesịa, ọ gbọpụtara anyị.
A ku Yerusalemu akuti, “Nebukadinezara mfumu ya ku Babuloni watiwononga, watiphwanya, ndi kutitaya ngati mbiya yopanda kanthu. Watimeza ngati ngʼona, wakhuta ndi zakudya zathu zokoma, kenaka nʼkutilavula.”
35 Ka ihe ike ahụ niile o mere anyị na ụmụ anyị dịkwasịkwa Babilọn nʼisi.” Ọ bụ ihe ndị bi na Zayọn kwuru. Jerusalem na-ekwukwa sị, “Ka ọbara anyị dịkwa nʼisi ndị bi na Babilọn.”
Anthu a ku Ziyoni anene kuti, “Zankhanza zimene anatichitira ife ziwabwerere Ababuloni.” Anthu okhala mu Yerusalemu anene kuti, “Magazi athu amene anakhetsedwa akhale pa amene akukhala ku Babuloni.”
36 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-ekwu, “Lee, aga m ekwuchitere gị ọnụ gị, bọtakwara gị ọbọ. Aga m emekwa ka osimiri taa, meekwa ka isi iyi mmiri niile taakwa.
Nʼchifukwa chake Yehova akuti, “Taona, ndidzakumenyera nkhondo ndi kukulipsirira; ndidzawumitsa nyanja yake ndipo akasupe ake adzaphwa.
37 Babilọn ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, ọ ga-aghọ ebe obibi nke nkịta ọhịa, bụrụkwa ihe iju anya, na ihe nkọcha, na ebe mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa.
Motero Babuloni adzasanduka mulu wa nyumba zogumuka, malo okhala nkhandwe, malo ochititsa mantha ndi onyozedwa, malo wopanda aliyense wokhalamo.
38 Ndị ya niile na-agbọ ụja dịka ụmụ ọdụm, ha na-emekwa ụzụ dịka ụmụ ọdụm na-aṅụ ara.
Anthu ake onse adzabangula ngati mkango, adzadzuma ngati ana amkango.
39 Ma nʼoge ahụ a kpaliri ha, aga m edo oriri nʼihu ha. Aga m eme ka ha ṅụbiga mmanya oke, si otu a mee ka ha jiri oke ịchị ọchị tie mkpu ọṅụ. Nʼikpeazụ, ha ga-arahụ ụra ebighị ebi, nke ha na-agaghị esite na ya bilie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Ngati achita dyera ndiye ndidzawakonzera madyerero ndi kuwaledzeretsa, kotero kuti adzasangalala, kenaka nʼkugona tulo mpaka muyaya ndipo sadzadzukanso,” akutero Yehova.
40 “Aga m akpụdata ha, dịka ụmụ atụrụ a na-aga igbu egbu, dịka ebule na mkpi.
“Ine ndidzawatenga kuti akaphedwe ngati ana ankhosa onenepa, ngati nkhosa zazimuna ndi mbuzi.
41 “Lee ka a ga-esi dọta Sheshak nʼagha, jichie ihe ụwa niile ji anya isi nʼagha. Lee ka Babilọn ga-esi ghọọ ihe tọgbọrọ nʼefu nʼetiti mba niile!
“Ndithu Babuloni walandidwa, mzinda umene dziko lonse lapansi limanyadira wagwidwa! Taonani, mmene Babuloni wasandukira chinthu chochititsa mantha pakati pa mitundu ya anthu!
42 Osimiri ga-eri Babilọn, mmali elu nke mmiri ya ga-ekpuchi ya.
Nyanja yakwera ndi kumiza Babuloni; mafunde ake okokoma aphimba Babuloni.
43 Obodo ya niile ga-atọgbọrọ nʼefu, ọ ga-abụ ebe kpọrọ nkụ, na ala ọzara, ọ ga-aghọ ala onye ọbụla na-agaghị ebi nʼime ya, nke mmadụ ọbụla na-agaghị esi nʼetiti ya gafee.
Mizinda yake yasanduka bwinja, dziko lowuma ndi lachipululu, dziko losakhalamo wina aliyense, dziko losayendamo munthu aliyense.
44 Aga m ata Bel dị na Babilọn ahụhụ, mee ya ka ọ gbọpụta ihe ndị ahụ o loro. Mba dị iche iche agakwaghị agakwurukwa ya ọzọ. Mgbidi Babilọn ga-adakwa.
Ndidzalanga Beli mulungu wa Ababuloni, ndidzamusanzitsa zimene anameza. Mitundu ya anthu sidzapitanso kwa iye. Malinga a Babuloni agwa.
45 “Sinụ nʼime ya pụta, unu ndị m! Gbapụnụ ọsọ nʼihi ndụ unu. Gbapụnụ ọsọ site nʼiwe dị ọkụ nke Onyenwe anyị.
“Tulukani mʼBabuloni anthu anga! Pulumutsani miyoyo yanu! Thawani mkwiyo woopsa wa Yehova.
46 Unu adala mba, unu atụkwala ụjọ, mgbe unu nụrụ akụkọ dị iche iche nʼala ahụ. Nʼihi na otu ụdị akụkọ ka a ga-anụ nʼafọ a, akụkọ ọzọ dị iche ka a ga-anụkwa nʼafọ nke ọzọ. A ga-anụ akụkọ iwusi ọbara nʼala ahụ, nụkwa akụkọ onye ọchịchị nke na-ebuso onye ọchịchị ọzọ agha.
Musataye mtima kapena kuchita mantha pamene mphekesera zikumveka mʼdziko mwanu. Chaka ndi chaka pamabuka mphekesera za ziwawa mʼdziko lapansi, ndiponso yakuti mfumu yakuti ikuthira nkhondo mfumu ina.
47 Nʼihi na oge ahụ aghaghị ịbịa mgbe m ga-ata arụsị niile dị na Babilọn ahụhụ. A ga-eme ka ihere mee ala ahụ niile. Ndị ya niile e gburu egbu ga-ada, tọgbọrọkwa nʼime ya,
Pakuti taonani, nthawi ikubwera ndithu pamene ndidzalanga mafano a ku Babuloni; dziko lake lonse lidzachita manyazi ndi ophedwa ake onse adzakhala ngundangunda pakati pake.
48 mgbe ahụ, eluigwe na ụwa, na ihe niile dị nʼime ha ga-eti mkpu ọṅụ nʼihi ihe dakwasịrị Babilọn. Ndị ga-ebuso ya agha ga-esitekwa nʼugwu bịa.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Pamenepo kumwamba ndi dziko lapansi ndi zonse zili mʼmenemo zidzayimba mokondwa chifukwa cha kugwa kwa Babuloni. Anthu owononga ochokera kumpoto adzamuthira nkhondo,” akutero Yehova.
49 “Babilọn ga-ada nʼihi ndị Izrel e gburu, dịka ndị niile e gburu nʼụwa si daa site nʼaka ndị Babilọn.
“Babuloni anapha anthu ambiri pa dziko lapansi. Tsono, nawo anthu a ku Babuloni ayenera kuphedwa chifukwa anapha anthu a ku Yerusalemu.
50 Unu ndị siterela nʼihu mma agha gbapụ ọsọ, wezuganụ onwe unu, unu eguzokwala. Chetanụ Onyenwe anyị nʼala ahụ dị anya, na-echetakwa Jerusalem.”
Inu amene munapulumuka ku nkhondo ya Babuloni, chokani pano ndipo musazengereze! Kumbukirani Yehova ngakhale muli ku mayiko akutali, ganizirani za Yerusalemu.”
51 “Ihere emeela anyị, nʼihi na a kparịala anyị. Ihere ekpuchiekwala ihu anyị, nʼihi na ndị mba ọzọ abatala nʼebe nsọ nke ụlọnsọ Onyenwe anyị.”
Inu mukuti, “Tikuchita manyazi, chifukwa tanyozedwa ndipo nkhope zathu zili ndi manyazi, chifukwa anthu achilendo alowa malo opatulika a Nyumba ya Yehova.”
52 “Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-ata arụsị ya niile ahụhụ. Ndị e merụrụ ahụ ga-asụkwa ude nʼala ahụ niile.
Nʼchifukwa chake Yehova akuti, “Masiku akubwera pamene ndidzalanga mafano ake, ndipo mʼdziko lake lonse anthu ovulala adzabuwula.
53 A sịkwarị na Babilọn a arịgoruo nʼeluigwe, ma a sịkwa na o wusie ebe dị elu nke ike ya mee ka o siwanyekwuo ike karịa, aga m ezite ndị mbibi ga-abịa megide ya.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Ngakhale Babuloni atadzikweza mpaka mlengalenga ndi kulimbitsa nsanja zake, ndidzatuma anthu owononga kudzamenyana naye,” akutero Yehova.
54 “Ụzụ ịkwa akwa si na Babilọn na-apụta, ụzụ oke ịla nʼiyi sikwa nʼala ndị Babilọn na-apụta.
“Imvani mfuwu wolira kuchokera ku Babuloni. Imvani phokoso lachiwonongeko chachikulu kuchokera mʼdziko la Babuloni.
55 Onyenwe anyị ga-ala Babilọn nʼiyi. Ọ ga-emekwa ka oke ụzụ ha kwụsị. Mbigbọ nke ndị iro ga-adịkwa ka mbigbọ nke ọtụtụ mmiri, mkpọtụ nke olu ha ga-ada ụda dị ukwuu.
Pakuti Yehova akuwononga Babuloni, ndipo akuthetsa phokoso lake lalikulu. Mfuwu wa adani ukumveka ngati mkokomo wa madzi ambiri. Phokoso lawo likunka likwererakwerera.
56 Onye mbibi ga-ebuso Babilọn agha. A ga-adọta ndị bụ dike ya nʼagha, gbajisiekwa ụta ha niile. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Chineke onye na-akwụghachi; ọ ga-akwụghachikwa nʼuju ya.
Pakuti wowononga wafika kudzamenyana ndi Babuloni, ankhondo ake agwidwa, ndipo mauta awo athyoka. Paja Yehova ndi Mulungu wobwezera chilango; adzabwezera kwathunthu.
57 Aga m eme ka ndịisi ọchịchị ya niile, na ndị maara ihe ha ṅụbiga mmanya oke; aga m emekwa ndị ha na-achị achị, na ndịisi ha, na ndị ha bụ dike nʼagha otu ihe ahụ. Ha ga-arahụ ụra ruo mgbe ebighị ebi. Ha agaghị esitekwa nʼụra ahụ bilie ọzọ.” Ọ bụ ihe Eze ahụ kwubiri, bụ onye ahụ aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Ndidzaledzeretsa akuluakulu ake pamodzi ndi anzeru ake, abwanamkubwa ake, atsogoleri a ankhondo pamodzinso ndi ankhondo; adzagona kwamuyaya osadzukanso,” akutero Mfumu, amene dzina lake ndi Yehova Wamphamvuzonse.
58 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “A ga-akwada mgbidi Babilọn nke sara mbara, mee ka ọ daruo ala, a ga-eji ọkụ sunye nʼọnụ ụzọ ama ya niile dị elu. Ndị dị iche iche na-adọgbu onwe ha nʼọrụ nʼefu. Ndọgbu nʼọrụ nke mba niile dị iche iche ga-abụ nkụ a na-akwanye nʼọkụ.”
Yehova Wamphamvuzonse akuti, “Malinga aakulu a Babuloni adzasalazidwa ndipo zipata zake zazitali zidzatenthedwa; mitundu ya anthu inangogwira ntchito pachabe. Anthu anatopa ndi kumanga zimene tsopano zikupsa ndi moto.”
59 Ndị a bụ ozi Jeremaya, bụ onye amụma ziri onyeisi ozi aha ya bụ Seraya nwa Neraya, nwa Mahseia, mgbe o so Zedekaya eze Juda gaa Babilọn. E ziri ya ozi a nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Zedekaya.
Zedekiya mfumu ya Yuda inali ndi phungu wake wamkulu amene dzina lake linali Seraya mwana wa Neriya chidzukulu cha Maseya. Mʼchaka chachinayi cha ulamuliro wake, Zedekiya anapita ndi Seraya ku Babuloni. Tsono mneneri Yeremiya anamupatsirako uthenga Serayayo.
60 Jeremaya depụtara nʼakwụkwọ ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ niile ga-abịakwasị Babilọn, ya bụ ihe niile e dere banyere Babilọn.
Yeremiya anali atalemba mʼbuku za masautso onse amene adzafike pa Babuloni ndi zina zonse zokhudza Babuloni.
61 Ọ sịrị Seraya, “Mgbe i ruru Babilọn, lezie anya hụ na ị gụpụtara okwu ndị a niile ebe ndị mmadụ ga-anụ ya.
Yeremiya anawuza Seraya kuti, “Ukakafika ku Babuloni, ukaonetsetse kuti wawawerengera anthu onse mawu onsewa.
62 Emesịa, ị ga-ekwukwa sị, ‘Onyenwe anyị, gị onwe gị ekwuola na i ga-ebibi ebe a, ma mmadụ maọbụ anụmanụ agaghị ebikwa nʼime ya. I kwuokwala na ọ ga-aghọ mkpọmkpọ ebe ruo mgbe ebighị ebi.’
Ndipo ukanene kuti, ‘Inu Yehova, mwanena kuti mudzawononga malo ano, kotero kuti simudzatsala munthu kapena nyama mʼdziko muno; lidzakhala chipululu mpaka muyaya.’
63 Mgbe ị gụsịrị ihe dị nʼakwụkwọ a, kegide ya nkume, tụnye ya nʼetiti iyi ukwu Yufretis.
Ukakatha kuwerenga bukuli, ukalimangirire ku mwala ndipo ukaliponye pakati pa mtsinje wa Yufurate.
64 Ị ga-asịkwa, ‘Otu a ka Babilọn ga-esi mikpuo. Ọ gaghị ebilikwa ọzọ, nʼihi ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ya. Ndị ya ga-adakwa.’” Ebe a ka okwu Jeremaya niile gwụrụ.
Ndipo ukanene kuti, ‘Umu ndi mmene adzamirire Babuloni ndipo sadzadzukanso chifukwa cha masautso amene adzamugwere.’” Mawu a Yeremiya athera pamenepa.

< Jeremaya 51 >