< Jeremaya 5 >
1 “Jegharịa nʼokporoụzọ niile dị na Jerusalem, legharịa anya, ma mara, chọkwanụ gburugburu nʼama ya niile. Ma unu ọ ga-achọpụta otu onye, bụ onye na-eme ihe ziri ezi, na onye na-achọ eziokwu. M ga-agbagharakwa obodo a
請你們巡行耶路撒冷的街道,觀察注意,在她的廣場上搜尋:若他們能找到一人,一個履正義,追求信實的人,我就寬恕這城。
2 Ọ bụ ezie, na ha na-asị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ ma ha ka na-aṅụ iyi nʼokwu ụgha.”
雖然他們起誓說:「上主永在! 」其實他們起的誓仍是虛誓。
3 Onyenwe anyị, anya gị abụọ ọ bụghị eziokwu ka ọ na-achọ? Ị tiela ha ihe, ma o metụghị ha nʼahụ. I gwepịara ha, ma ha ekweghị a nabata ịdọ aka na ntị. Ha emeela ka ihu ha sie ike karịa nkume, ha ajụla ịchịgharị.
上主,你的眼睛難道不顧信實﹖你打擊了他們,他們卻毫不覺痛;你使他們挫敗,他們仍拒絕受教,使自己的面孔比火石還要頑硬,不願悔改。
4 Mgbe ahụ, a sịrị, “Ndị a bụ naanị ndị ogbenye na ndị na-enweghị uche, ha amaghị ihe ọbụla gbasara ụzọ Onyenwe anyị, na iwu nke Chineke ha.
我想:「不錯,他們原是無知的平民,不認識上主的道路和衪他們天主的法律。
5 Aga m ejekwuru ndị ndu, gwa ha okwu sị, nʼezie ha maara ihe gbasara ụzọ Onyenwe anyị, marakwa iwu niile nke Chineke ha.” Ma ha onwe ha nʼotu obi agbajiela ịyagba ahụ, tijiekwa agbụ niile.
我要去問有權勢的人,與他們談論,因為他們知道火道路和他們天主的法律。」哎! 連他們也都折斷了軛,掙斷了繩索。
6 Ya mere, aga m eme ka ọdụm si nʼoke ọhịa bịa lụso ha ọgụ; nkịta ọhịa bi nʼọzara ga-ebibi ha. Otu a kwa, agụ ga-abịa makpuru nso nso obodo ha ịdọkasị onye ọbụla si nʼime obodo ahụ na-apụta. Ihe ndị a ga-emezu nʼihi na nnupu isi ha adịla ukwuu, na nʼihi na ndaghachi azụ ha site na iso ụzọ m adịla ukwuu.
為此,獅子由叢林出來襲擊他們,曠野的豺狼出來傷害他們,豹子潛伏在他們的城旁,凡出來的人都被撕裂,因為他們罪上加罪,失節有增無已。
7 “Nʼihi gịnị ka m ga-eji gbaghara unu? Lee na ụmụ unu ahapụla m, na-agbaso, ma na-eji chi ndị na-abụghị chi na-aṅụ iyi. Ọ bụ m gbooro ha mkpa ha, ma ha nọgidere na-akwa iko. Ha jikwa ụlọ ndị akwụna mere ebe ha na-ezukọ.
如此,我怎能寬恕你﹖你的子孫離棄了我,奉「非神」發誓。我使他們飽食,他們卻去行淫,群集在妓院裏;
8 Ha rijuru afọ, gbaa abụba dị ka oke ịnyịnya. Onye ọbụla nʼime ha kwa na-esigharị imi na-akpọku nwunye na-abụghị nke ya.
他們像荒淫雄壯的牡馬,各向自己近人的妻室嘶鳴。
9 Ma Onyenwe anyị na-ajụ ajụjụ sị, m ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile? M ga-ahapụ ịbọtara mkpụrụobi m ọbọ megide mba dị otu a?”
這些事,我怎能不懲罰﹖──上主的斷語──像這些火民族,我怎能不親自報復﹖
10 “Baanụ nʼime ubi vaịnị ha a gbara ogige kposaa ihe dị nʼime ya, ma unu emebila ya kpamkpam. Gbajisienụ alaka ya nʼihi na o nweghị oge ndị a ji bụrụ ndị nke Onyenwe anyị.
請你們登上她的牆上頭,加以毀壞,但不要完全毀滅,該除去她的枝條,因為它們不屬於上主。
11 Onyenwe anyị ekwuola ya sị, Lee, ụlọ Izrel na ụlọ Juda egosila na ha abụghị ndị e kwesiri ịtụkwasị obi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
以色列和猶大家,實在對我不忠,達到極點──
12 Ha ekwuola okwu ụgha megide Onyenwe anyị. E, ha ekwuola sị, “O nweghị ihe Ọ ga-eme! Ihe ọjọọ ọbụla agaghị adakwasị anyị; mbibi nke ụnwụ na mma agha na-eweta agaghị erute anyị nso.
上主的斷語。他們否認上主說:「衪不存在! 災禍不會臨到我們身上,我們也決不會見到戰爭和飢荒;
13 Ndị amụma ndị a niile dịka ikuku, nke okwu nwere isi na-adịghị nʼime ha. Ya mere, ka ihe ahụ niile ha buru nʼamụma bịakwasị ha.”
先知們不過是一陣風,他們並沒有上主的話;他們這樣只有自作自受。」
14 Nʼihi ihe ndị a niile, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, “Nʼihi na okwu ndị a esitela nʼọnụ ndị a pụta, aga m eme ka okwu m, nke si gị nʼọnụ na-apụta, ghọọ ọkụ. Aga m emekwa ka ndị a ghọọ nkụ ọkụ ahụ ga-erepịa.
為此,上主萬軍火天主這樣說:「因為他們說了這話,我必使我的話在你的口中成為火,使這人民成為木柴,將他們吞滅。
15 Unu bụ ndị Izrel,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “Aga m eme ka otu mba si nʼebe dị anya bịa megide unu. Ọ bụ mba na-adị site na mgbe ochie, mba dị ike, nke unu na-adịghị anụ asụsụ ha, ndị unu na-adịghị aghọta okwu ha.
以色列家! 看,我從遠方給你們引來一個民族──上主的斷語──一個所向無敵的民族,一個支老的民族,一個你們不慬她的語言,也聽不出她說什麼的民族
16 Akpa àkụ ha dịka ili ghere oghe; ha niile bụkwa ndị dike nʼagha.
他們的箭有如張口墳墓;他們都是善戰的勇士。
17 Ha ga-eripịa ihe niile unu wetara nʼubi, ya na nri niile unu nwere. Ha ga-ebibi ụmụ unu ndị nwoke na ndị nwanyị. Ha ga-ebibi igwe ewu na atụrụ unu, na igwe ehi unu. Ha ga-ebibikwa osisi vaịnị na osisi fiig unu. Ọ bụ mma agha ha ka ha ga-eji bibie obodo unu niile e wusiri ike, bụ obodo ndị ahụ niile unu na-atụkwasị uche.
這民族必吃掉你的收穫和食糧,必吃掉你的兒子和女兒,必吃掉你的羊群和牛群,必吃掉你的葡萄和無花果,必以武力蹂躝你依恃的堅城。
18 “Ma ọ bụladị na nʼụbọchị ndị ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Agaghị m ebibicha unu kpamkpam.
即在那些時日裏──上主的斷語──我也不對你們加以徹底的毀滅。」
19 Ọ ga-erukwa, mgbe ndị mmadụ ga-ajụ ajụjụ sị, ‘Gịnị mere Onyenwe anyị Chineke anyị ji mee anyị ihe dị otu a?’ Unu ga-agwa ha sị, ‘Dịka unu si gbakụta ya azụ malite ife chi ndị mba ọzọ nʼala nke aka unu, otu a ka unu ga-esi kpọọ isiala nye ndị mba ọzọ nʼala na-abụghị nke unu.’
假使有人問:「為什麼上主我們的天主對我們做了這一切的事﹖」你當對他們說:「你們怎樣離棄了我,在你們國內事奉了外邦的神祗,你們也該怎樣在不屬於你們的境內事奉外邦人。」
20 “Kwupụta ihe a ka ụlọ Jekọb nụrụ ya, kwusaa ya na Juda.
你們你們將這事通知雅各伯家,轉告猶大說:
21 Nụrụnụ ihe ndị a, unu ndị nzuzu na ndị na-enweghị uche, unu ndị nwere anya nke na-adịghị ahụ ụzọ, na unu ndị nwere ntị nke na-adịghị anụ ihe.
「你們愚昧無知,有目不見,有耳不聞的人民,請聽聽這話:
22 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ sị, o kwesighị ka unu tụọ m egwu?” “O kwesighị ka unu maa jijiji nʼihu m? Emeela m ka uzuzu bụrụ oke osimiri nwere. Ọ bụkwa ụkpụrụ ebighị ebi nke ọ na-enweghị ike ịgafe. Ebili mmiri nwere ike magharịa, ma nke a apụghị ime ka osimiri si nʼọnọdụ ya wezuga onwe ya. Osimiri nwere ike bigbọọ, ma ọ pụghị ịgafe oke ahụ.
你們不敬畏我嗎﹖──上主的斷語──你們在我面前不戰憟嗎﹖是我堆集了沙石作海的界限,作為它永不能越過的界限浪雖然洶湧,仍無能為力;雖怒號澎湃,仍不能越過。」
23 Ma ndị a nwere obi nke na-enupu isi, na obi nke na-adịghị ekwe ekwe. Ha atụgharịala wezuga onwe ha.
但這內心頑固的心民,竟背叛而離去,
24 Ha adịghị asị onwe ha, ‘Ka anyị tụọ egwu Onyenwe anyị Chineke anyị, onye na-enye anyị mmiri ozuzo nʼoge ya, ọ bụkwa ya na-eme ka anyị na-ewebata ihe ubi anyị nʼoge ya.’
從不反心自省:「我們應該敬畏上主,我們的天主,因為衪按時降下雨露、秋霜和春雨;又給我們保持固定的收穫時節。」
25 Ajọ omume unu emeela ka ihe ndị a hapụ irute unu aka. Mmehie unu anapụla unu ihe ọma gaara abụ nke unu.
是你們的過犯混亂了這些時令,是罪惡阻止了你們享這幸福。
26 “E nwere ndị ajọ mmadụ nʼetiti ndị m, ndị na-edo onwe ha dịka ndị mmadụ na-esiri nnụnụ ọnya, dịka ndị na-esi ọnya ka ha nwude mmadụ.
因為在我的人民中發現惡人;他們像隱伏的捕鳥者在窺探,布下羅網捕捉人。
27 Dịka nkata a kpara nke nnụnụ jupụtara nʼime ya, ụlọ ndị dị otu a jupụtara nʼaghụghọ. Nʼihi nke a, ha ghọrọ ndị ọgaranya na ndị dị ike,
猶如籠中滿了飛鳥,他們家中也充滿了欺詐,因此成了有勢力,有錢財的人。
28 ha amaala abụba, anụ ahụ ha na-akwọkwa mụrụmụrụ. Ajọ ọrụ ha enweghị nsọtụ; ha adịghị achọkwa ikpe ziri ezi. Ha adịghị ekwuchite ọnụ onye na-enweghị nna; ha adịghị ekwuchitekwa ọnụ ndị ogbenye ime ka ha nweta ihe ruuru ha.
他們肥胖紅潤,作奸犯科,不為孤兒辯護;只求自己享受,也不關懷窮人的權利。
29 M ga-ahapụ ịta ha ahụhụ nʼihi ihe ndị a niile?” ka Onyenwe anyị kwupụtara, na-ajụ. “M ga-ahapụ ịbọrọ onwe m ọbọ megide mba dị otu a?
像這樣的事,我怎能不懲罰﹖──上主的斷語──像這樣的民族,我怎能不親自報復﹖
30 “Ihe ọjọọ nke jọbigara njọ oke emeela nʼala a.
在國內發生了一件恐怖而可憎的事:
31 Lee, ndị amụma na-ebu naanị amụma ụgha, ndị nchụaja na-achịkwa ndị m site nʼọchịchị nke nʼaka ike, ma lee, ndị m hụrụ ndụ dị otu a nʼanya. Gịnịkwa ka unu ga-eme nʼoge ikpeazụ.”
先知們說假預言,司祭們爭權奪利,我的人民反以此為樂;到了最後,你們究竟還要作什麼﹖