< Jeremaya 48 >
1 Nke a dịrị Moab: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ahụhụ dịrị Nebo! Nʼihi na a ga-emebi ya. A ga-emekwa ka ihere mee Kiriatem, e, a ga-adọta ya nʼagha. A ga-etipịa Misgab, mee ka ihere mee ya.
Mayelana leMowabi: UThixo uSomandla, uNkulunkulu ka-Israyeli uthi: “Maye kuyo iNebho ngoba izachithwa. IKhiriyathayimi izayangeka njalo ithunjwe; inqaba izayangeka ibhidlizwe.
2 Ọ dịkwaghị ndị ga-eto Moab ọzọ, kama a ga-anọ na Heshbọn pịa ọpịpịa ọdịda ya. Ha ga-asị, ‘Bịanụ ka anyị bibie mba a, ka ọ ghara ịdịkwa.’ Ọ bụladị gị bụ Madmen, ka a ga-eme ka i dere duu. A ga-ejikwa mma agha chụọ gị ọsọ.
IMowabi kayiyikudunyiswa futhi; eHeshibhoni abantu bazaceba ukumbhidliza: besithi, ‘Wozani sitshabalalise isizwe lesiyana.’ Lawe, wena Madimeni uzathuliswa; inkemba izaxotshana lawe.
3 Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim, ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi.
Zwanini ukukhala okuvela eHoronayimi; ukukhala komonakalo omkhulu lencithakalo.
4 A ga-etikpọ Moab, ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa.
IMowabi izachitheka; abancinyane bayo bazakhala.
5 Ha ga-eji oke ịkwa akwa na-agbago ụzọ Luhit; a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim. A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha.
Baqansa ngendlela eya eLuhithi, bahamba belila kabuhlungu, emgwaqweni owehlela eHoronayimi, kuzwakala ukukhala okulosizi ngenxa yokuchitheka.
6 Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ! Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara.
Balekani! Gijimani lizivikele ekufeni; wobani njengesihlahla enkangala.
7 Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu, a ga-adọtakwa unu nʼagha. Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ, ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya.
Njengoba lithembe izenzo zenu lenotho yenu, lani futhi lizathunjwa, loKhemoshi uzakuya ekuthunjweni, kanye labaphristi bakhe lezikhulu zakhe.
8 Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile. O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya. A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi, bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị, nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
Umchithi uzafika emadolobheni wonke, njalo akukho dolobho elizaphepha. Isigodi sizatshabalaliswa, lamagceke azaqothulwa ngoba uThixo usekhulumile.
9 Wụkwasị ala Moab nnu, nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya.
Fakani itswayi kuyo iMowabi ngoba izachitheka; amadolobho ayo azakuba ngamanxiwa angayikuba lamuntu ozahlala kuwo.
10 “Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị. Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị.
Yeka isithuko kulowo oyekethisayo ekwenzeni umsebenzi kaThixo! Yeka isithuko kulowo ogodla inkemba yakhe ekuchitheni igazi!
11 “Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị.
IMowabi ibiphumule kusukela ebutsheni bayo njengewayini elisele phezu kwezinsipho zalo, elingathelwanga kwenye imbiza lisuswa kwenye kayithunjwanga. Ngakho inambitheka njengakuqala, iphunga layo kaliguqukanga.
12 Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite, ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.
Kodwa insuku ziyeza, lapho ngizathuma abantu abathulula okusembizeni, njalo bazayithululela phandle; bazachitha okusezimbizeni zayo bazimahlaze imbiza zayo.
13 Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab, dịka ihere si mee Izrel mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha.
Lapho-ke iMowabi izayangeka ngoKhemoshi njengokuyangeka kwendlu ka-Israyeli lapho babethembe iBhetheli.
14 “Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ; anyị bụkwa dimkpa nʼagha’?
Lingatsho kanjani na ukuthi, ‘Singamabutho, amadoda alesibindi empini na’?
15 A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha. Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu ahụ.” Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
IMowabi izachithwa, amadolobho ayo ahlaselwe; amajaha ayo aqinileyo azacakazelwa phansi abulawe,” kutsho iNkosi, obizo layo nguThixo uSomandla.
16 “Ọdịda Moab dị nso; oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ.
“Ukuwa kweMowabi sekuseduze; umonakalo wayo uzafika ngokuphangisa.
17 Kasịenụ ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu, unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu. Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike, lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’
Ikhaleleni lonke lina elakhelene layo, bonke abalwaziyo udumo lwayo, lithi, ‘Yeka ukwephuka kwentonga yobukhosi elamandla, yeka ukwephuka kodondolo oluhle kakhulu!’
18 “Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata, bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ, unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn. Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab ga-abịa ibu agha megide unu, ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi.
Yehlani ebukhosini benu lihlale emhlabathini owomileyo, lina elihlala eNdodakazini yaseDibhoni. Ngoba lowo ochitha iMowabi uzakuzalihlasela adilize amadolobho enu avikelweyo.
19 Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ ihe na-eme, unu ndị bi nʼime Aroea. Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ sị ha, ‘Gịnị mere?’
Manini emgwaqweni lilinde, lina elihlala e-Aroweri. Buzani indoda ebalekayo lowesifazane obalekayo; babuzeni lithi, ‘Kwenzakaleni na?’
20 E meela ka ihere mee Moab, nʼihi na a tụpịala ya. Kwasienụ akwa ike, tiekwanụ mkpu akwa. Kwupụta ya nʼAnọn na e bibiela Moab.
IMowabi iyangekile, ngoba ichithekile. Lilani likhale! Bikani ngase-Arinoni ukuthi iMowabi itshabalalisiwe.
21 Oge a ga-ekpe ndị bi nʼala dị larịị ikpe abịala, bụ ndị bi na Họlọn, Jahaz na Mefaat,
Ukwehlulela sekufikile emagcekeni eHoloni, leJahazi laseMefahathi,
22 Dibọn, Nebo na Bet-Diblataim,
eDibhoni, leNebho laseBhethi-Dibhilathayimi,
23 Kiriatem, Bet-Gamul na Bet-Meon,
eKhiriyathayimi, leBhethi-Gamuli laseBhethi Meyoni,
24 Keriọt na Bozra, na obodo niile dị nʼala Moab, ndị dị nso, na ndị nke dị anya.
eKheriyothi kanye laseBhozira kuwo wonke amadolobho aseMowabi, aseduze lakhatshana.
25 E bipụla mpi Moab, a gbajiekwala ogwe aka ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Uphondo lweMowabi luqunyiwe, ingalo yalo yephuliwe,” kutsho uThixo.
26 “Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, nʼihi na o nupuru isi megide Onyenwe anyị. Moab ga-atụrụ onwe ya nʼihe ọ gbọrọ. Ọ ga-aghọkwa ihe ọchị.
“Idakiseni ngoba idelele uThixo. IMowabi kayizibhixe ngamahlanzo ayo; kayibe yinto yokuhlekwa.
27 Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị? Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya, mere i ji na-efufere ya isi mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya?
U-Israyeli wayengasinto yokuhlekisa kuwe na? Watholakala ephakathi kwamasela na, ukuba unikine ikhanda lakho ngokweyisa ngasosonke isikhathi lapho ukhuluma ngaye?
28 Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume, unu ndị bi nʼala Moab. Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume.
Tshiyani amadolobho enu lihlale emadwaleni, lina elihlala eMowabi. Wobani njengejuba elakhela isidleke salo emlonyeni wobhalu.
29 “Anyị anụla ihe banyere mpako Moab. Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu, nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya, na oke nganga nke obi ya.
Sizwile ngokuzigqaja kweMowabi, ukuziqakisa kwayo lokuzazisa kwayo! Ukuzigqaja lokuzikhukhumeza kwayo, kanye lokuziphakamisa kwenhliziyo yayo.
30 Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla. Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Ngiyakwazi ukudelela kwayo, kodwa kuyize, lokuzincoma kwayo akusizi lutho,” kutsho uThixo
31 Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab, aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile. Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset.
“Ngakho-ke ngiyalila ngeMowabi, ngikhalela iMowabi yonke, ngililela abantu baseKhiri-Haresethi.
32 Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị, gị osisi vaịnị dị na Sibma. Alaka gị gbasara ruo nʼakụkụ osimiri, e, ha gbasara ruo nʼosimiri Jeza. Ma onye mbibi abịakwasịla mkpụrụ gị niile chara acha, e, ọ bịakwasịla mkpụrụ vaịnị gị niile.
Ngiyalikhalela njengokulila kweJazeri, lina zivini zaseSibhima. Ingatsha zenu zinaba zifike olwandle, zafika olwandle lwaseJazeri. Umchithi usehlele phezu kwezithelo zakho ezivuthiweyo laphezu kwamavini.
33 Ọṅụ na obi ụtọ ka e wepụrụ site nʼubi vaịnị niile, na nʼala ubi niile nke Moab. E meela ka mmanya vaịnị kwụsị ịgbapụtakwa site nʼebe ịzọcha mmanya. Ọ dịkwaghị onye na-eji mkpu ọṅụ na-azọcha ha, Ọ bụ ezie na a na-anụ olu iti mkpu, ma ọ bụghị olu iti mkpu ọṅụ.
Ukuthokoza lokuthaba akusekho ezivinini lasemasimini eMowabi. Ukugeleza kwewayini ezikhamelweni sengikumisile; kakho ozalikhama eklabalala ngentokozo. Lanxa kulokuklabalala akusikuklabalala kwentokozo.
34 “A na-anụ ụda iti mkpu akwa ha site nʼobodo Heshbọn ruo Eleale, na Jehaz. A na-anụkwa ya site na Zoa ruo, ọ bụladị obodo ndị dị anya, dịka Horonaim, na Eglat Shelishiya. Nʼihi na mmiri niile nke Nimrim ataala.
Umsindo wokukhala kwabo uyaphakama uvelela eHeshibhoni usiya e-Eliyale laseJahazi, uvela eZowari usiyafika eHoronayimi le-Egilathi Shelishiya, ngoba lamanzi aseNimirimi asecitshile.
35 Aga m eme ka ndị ahụ niile na-achụ aja nʼebe niile dị elu, na ndị ahụ niile na-achụrụ chi ha dị iche iche aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, hapụ ịdịkwa nʼala Moab,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
EMowabi ngizabaqeda labo abanikela iminikelo ezindaweni eziphakemeyo batshisele labonkulunkulu babo impepha,” kutsho uThixo.
36 “Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja. Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset. Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi.
“Ngakho inhliziyo yami ikhalela iMowabi njengemfegwana; iyakhala njengemfegwana ikhalela abantu beKhiri-Haresethi. Inotho ababeyizuzile kayisekho.
37 A kpụchapụla agịrị isi niile, kpachakwa afụọnụ ha niile. E bipụkwala aka ha niile. Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile.
Amakhanda wonke aphuciwe lezindevu zonke zigeliwe; izandla zonke zisikiwe lezinkalo zonke zigqokiswe amasaka.
38 Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Phezu kwezimpahla zonke zezindlu zaseMowabi lasemagcekeni kazulu, akulalutho ngaphandle kokukhala, ngoba iMowabi ngiyibulele njengembiza engafunwa muntu,” kutsho uThixo.
39 “Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike! Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya! Moab aghọọla ihe ọchị, ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.”
“Yeka ukuphahlazwa kwayo! Yeka ukulila kwabo! Yeka ukufulathela kweMowabi ilehlazo! IMowabi isibe yinto yokuhlekwa; into yokwesatshwa yibo bonke abakhelane layo.”
40 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.
UThixo uthi: “Khangela! Ukhozi lwehlela phansi ngesiqubu, lwelulele impiko zalo phezu kweMowabi.
41 A ga-adọta Keriọt nʼagha, meriekwa ebe ya niile e wusiri ike. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
IKheriyothi izathunjwa, lezinqaba zithunjwe. Ngalolosuku inhliziyo zamabutho aseMowabi zizakuba njengenhliziyo yowesifazane ohelelwayo.
42 A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa, nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya.
IMowabi izachithwa ingabe isaba yisizwe ngoba yadelela uThixo.
43 Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu, unu ndị Moab,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Ukwesaba lomgodi kanye lomjibila kulilindele lina bantu baseMowabi,” kutsho uThixo.
44 “Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu ga-adaba nʼolulu. Onye ọbụla ga-esikwa nʼolulu rịpụta ka igbudu ga-ejide. Nʼihi na aga m eme ka afọ ahụ a kara aka maka ịta Moab ahụhụ bịakwasị ya,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
“Loba ngubani obalekela ukwesaba uzawela emgodini, loba ngubani ophuma emgodini uzabanjwa ngumjibila; ngoba ngizakwehlisela phezu kweMowabi umnyaka wokujeziswa kwayo,” kutsho uThixo.
45 “Nʼokpuru ndo Heshbọn ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka. Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga; ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ, na-erepịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ahụ ji oke ụzụ na-anya isi.
“Emthunzini waseHeshibhoni ababalekayo bayema kungelasizo, ngoba umlilo usuphumile eHeshibhoni, ilangabi elivela phakathi kwakoSihoni; litshisa amabunzi eMowabi inkakhayi zamaqhalaqhala alomsindo.
46 Ahụhụ dịrị gị, gị Moab! Ebibiela ndị Kemosh niile. A dọtakwala ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom nʼagha, buru ha gaa mba ọzọ.
Maye kuwe! wena Mowabi! Abantu baseKhemoshi babhujisiwe; amadodana athunjiwe lamadodakazi akho athunjiwe.
47 “Ma emesịa, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, aga m eme ka ndị Moab a dọtara nʼagha lọghachi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Nke a bụ ọgwụgwụ ikpe ọmụma dịrị Moab.
Kodwa inhlanhla ye-Mowabi ngizayibuyisela ensukwini ezizayo,” kutsho uThixo. Ukwahlulelwa kweMowabi kuphelela lapha.