< Jeremaya 48 >

1 Nke a dịrị Moab: Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, “Ahụhụ dịrị Nebo! Nʼihi na a ga-emebi ya. A ga-emekwa ka ihere mee Kiriatem, e, a ga-adọta ya nʼagha. A ga-etipịa Misgab, mee ka ihere mee ya.
Concerning Moab. Thus saith Jehovah of hosts, the God of Israel: Woe to Nebo, for it is laid waste! Kiriathaim is confounded, is taken. Misgab is confounded and dismayed.
2 Ọ dịkwaghị ndị ga-eto Moab ọzọ, kama a ga-anọ na Heshbọn pịa ọpịpịa ọdịda ya. Ha ga-asị, ‘Bịanụ ka anyị bibie mba a, ka ọ ghara ịdịkwa.’ Ọ bụladị gị bụ Madmen, ka a ga-eme ka i dere duu. A ga-ejikwa mma agha chụọ gị ọsọ.
Moab shall no more glory in Heshbon; They have devised evil against her; “Come, [[say they, ]] and let us cut her off from being a nation!” Thou also shalt be cut down, O Madmena, The sword shall pursue thee!
3 Gee ntị nụrụ akwa na-ada na Horonaim, ọ bụ mkpu akwa oke mbibi na ịla nʼiyi.
A cry is heard from Horonaim, Desolation and great destruction.
4 A ga-etikpọ Moab, ụmụntakịrị ya ga-etikwa mkpu akwa.
Moab is destroyed; Her little ones raise a cry.
5 Ha ga-eji oke ịkwa akwa na-agbago ụzọ Luhit; a ga-anụkwa mkpu akwa nke ndị e bibiri ihe ha nʼụzọ na-agbada Horonaim. A ga-anụ akwa mwute nʼihi mbibi nke bịakwasịrị ha.
At the ascent of Luhith Weeping goeth up after weeping; At the descent of Horonaim is heard a bitter cry of despair.
6 Gbalaganụ! Gbapụnụ ọsọ ndụ! Dịkwanụ ka osisi nta nke dị nʼọzara.
Flee ye! save your lives! Be ye like one that has been stripped in the wilderness!
7 Ebe ọ bụ na unu na-atụkwasị obi nʼaka ọrụ unu, na nʼakụnụba unu, a ga-adọtakwa unu nʼagha. Ndị Kemosh ka a ga-eburu gaa mba ọzọ, ha na ndị nchụaja na ndịisi ọchịchị ya.
For, because thou hast trusted in thy substance and thy treasures, Thou also shalt be taken And Chemosh shall go into captivity, His priests and his princes together.
8 Onye mbibi ahụ ga-abịa megide obodo niile. O nwekwaghị obodo nke pụrụ ịgbanarị mbibi ya. A ga-ala ndagwurugwu niile nʼiyi, bibiekwa ebe dị elu nke dị larịị, nʼihi na ọ bụ okwu si nʼọnụ Onyenwe anyị pụta.
The spoiler shall come upon every city, And no city shall escape. The valley shall perish, And the plain shall be destroyed, As Jehovah hath spoken.
9 Wụkwasị ala Moab nnu, nʼihi na a ga-eme ka ọ ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Obodo niile dị nʼime ya ga-aghọ mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ ọbụla na-agaghị ebikwa nʼime ya.
Give wings to Moab, That she may flee away; For her cities shall be a desolation, With none to dwell therein.
10 “Ọbụbụ ọnụ dịrị onye ahụ ji aghụghọ na-arụ ọrụ Onyenwe anyị. Ahụhụ dịrị onye na-ewezuga mma agha nʼebe iwusi ọbara dị.
Cursed be he that doeth the work of Jehovah deceitfully, And cursed be he that keepeth back his sword from blood!
11 “Onye na-anọ juu ka Moab bụ site na mgbe ọ bụ nwantakịrị, ọ dịka mmanya doro edo, nke a na-adịghị esi nʼotu udu wụgharịa ya nʼime udu ọzọ, o nwebeghị oge ọbụla e ji mee ka ọ ga biri nʼala ọzọ. Ọ bụ ya mere ụtọ ya adịghị agbanwe agbanwe, isisi ya agbanwekwaghị.
Moab hath been at ease from his youth, And he hath settled on his lees, And hath not been drawn off from vessel to vessel, Neither hath he gone into captivity; Therefore his taste hath remained in him, And his flavor hath not changed.
12 Ma ụbọchị ndị ahụ na-abịa,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eziga ndị ikom ọrụ ha bụ ịwụpụ ihe site nʼite, ha ga-awụpụkwa ya. Ha ga-agbapụ ihe niile dị nʼite ya niile, tụwakwaa ite ya niile.
Therefore, behold, the days come, saith Jehovah, That I will send to him tilters, who shall tilt him up, And shall empty his vessels, and break his pitchers in pieces.
13 Mgbe ahụ, ihere Kemosh ga-eme Moab, dịka ihere si mee Izrel mgbe ha tụkwasịrị Betel obi ha.
And Moab shall be ashamed of Chemosh, As the house of Israel was ashamed of Bethel, their confidence.
14 “Unu si aṅaa ekwu sị, ‘Ndị dị ike nʼagha ka anyị bụ; anyị bụkwa dimkpa nʼagha’?
How will ye say, “We are mighty, And strong men for war”?
15 A ga-ebibi ala Moab, busokwa obodo ya niile agha. Ụmụ okorobịa ya niile ndị ahọrọ ahọ ga-ada nʼogbugbu ahụ.” Otu a ka Eze ahụ kwubiri, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Moab is destroyed; His cities have gone up in smoke, And his chosen young men have gone down to slaughter, Saith the King whose name is Jehovah of hosts.
16 “Ọdịda Moab dị nso; oke nhụju anya ya ga-abịakwa ọsịịsọ.
The destruction of Moab is near at hand; His destruction hasteth fast.
17 Kasịenụ ya obi, unu ndị niile gbara ya gburugburu, unu ndị niile maara na ọ bụ mba dị ukwuu. Kwupụtanụ sị, ‘Esi aṅa gbajie mkpanaka eze a, nke dị ike, lee ka e si gbajiekwa mkpanaka a nke dị ebube!’
All ye that are about him, bemoan him! And all ye that know him, say, “How is the strong sceptre broken, The splendid staff!”
18 “Sitenụ nʼebe nsọpụrụ unu dị elu rịdata, bịa nọdụnụ nʼala kpọrọ nkụ, unu ndị bi nʼobodo bụ Ada Dibọn. Nʼihi na onye ahụ bibiri Moab ga-abịa ibu agha megide unu, ọ ga-alakwa obodo unu niile e wusiri ike nʼiyi.
Come down from thy glory and sit in thirst, O inhabitant of Dibon! For the destroyer of Moab shall come against thee! He shall destroy thy strongholds. Stand by the wayside, and look out,
19 Guzonụ nʼakụkụ ụzọ, hụrụ ihe na-eme, unu ndị bi nʼime Aroea. Jụọnụ nwoke unu hụrụ na-agba ọsọ, na nwanyị nke na-ewezuga onwe ya ajụjụ sị ha, ‘Gịnị mere?’
O inhabitant of Aroer! Ask of him that fleeth, and of her that escapeth, And say, “What hath been done?”
20 E meela ka ihere mee Moab, nʼihi na a tụpịala ya. Kwasienụ akwa ike, tiekwanụ mkpu akwa. Kwupụta ya nʼAnọn na e bibiela Moab.
Moab is confounded; for it is broken down; Howl ye, and cry! Tell ye it in Arnon, That Moab is destroyed!
21 Oge a ga-ekpe ndị bi nʼala dị larịị ikpe abịala, bụ ndị bi na Họlọn, Jahaz na Mefaat,
And punishment hath come upon the plain country; Upon Holon, and upon Jahazah, and upon Mephaath,
22 Dibọn, Nebo na Bet-Diblataim,
And upon Dibon, and upon Nebo, and upon Beth-diblathaim.
23 Kiriatem, Bet-Gamul na Bet-Meon,
And upon Kiriathaim, and upon Beth-gamul, and upon Beth-meon,
24 Keriọt na Bozra, na obodo niile dị nʼala Moab, ndị dị nso, na ndị nke dị anya.
And upon Kerioth, and upon Bozrah, And upon all the cities of the land of Moab far and near.
25 E bipụla mpi Moab, a gbajiekwala ogwe aka ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
The horn of Moab is cut off, And his arm is broken, saith Jehovah.
26 “Meenụ ya ka ọ ṅụbiga mmanya oke, nʼihi na o nupuru isi megide Onyenwe anyị. Moab ga-atụrụ onwe ya nʼihe ọ gbọrọ. Ọ ga-aghọkwa ihe ọchị.
Make ye him drunken, for he hath exalted himself against Jehovah; That he also may wallow in his vomit, And be himself also in derision.
27 Izrel ọ bụghị ihe ọchị nye gị? Ọ bụ nʼetiti ndị na-ezu ohi ka e jidere ya, mere i ji na-efufere ya isi mgbe ọbụla ị na-ekwu okwu banyere ya?
Was not Israel a derision to thee? Was he found among thieves, That, as often as thou spakest of him, thou shouldst shake thy head?
28 Sitenụ nʼobodo unu niile gbapụ ọsọ; jeenụ biri nʼetiti nkume, unu ndị bi nʼala Moab. Dịrịnụ ka nduru nke na-ewu akwụ ya nʼakụkụ ọnụ ọgba nkume.
Leave the cities and dwell in the rock, O inhabitants of Moab! Be like the dove, that maketh her nest in the sides of the mouth of the pit!
29 “Anyị anụla ihe banyere mpako Moab. Anyị anụla na mpako ahụ dị ukwuu, nụkwa ihe banyere oke mbuli elu nke ọ na-ebuli onwe ya, na oke nganga nke obi ya.
We have heard of the pride of Moab; He hath been exceeding proud; His loftiness and his arrogance, His pride and the haughtiness of his heart.
30 Amaara m ihe banyere mmụọ nke akpọghị onye ọzọ ihe ọbụla, nke dị nʼime ya, ma ọ gaghị abara ya uru ọbụla. Ịnya isi ya agaghị arụpụtakwa ihe ọbụla, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
I, too, know his insolence, saith Jehovah, And his vain boastings. They shall effect nothing.
31 Nʼihi ya, aga m akwasị akwa ike nʼihi Moab, aga m eti mkpu akwa nʼihi ala Moab niile. Aga m asụ ude akwa nʼihi ndị Kia Hareset.
Therefore will I wail for Moab, Even for all Moab will I cry out; For the men of Kir-heres shall there be mourning.
32 Akwa nke karịrị akwa Jeza ka m ga-akwa nʼihi gị, gị osisi vaịnị dị na Sibma. Alaka gị gbasara ruo nʼakụkụ osimiri, e, ha gbasara ruo nʼosimiri Jeza. Ma onye mbibi abịakwasịla mkpụrụ gị niile chara acha, e, ọ bịakwasịla mkpụrụ vaịnị gị niile.
More than Jazer will I weep for thee, O vine of Sibmah! Thy branches have passed beyond the sea; They reach even to the sea of Jazer; Upon thy summer-fruits and thy vintage the spoiler falleth.
33 Ọṅụ na obi ụtọ ka e wepụrụ site nʼubi vaịnị niile, na nʼala ubi niile nke Moab. E meela ka mmanya vaịnị kwụsị ịgbapụtakwa site nʼebe ịzọcha mmanya. Ọ dịkwaghị onye na-eji mkpu ọṅụ na-azọcha ha, Ọ bụ ezie na a na-anụ olu iti mkpu, ma ọ bụghị olu iti mkpu ọṅụ.
And joy and gladness are taken away from the fruitful field; And from the land of Moab, And from the presses, have I caused the wine to fail: No more shall they tread with shouting; The shouting shall be no shouting.
34 “A na-anụ ụda iti mkpu akwa ha site nʼobodo Heshbọn ruo Eleale, na Jehaz. A na-anụkwa ya site na Zoa ruo, ọ bụladị obodo ndị dị anya, dịka Horonaim, na Eglat Shelishiya. Nʼihi na mmiri niile nke Nimrim ataala.
From wailing Heshbon to Elealeh, Even to Jahaz, is their voice heard, From Zoar even to Horonaim, To Eglath-shelishijah; For even the waters of Nimrim are desolate.
35 Aga m eme ka ndị ahụ niile na-achụ aja nʼebe niile dị elu, na ndị ahụ niile na-achụrụ chi ha dị iche iche aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, hapụ ịdịkwa nʼala Moab,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
And I will cause to cease in Moab, saith Jehovah, Him that offereth in the high places, And him that burneth incense to his gods.
36 “Ụda akwa nke na-ada nʼime obi m nʼihi Moab dịka ụda ọja. Ụda akwa nke dịkwa ka ụda ọja na-adakwa nʼime obi m nʼihi ndị Kia Hareset. Akụ niile ha kpakọtara alaala nʼiyi.
Therefore doth my heart sound like a flute for Moab, And for the men of Ker-heres doth my heart sound like a flute; For the remnant of their substance is perished.
37 A kpụchapụla agịrị isi niile, kpachakwa afụọnụ ha niile. E bipụkwala aka ha niile. Ọ bụkwa akwa mkpe ka e ji kpuchie ukwu niile.
Every head is bald, And every beard shorn; Upon all hands are cutting, And upon the loins sackcloth.
38 Nʼelu ụlọ niile nke dị na Moab, nakwa nʼama egwuregwu niile, ọ dịghị ihe ọzọ karịa naanị iru ụjụ ka a na-ahụ. Nʼihi na e tiwaala m Moab dịka e si etiwa ite aja nke ọ dịghị onye bụla chọrọ ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Upon all the house-tops of Moab, and in her streets, All is lamentation. For I have broken Moab, like a useless vessel, saith Jehovah.
39 “Lee ka e si tipịa ya! Lee ka ha si akwasị akwa ike! Leekwa ka Moab si gbakụta azụ ya nʼihi ọnọdụ ihere ya! Moab aghọọla ihe ọchị, ọ ghọọla ihe iju anya nye ndị niile gbara ya gburugburu.”
Howl ye! How is he broken down! How hath Moab turned the back with shame! A derision and a consternation is Moab To all that are round him.
40 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Lee, ọ dị otu ugo na-efedata, nke gbasapụrụ nku ya kpuchie ala Moab niile.
For thus saith Jehovah: Behold, like an eagle flieth an enemy, And spreadeth his wings over Moab.
41 A ga-adọta Keriọt nʼagha, meriekwa ebe ya niile e wusiri ike. Nʼụbọchị ahụ, obi ndị bụ dike nʼagha nʼala Moab ga-adị ka obi nwanyị ime na-eme.
Kerioth is taken, And the strongholds are seized; The hearts of the heroes of Moab in that day Shall be like the heart of a woman in her pangs.
42 A ga-ebibi obodo Moab, mee ya ka ọ ghara ịdịkwa, nʼihi na ọ kagidere Onyenwe anyị anya.
And Moab shall be destroyed so as to be no more a people, Because he exalted himself against Jehovah.
43 Oke egwu na olulu, na igbudu nke onye na-esi ọnya nọ na-eche unu, unu ndị Moab,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Terror and the pit and the snare are upon thee, O inhabitant of Moab, saith Jehovah.
44 “Nʼoge ahụ, onye ọbụla gbapụrụ ọsọ site nʼihe oke egwu ga-adaba nʼolulu. Onye ọbụla ga-esikwa nʼolulu rịpụta ka igbudu ga-ejide. Nʼihi na aga m eme ka afọ ahụ a kara aka maka ịta Moab ahụhụ bịakwasị ya,” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
He that fleeth from the terror shall fall into the pit, And he that getteth up out of the pit shall be taken in the snare; For I will bring upon it, upon Moab, The year of their punishment, saith Jehovah.
45 “Nʼokpuru ndo Heshbọn ka ndị ahụ gbapụrụ ọsọ ndụ guzoro, na-enweghị onye inyeaka. Nʼihi na ọkụ esitela na Heshbọn rere na-aga; ire ọkụ dị ukwuu esitela nʼetiti Saịhọn na-apụ, na-erepịa egedege ihu ndị Moab, na okpokoro isi ndị ahụ ji oke ụzụ na-anya isi.
In the valley of Heshbon the fugitives halted for want of strength; But a fire is gone forth from Heshbon, And a flame from the midst of Sihon, Which devoureth the region of Moab, And the heads of the sons of tumult.
46 Ahụhụ dịrị gị, gị Moab! Ebibiela ndị Kemosh niile. A dọtakwala ụmụ gị ndị ikom na ụmụ gị ndị inyom nʼagha, buru ha gaa mba ọzọ.
Woe to thee, O Moab! Undone is the people of Chemosh! For thy sons are taken captives, And thy daughters are captives.
47 “Ma emesịa, nʼụbọchị ndị ahụ na-abịa, aga m eme ka ndị Moab a dọtara nʼagha lọghachi.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. Nke a bụ ọgwụgwụ ikpe ọmụma dịrị Moab.
Yet will I bring back the captivity of Moab In future times, saith Jehovah. Thus far the judgment of Moab.

< Jeremaya 48 >