< Jeremaya 46 >

1 Ndị a bụ okwu Onyenwe anyị, nke ruru Jeremaya onye amụma ntị, banyere mba dị iche iche.
Yehova anamupatsa Yeremiya uthenga wonena za anthu a mitundu ina.
2 Nke dịrị Ijipt: Ndị a bụ okwu dị megide usuu ndị agha Fero Neko, bụ eze Ijipt, ndị Nebukadneza eze Babilọn meriri nʼagha na Kakemish, nʼakụkụ osimiri Yufretis, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya, bụ eze Juda.
Kunena za Igupto: Yehova ananena za gulu lankhondo la Farao Neko mfumu ya ku Igupto limene Nebukadinezara mfumu ya ku Babuloni analigonjetsa ku Karikemesi ku mtsinje wa Yufurate mʼchaka cha chinayi cha Yehoyakimu mwana wa Yosiya mfumu ya Yuda,
3 “Kwadoonụ ọta agha unu, ndị ukwu na ndị nta, zọpụnụ ije maka ibu agha.
anati, “Konzani zishango zanu ndi malihawo, ndipo yambanipo kupita ku nkhondo!
4 Kegidezienụ ịnyịnya unu, rịkwasịkwanụ nʼelu ha. Guzokwanụ nʼọnọdụ ibu agha unu, ma kpukwasịkwanụ onwe unu okpu agha unu. Mụọnụ ùbe unu ka ọ dị nkọ, yikwasịkwanụ uwe agha unu.
Mangani akavalo, ndipo kwerani inu okwerapo! Khalani pa mzere mutavala zipewa! Nolani mikondo yanu, valani malaya anu ankhondo!
5 Gịnị ka anya m abụọ hụrụ? Ụjọ na-atụ ha, ha na-agbaghachikwa azụ; lee, a na-etipịa ndị ha bụ dike nʼagha. Ha na-agbasi ọsọ ike, na-eleghị anya nʼazụ. Egwu dịkwa nʼakụkụ niile,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Yeremiya anati: Kodi ndikuona chiyani? Achita mantha akubwerera, ankhondo awo agonjetsedwa. Akuthawa mofulumirapo osayangʼananso mʼmbuyo, ndipo agwidwa ndi mantha ponseponse,” akutero Yehova.
6 “Ndị nwere ụkwụ ọsọ enweghị ike ịgbalaga, ndị dị ike enweghị ike isi nʼebe ahụ wezuga onwe ha. Ha na-asọ ngọngọ daa, nʼakụkụ ugwu dị nso nʼosimiri Yufretis.
Waliwiro sangathe kuthawa ngakhale wankhondo wamphamvu sangathe kupulumuka. Akunka napunthwa ndi kugwa kumpoto kwa mtsinje wa Yufurate.
7 “Onye bụ onye a, nke na-ebili ọtọ dịka osimiri Naịl, na dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị?
“Kodi ndani amene akukwera ngati Nailo, ngati mtsinje wa madzi amkokomo?
8 Ijipt na-ebili elu dịka osimiri Naịl, dịka osimiri nke mmiri ya na-amagharị. Ọ na-asị, ‘Aga m ebili kpuchie ụwa niile. Aga m ebibi obodo ukwu dị iche iche, na ndị mmadụ bi nʼime ha.’
Igupto akusefukira ngati Nailo, ngati mitsinje ya madzi amkokomo. Iye akunena kuti, ‘Ndidzadzuka ndi kuphimba dziko lapansi; ndidzawononga mizinda ndi anthu ake.’
9 Gbabanyenụ nʼọgbọ agha, unu ịnyịnya niile. Gbanụ ọkụ ọkụ, unu ndị na-agba ụgbọ agha. Zọọnụ ike ike, unu ndị bụ dike nʼagha, unu ndị ikom Kush na Put, ndị na-ebu ọta, na unu ndị ikom Lidiya ndị na-agba ụta.
Tiyeni, inu akavalo! Thamangani inu magaleta! Tulukani, inu ankhondo, ankhondo a ku Kusi ndi Puti amene mumanyamula zishango, ankhondo a ku Ludi amene mumaponya uta.
10 Ma ụbọchị ahụ dịrị Onyenwe anyị, bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile. Ọ bụ ụbọchị ịbọ ọbọ ya, ụbọchị ọ ga-abọrọ ọbọ nʼahụ ndị iro ya. Mma agha ga-eripịa ha tutu afọ eju ya, e, tutu ruo mgbe ọ ṅụjuru ọbara afọ. Nʼihi na Onyenwe anyị bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ga-achụ aja nʼala ahụ dị nʼugwu, nke dị nso osimiri Yufretis.
Koma tsikulo ndi la Ambuye Yehova Wamphamvuzonse; tsiku lolipsira, lolipsira adani ake. Lupanga lake lidzawononga ndi kukhuta magazi, lidzaledzera ndi magazi. Pakuti Yehova, Yehova Wamphamvuzonse, adzapereka adani ake ngati nsembe mʼdziko la kumpoto mʼmbali mwa mtsinje wa Yufurate.
11 “Rigoro Gilead ka i weta mmanụ a na-ete nʼọnya, gị Ada Ijipt na-amaghị nwoke. Ma ọ bụ nʼefu ka ị na-ewebata ọgwụ ndị a niile, nʼihi na ọgwụgwọ ọbụla agaghị adịrị gị.
“Pita ku Giliyadi ukatenge mankhwala iwe namwali Igupto. Wayesayesa mankhwala ambiri koma osachira; palibe mankhwala okuchiritsa.
12 Mba niile ga-anụ akụkọ ihe ihere bịakwasịrị gị. Nʼakụkụ niile nke ụwa ka a ga-anụkwa ịkwa akwa gị. Otu dike nʼagha na-asọ ngọngọ na-adakwasị dike ibe ya; ha abụọ na-adakwa nʼala.”
Anthu a mitundu ina amva za manyazi ako; kulira kwako kwadzaza dziko lapansi. Ankhondo akunka nagwetsanagwetsana, onse awiri agwa pansi limodzi.”
13 Okwu ndị a ka Onyenwe anyị gwara Jeremaya onye amụma, banyere ọbịbịa nke Nebukadneza, bụ eze Babilọn, onye na-abịa ibuso Ijipt agha.
Uthenga umene Yehova anapatsa mneneri Yeremiya wonena za kubwera kwa Nebukadinezara mfumu ya ku Babuloni kudzathira nkhondo Igupto ndi uwu:
14 “Kwupụtanụ ihe ndị a nʼIjipt. Kwusaa ya na Migdol. Kwusaakwa ya na Memfis, na nʼobodo Tapanhis. Guzozienụ onwe unu nʼusoro, nọọkwanụ na njikere, nʼihi na mma agha na-eripịa ndị gbara unu gburugburu.
“Mulengeze ku Igupto. Mulengeze ku Migidoli. Mulengezenso ku Mefisi ndi ku Tapanesi. Muwawuze anthu akumeneko kuti, ‘Imani pamalo panu ndi kukhala okonzeka kudziteteza, chifukwa lupanga lidzawononga zonse zimene muli nazo.’
15 Gịnị mere a ga-eji gbudasịa ndị gị niile bụ dike nʼagha? Ha agaghị enwe ike guzokwa, nʼihi na Onyenwe anyị ga-akwada ha.
Chifukwa chiyani mulungu wanu wamphamvu uja Apisi wathawa? Iye sakanatha kulimba chifukwa Yehova anamugwetsa.
16 Ha ga-asọ ngọngọ mgbe mgbe, ha ga-adakwasịkwa nʼelu ibe ha. Ha ga-asịkwa, ‘Bilienụ ọtọ, bịanụ ka anyị laghachikwuru ndị anyị, ka anyị laghachikwa nʼala ebe a mụrụ anyị, ka anyị wezugakwa onwe anyị site na mma agha nke ndị mmegbu.’
Ankhondo anu apunthwa ndi kugwa. Aliyense akuwuza mnzake kuti, ‘Tiyeni tibwerere kwathu, ku dziko kumene tinabadwira, tithawe lupanga la adani athu.’
17 Nʼebe ahụ ka ha ga-anọ tie mkpu sị, ‘Fero eze Ijipt bụ naanị onye oke okwu. Lee, oge a kara aka nye ya efunarịla ya.’
Kumeneku iwo adzafuwula kuti, ‘Farao, mfumu ya ku Igupto mupatseni dzina lakuti, Waphokoso, Wotaya mwayi wake.’
18 “Dịka mụ onwe m na-adị ndụ,” ka Eze ahụ kwupụtara, onye aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, “otu onye ga-abịa, onye dị ukwuu dịka ugwu Taboa si dị ukwuu nʼebe ugwu ndị ọzọ dị, na dịka Kamel si dịrị nʼakụkụ osimiri.
“Pali Ine wamoyo,” ikutero Mfumu, imene dzina lake ndi Yehova Wamphamvuzonse, “wina adzabwera amene ali ngati Tabori phiri lopambana mapiri ena, ngati phiri la Karimeli loti njoo mʼmbali mwa nyanja.
19 Kwakọtaanụ ngwongwo unu, jikerenụ maka ije biri nʼala ọzọ, unu ndị bi nʼIjipt, nʼihi na a ga-eme ka Memfis ghọọ ebe tọgbọrọ nʼefu. Ọ ga-aghọkwa mkpọmkpọ ebe, nke mmadụ na-agaghị ebi nʼime ya.
Konzani katundu wanu wopita naye ku ukapolo inu anthu a ku Igupto, pakuti Mefisi adzasanduka chipululu ndipo adzakhala bwinja mopanda wokhalamo.
20 “Ijipt mara mma dịka nne ehi, ma ijiji nke si nʼakụkụ ugwu, na-abịa imegide ya.
“Igupto ali ngati mwana wangʼombe wokongola, koma chimphanga chikubwera kuchokera kumpoto kudzalimbana naye.
21 Ndị agha e goro ego nọ nʼetiti ha dịka ụmụ ehi gbara abụba. Ha onwe ha kwa ga-atụgharịa gbaa ọsọ, ha agaghị eguzo, nʼihi na ụbọchị nhụju anya na-abịakwasị ha, bụ ụbọchị a ga-ata ha ahụhụ.
Ngakhale ankhondo aganyu amene ali naye ali ngati ana angʼombe onenepa. Nawonso abwerera mʼmbuyo, nathawa pamodzi. Palibe amene wachirimika. Ndithu, tsiku la tsoka lawafikira; ndiyo nthawi yowalanga.
22 Ijipt ga-eme mkpọtụ, dịka mkpọtụ nke agwọ na-agba ọsọ na-eme, mgbe ndị iro ya ji ike na-abịakwasị ya. Ha ga-eji anyụike bịakwasị ya, dịka ndị na-egbutu osisi.
Aigupto akuthawa ndi liwu lawo lili ngati la njoka yothawa pamene adani abwera ndi zida zawo, abwera ndi nkhwangwa ngati anthu odula mitengo.
23 Ha ga-egbutu oke ọhịa ya,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, “nʼagbanyeghị na ọ bụ oke ọhịa rubigara oke. Ha dị ọtụtụ karịa igurube, a pụghịkwa ịgụta ole ha dị.
Iwo adzadula nkhalango ya Igupto,” akutero Yehova, “ngakhale kuti ndi yowirira. Anthuwo ndi ochuluka kupambana dzombe, moti sangatheke kuwerengeka.
24 A ga-eme ka ihere mee Ada Ijipt, mgbe e nyefere ya nʼaka ndị si nʼakụkụ ugwu bịa.”
Anthu a ku Igupto achita manyazi atengedwa ukapolo ndi anthu a kumpoto.”
25 Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, sịrị, “Ana m aga ime ka ahụhụ bịakwasị Amọn, bụ chi ndị Tibs, na Fero, na ala Ijipt na chi niile dị nʼime ya, ndị eze ya niile nakwa ndị ahụ na-atụkwasị Fero obi.
Yehova Wamphamvuzonse, Mulungu wa Israeli, akunena kuti, “Ndili pafupi kulanga Amoni mulungu wa Tebesi. Ndidzalanganso Farao ndi Igupto pamodzi ndi milungu yake yonse, mafumu ake ndi onse amene amamukhulupirira.
26 Aga m enyefe ha nʼaka ndị ahụ na-achọsi ndụ ha ike, bụ Nebukadneza eze Babilọn, na ndịisi ọchịchị ya. Ma nʼikpeazụ, aga m emekwa ka ndị mmadụ birikwa nʼime ya ọzọ, dịka e si biri nʼime ya na mgbe ochie.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Ndidzawapereka kwa amene akufuna kuwapha, ndiye kuti kwa Nebukadinezara mfumu ya ku Babuloni ndi atsogoleri ake ankhondo. Komabe, mʼtsogolomo Igupto adzakhalanso ndi anthu monga kale,” akutero Yehova.
27 “Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m. Adakwala mba, gị Izrel. Nʼihi na lee, aghaghị m ịzọpụta gị site nʼebe dị anya nke e mere ka ị gaa biri. Aga m azọpụtakwa ụmụ ụmụ gị site nʼala ebe e mere ka ha gbapụ ọsọ gaa biri. Jekọb ga-emesịakwa biri nʼudo, na-atụghị egwu ọbụla. Ọ dịkwaghị onye ga-eme ka ọ tụọ ụjọ.
“Iwe mtumiki wanga Yakobo, usachite mantha; usataye mtima, iwe Israeli. Ndithu Ine ndidzakupulumutsa kuchokera ku mayiko akutali, ndidzapulumutsanso zidzukulu zako kuchokera ku mayiko kumene anapita nazo ku ukapolo. Yakobo adzabwerera ndipo adzakhala motakasuka ndi pa mtendere, ndipo palibenso wina amene adzamuopsa.
28 Atụla egwu, gị Jekọb, ohu m, nʼihi na anọnyeere m gị,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “A sịkwarị na m ebibie mba ndị ahụ niile nke m mere ka ị gaa biri nʼetiti ha kpamkpam, agaghị m ebibi gị kpamkpam. Aga m adọ gị aka na ntị, ma ọ ga-abụ site nʼụzọ ikpe ikpe ziri ezi. Agakwaghị m ahapụ inye gị ahụhụ i kwesiri ịnata.”
Iwe mtumiki wanga Yakobo, usachite mantha, pakuti Ine ndili nawe,” akutero Yehova. “Ndidzawonongeratu mitundu yonse ya anthu a ku mayiko kumene ndakupirikitsira, Koma iwe sindidzakuwononga kotheratu. Ndidzakulanga iwe ndithu koma moyenerera; sindidzakulekerera osakulanga.”

< Jeremaya 46 >