< Jeremaya 45 >

1 Okwu ndị Jeremaya onye amụma gwara Baruk nwa Neraya, mgbe o dere okwu ndị a nʼakwụkwọ dịka Jeremaya na-akpọpụta ha, nʼafọ nke anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda. Jeremaya gwara Baruk sị,
The word which Jeremiah the prophet spake to Baruch, the son of Neriah, after he had written these words in a book from the mouth of Jeremiah, in the fourth year of Jehoiakim, the son of Josiah, the king of Judah, saying: —
2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel na-agwa gị, gị Baruk,
Thus saith Jehovah, the God of Israel, to thee, O Baruch!
3 Ị sịrị, ‘Ahụhụ dịịrị m! Lee na Onyenwe anyị atụkwasịrịla m mwute nʼelu ihe mgbu nke m nwere. Ike ịsụ ude agwụla m, ma ruo ugbu a, achọtabeghị m izuike.’
Thou sayest, “Woe now to me, for Jehovah hath added grief to my sorrow! I am weary with my sighing, and find no rest.”
4 Ma ihe ndị a ka ị ga-agwa ya, ‘Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Aga m akwada ihe ndị ahụ niile m wuru, hopukwa ihe ndị ahụ niile m kụrụ nʼala a niile.
Thus shalt thou say to him: Thus saith Jehovah: Behold, that which I myself have builded do I break down, and that which I myself have planted do I pluck up, even this whole land;
5 Ma gị onwe gị, ị na-achọrọ onwe gị ihe ukwu? Achọkwala ha. Nʼihi na, lee, aga m eme ka ihe ọjọọ bịakwasị mmadụ niile, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, ma aga m eme ka ị jiri ndụ gị gbapụ jee ebe ọbụla ị ga-eje.’”
and seekest thou great things for thyself? Seek them not; for behold, I am about to bring evil upon all flesh, saith Jehovah; but thy life will I give thee, as a prey, in all places whither thou shalt go.

< Jeremaya 45 >