< Jeremaya 44 >

1 Ndị a bụ okwu ruru Jeremaya ntị banyere ndị Juu ahụ niile bi nʼala Ijipt, bụ ndị bi na Migdol, na nʼime Tapanhis, na nʼime Memfis, na nʼime Patros,
以下是關於住在埃及地,住在米革多耳,塔黑培乃斯、諾夫和帕特洛斯地的一切猶太人,傳給耶肋米亞的話:「
2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu ji anya unu hụ ihe ọjọọ ahụ niile m mere ka ha bịakwasị Jerusalem, na obodo niile nke Juda. Lee, obodo ndị ahụ aghọọla mkpọmkpọ ebe taa, o nwekwaghị onye bi nʼime ha.
萬軍的上主,以色列的天主這樣說:你們看見了我對耶路撒冷和猶大各城召來的一切災禍,看,今日已成為無人居住的曠野。
3 Ihe ndị a bịakwasịrị ha nʼihi ihe ọjọọ ha mere. Ha kpasuru m iwe site nʼịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ, na site nʼife chi ndị ọzọ, ndị ha onwe ha maọbụ nna nna ha na-amaghị.
這是因為他們做了惹我動怒的惡事,向他們、你們和你們的祖先從不認識的外方神祇焚香敬拜;
4 Site nʼoge ruo nʼoge, mgbe mgbe, eziteere m ha ndị ohu m, bụ ndị amụma, ndị gwara ha okwu sị ha, ‘Unu emela ihe arụ dị otu a nke m kpọrọ asị!’
雖然我早就不斷洽你們派遣我所有的先知僕人們說:你們切不可做我所憎恨的可惡之事!
5 Ma ha egeghị ntị, ha atọkwaghị ntị ha nʼala. Ha esiteghị nʼihe ọjọọ ha na-eme chegharịa, maọbụ kwụsị ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ.
他們卻沒有側耳聽從,沒有放棄他們向外方神祇焚香的惡習。
6 Nʼihi ya, awụkwasịrị m ha ọnụma m na iwe m, nke rere dịka ọkụ megide obodo niile nke Juda, na okporoụzọ nke Jerusalem. Ya mere, ha ghọrọ mkpọmkpọ ebe na ebe tọgbọrọ nʼefu taa.
於是我的憤恨如火發作,焚毀了猶大城市和耶路撒冷的街市,使她成為荒涼的曠野,有如今日。
7 “Ma ugbu a, ihe ndị a ka Onyenwe anyị Chineke Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Nʼihi gịnị ka unu ji chọọ iji aka unu wetara onwe unu ihe ọjọọ ndị a? Lee ka unu si duru ndị ikom na ndị inyom niile, na ụmụntakịrị niile, na ụmụ a mụrụ ọhụrụ niile na-agbala nʼala Ijipt, si otu a mee ka, ọ bụladị, otu mkpụrụ mmadụ hapụ ịfọdụkwa nʼala Juda.
現在,上主萬軍的天主以色列的天主這樣說:為什麼你們招來這樣大的災禍,加害自己,使你們中的男人、婦女、幼童、嬰兒,全由猶大滅絕,不給你們留下遺民﹖
8 Gịnị mere unu na-eji ọrụ aka unu na-akpasu m iwe, na-esurere chi ndị ọzọ ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nʼala Ijipt, ebe unu bịara ibi? Unu onwe unu ga-ala onwe unu nʼiyi, mekwaa onwe unu ihe ịbụ ọnụ nakwa ihe nkọcha nʼetiti mba niile dị nʼụwa.
為什麼你們做惹我動怒的事,向你們來寄居的埃及地的外方神祇獻香,使你們自遭滅亡,成為普世萬民詛咒和恥笑的對象﹖
9 Unu echefuola ihe ọjọọ nna unu ha mere na ihe ọjọọ niile ndị eze Juda na ndị eze nwanyị Juda mere na ihe ọjọọ niile nke unu onwe unu na ndị nwunye unu mekwara nʼala Juda, na nʼokporoụzọ Jerusalem?
難道你們忘了你們的祖先、猶大君王和他們的妻妾、你們自己和你們的女人,在猶大地和耶路撒冷街上犯的種種罪惡﹖
10 Ruo ụbọchị taa, o nwebeghị onye ọbụla nʼime ha wedarala onwe ya ala, maọbụ tụọ egwu m; ha adịghị ejegharị nʼiwu m, maọbụ jidesie ụkpụrụ ndị ahụ niile m debere nʼihu ha na nʼihu nna nna ha aka ike, ịgbaso ya.
他們直到今日尚不後悔,也不畏懼,更不履行我給你們和你們的祖先頒布的法律和誡命。
11 “Nʼihi ihe ndị a niile, otu a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru: Ekpebiela m ime ka ihe ọjọọ bịakwasị unu; ekpebiela m ibibi Juda.
為此,萬軍的上主,以色列的天主這樣說:看,我面向你們,是為降災,消滅整個猶大。
12 Aga m eme ka ndị ahụ niile fọdụrụ nʼala Juda, bụ ndị ahụ kpebiri nʼobi ha ịga biri nʼala Ijipt ghara ịdịkwa. A ga-ala ha nʼiyi nʼala Ijipt; ha ga-ada site na mma agha, maọbụ site nʼụnwụ. Ndị niile dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha na ndị niile dịkarịsịrị nta ga-anwụ. Ha ga-aghọkwa ihe ịbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe ọmụma ikpe na ihe nkọcha.
凡決意往埃及地去,要六那裏寄居的猶大遺民,我必要剷除,叫他們全死在埃及地,喪身刀下,饑餓而死;不分老幼都死於刀劍、饑荒,飽受憎恨、厭惡、詛咒和侮辱。
13 Dịka m si taa Jerusalem ahụhụ, otu a ka m ga-esi jiri mma agha, na ụnwụ, na ọrịa na-efe efe, taa ndị ahụ bi nʼIjipt ahụhụ.
我必以刀劍、饑荒和瘟疫懲罰住在埃及地的人,如懲罰耶路撒冷一樣,
14 O nweghị onye ọbụla nʼime ndị Juda ahụ fọdụrụ, ndị gara biri nʼIjipt nke ga-agbanarị ọnwụ. Ọ bụ ezie na ọ na-agụsị ha agụụ ike ịlọghachi nʼala Juda, ma o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-alọghachi, karịakwa mmadụ ole na ole ndị ga-agbapụ agbapụ.”
使前往寄居埃及的猶大遺民,無一能幸免逃脫,返回他們所渴望回去居住的猶大地;除少數脫身者外,他們不會回來了。」
15 Ndị nọ nʼebe ahụ mgbe ahụ Jeremaya kwuru okwu ndị a bụ ndị ikom ahụ niile maara na ndị nwunye ha na-achụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ nye chi ndị ọzọ, na ndị niile bi nʼIjipt nʼakụkụ Patros. Ndị a zara Jeremaya sị ya,
於是凡知道自己的女人曾向外方神祇燒香的人,和一大群環立在旁的婦女,以及住在埃及地和帕特洛斯的全體人民,就答覆耶肋米亞說:「
16 “Anyị agaghị anabata okwu ahụ i si nʼaha Onyenwe anyị gwa anyị
你奉上主的名對我們說的話,我們不願聽從;
17 Nʼihi na anyị aghaghị ime ihe ndị ahụ anyị kpebiri ime. Anyị ga-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ. Anyị ga-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ dịka anyị na nna anyị ha, ndị eze anyị na ndịisi ọchịchị anyị mere nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem. Nʼoge ahụ, anyị na-eriju afọ, ihe na-agakwara anyị nke ọma, o nweghị ihe ọjọọ bịakwasịrị anyị.
至於凡出自我們口中的話,我們必定實行,給天后焚香奠酒,如同我們、我們的祖先、君王及首領,在猶大城和耶路撒冷街上所做的一樣;那時我們都豐衣足食,安享太平,不見災禍。
18 Ma site nʼoge anyị kwụsịrị ịchụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja, ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na ịwụsara ya aja ihe ọṅụṅụ, ihe niile akọla anyị, ọ bụkwa site na mma agha na oke ụnwụ ka anyị na-ala nʼiyi.”
可是,自從我們斷絕向天后獻香,不給她奠酒以來,我們就什麼也缺乏,死於刀劍和饑荒。
19 Ndị inyom ahụ niile kwukwara sị, “Mgbe ahụ anyị na-eji ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na-achụrụ Eze nwanyị mbara Eluigwe aja na mgbe ahụ anyị na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ, ọ bụ na ndị di na-alụ anyị amaghị na anyị na-eme achịcha nʼoyiyi ya, na-awụsakwara ya aja ihe ọṅụṅụ?”
至於我們的女人向天后焚香奠酒,又那能沒有我們男人的同意,依照她的形狀,給她備製祭餅,向她奠酒呢﹖」
20 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara mmadụ ahụ niile okwu, ma ndị ikom ma ndị inyom ahụ niile zara ya okwu sị ha,
耶肋米亞便對全體人民,對答覆他的男人和婦女以及所有的人說:「
21 “Onyenwe anyị chetara ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ niile unu na nna unu ha, na ndị eze unu, na ndịisi ọchịchị unu, na ndị Izrel niile ji chụọ aja nʼobodo Juda niile na nʼokporoụzọ Jerusalem niile.
難道你們、你們的祖先、君王、首領和地方上的人民,在猶大城和耶路冷街上燒香的事,上主就不記得了,再也不懷念在心了嗎﹖
22 Nʼihi ya, mgbe Onyenwe anyị na-enweghịkwa ike ịnagide ihe ọjọọ niile ndị a unu mere, na ihe arụ niile unu mere, o mere ka ala unu ghọọ mkpọmkpọ ebe, na ihe iju anya, na ihe nkọcha, nke mmadụ na-ebighị nʼime ya, dịka ọ dị taa.
上主再也不能容忍你們邪惡的行為,和你們做的可惡的事,為此你們的土地變成了荒野,成了驚愕和詛咒的對象,無人居住,有如今日:
23 Nʼihi na unu surere ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nʼihi na unu mehiere megide Onyenwe anyị, ghara irubere ya isi, maọbụ ịgbaso iwu ya, maọbụ idebe ụkpụrụ ya, maọbụ imezu ihe niile ọ sịrị ka unu mee, nʼihi ya ka ihe ọjọọ ndị a ji dakwasị unu dịka unu na-ahụ ugbu a.”
就因為你們燒香得罪了上主,不聽上主的勸告,不覆行他的法律、誡命和法令,纔給你們招來了像今日這樣的災禍。」
24 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara ndị inyom ahụ, na ndị Izrel niile okwu sị ha, “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị unu ndị Juda niile nọ nʼIjipt.
以後,耶肋米亞又對全體人民和全體婦女說:「凡在埃及境內的猶大人,請聽上主的話!
25 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Unu na ndị nwunye unu esitela nʼomume unu gosi na unu na-emezu ihe ndị ahụ unu ji ọnụ kwuo sị, ‘Anyị aghaghị imezu nkwa niile anyị kwere banyere ịchụ aja ihe nsure ọkụ na-esi isi ụtọ na nke ihe ọṅụṅụ nye Eze nwanyị mbara Eluigwe.’ “Gaanụ nʼihu mezuo nkwa unu kwere! Mezuokwanụ iyi unu ṅụrụ.
萬軍的上主,以色列的天主這樣說:你們和你們的女人都要親手做你們親口說的事;你們說:我們決意實踐我們許的誓願,向天后燒香奠酒。你們就實踐你們的誓願,舉行你們的奠祭罷!
26 Ma nụrụkwanụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị Juu niile bi nʼIjipt, ‘Eji m aha m dị ukwuu na-aṅụ iyi,’ ka Onyenwe anyị na-ekwu, ‘na o nweghị onye Juda ọbụla bi nʼakụkụ ọbụla nke Ijipt, nke ga-akpọkukwa aha m ọzọ, maọbụ jiri ya ṅụọ iyi sị, “Dịka Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị na-adị ndụ.”
但是,所有住在埃及地的猶大人,你們且聽上主的話:看,我以我偉大的名起誓──上主說:在埃及全地任何猶大人的口中,不會再呼號我名說:我主上主永在!
27 Nʼihi na anya m na-ele ha abụghị maka ime ha mma, kama ọ bụ maka ime ha ihe ọjọọ. Ndị Juu niile bi nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, maọbụ site nʼoke ụnwụ, tutu ruo mgbe e bibichara ha dum.
看,我注視他們,是為降災,不是為賜福,使在埃及地所有的猶大人,都死於刀劍饑荒,徹底消滅;
28 Naanị mmadụ ole na ole ga-esi Ijipt gbalata Juda ịgbanarị mma agha. Mgbe ahụ ndị Juda niile fọdụrụ, bụ ndị bịara biri nʼIjipt, ga-amata onye okwu ya na-eguzosi ike, maọbụ nke m, maọbụ nke ha.
即使有逃脫刀劍,從埃及地回到猶大的人,為數也寥寥無幾。到埃及地來寄居的全體猶大遺民,終於會知道:誰的話要應驗,是我的還是他們的。
29 “‘Nke a ga-abụrụ unu ihe ama nke ga-egosi unu na m ga-ata unu ahụhụ nʼebe a,’ otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. ‘Ka unu si otu a mara na mba m na-aba na m ga-emesi unu ike aghaghị iguzosi ike.’
這為你們是個徵兆──上主的斷語──就在這地方我要懲罰你們,叫你們知道:我對你們要降災的話,必要絕對應驗。
30 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Aga m arara Fero Hofra, eze Ijipt nyefee nʼaka ndị iro ya, bụ ndị na-achọ ndụ ya, dịka m si rara Zedekaya eze Juda, nyefee nʼaka Nebukadneza eze Babilọn, bụ onye iro ahụ chọrọ ndụ ya.’”
上主這樣說:看,我必將埃及王法郎曷斐辣交在他仇人和圖謀他性命的人手中,就如我曾將猶大王漆德克雅,交在他仇人和圖謀他性命的巴比倫王拿步高的手中一樣。」

< Jeremaya 44 >