< Jeremaya 43 >
1 Mgbe Jeremaya gwasịrị ndị ahụ niile okwu ahụ Onyenwe anyị Chineke ha ziri ya ka o zie ha,
Yeremya Tanrıları RAB'bin bütün bu sözlerini –Tanrıları RAB'bin onun aracılığıyla kendilerine ilettiği her şeyi– halka bildirmeyi bitirince
2 Azaraya nwa Hoshaya, Johanan nwa Kariya na ndị nganga niile nọ nʼebe ahụ, gwara Jeremaya okwu sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka i kwuru! Onyenwe anyị Chineke anyị ezighị gị ka i kwuo na anyị ekwesighị ịga biri nʼIjipt,
Hoşaya oğlu Azarya, Kareah oğlu Yohanan ve bütün küstah adamlar ona, “Yalan söylüyorsun!” dediler, “Tanrımız RAB, ‘Yerleşmek üzere Mısır'a gitmeyin’ demek için göndermedi seni bize.
3 Kama ọ bụ Baruk nwa Neraya na-akwalị gị megide anyị, nʼihi na ọ chọrọ inyefe anyị nʼaka ndị Babilọn ka ha gbuo anyị, maọbụ buru anyị gaa Babilọn dịka ndị a dọtara nʼagha.”
Bizi öldürsünler, Babil'e sürsünler diye Kildaniler'in eline teslim etmek için Neriya oğlu Baruk seni bize karşı kışkırtıyor.”
4 Ya mere, Johanan nwa Kariya na ndịisi agha ahụ niile, nakwa ndị mmadụ ahụ niile nupuru isi nʼiwu Onyenwe anyị, jụụ ịnọgide nʼala Juda.
Böylece Kareah oğlu Yohanan, bütün ordu komutanları ve halk RAB'bin Yahuda'da kalmalarına ilişkin buyruğuna karşı geldiler.
5 Kama Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ, duuru ndị ahụ fọdụrụ na Juda pụọ, ha na ndị ahụ si na mba ndị ọzọ dị iche iche, ebe ha gbagara lọta.
Kareah oğlu Yohanan'la bütün ordu komutanları, sürüldükleri uluslardan yerleşmek üzere Yahuda'ya geri dönen Yahuda halkını alıp götürdüler.
6 Ha duuru ndị ikom niile na ndị inyom niile na ụmụntakịrị niile, na ụmụ ndị inyom eze niile, bụ ndị ahụ Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze Babilọn tinyere na nlekọta Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan na Jeremaya onye amụma na Baruk nwa Neraya.
Muhafız birliği komutanı Nebuzaradan'ın Şafan oğlu Ahikam oğlu Gedalya'nın sorumluluğuna bırakmış olduğu bütün kadınları, erkekleri, çocukları, kral kızlarını da götürdüler. Peygamber Yeremya'yla Neriya oğlu Baruk'u da alıp
7 Ya mere, ha nupuru isi nʼebe Onyenwe anyị nọ site nʼịbanye ala Ijipt. Ha jegidere ije ruo nʼobodo Tapanhis.
RAB'bin sözünü dinlemeyerek Mısır'a gittiler. Tahpanhes'e vardılar.
8 Mgbe ha nọ na Tapanhis, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
Tahpanhes'te RAB Yeremya'ya şöyle seslendi:
9 “Mgbe ndị Juu nọ na-ele gị anya, chịrị ụfọdụ nkume buru ibu nʼaka gị, gaa zoo ha nʼime ụrọ dị na mpụta ihu ụlọ e ji aja ụrọ wuo, nke dị nʼọnụ ụzọ e si abata nʼụlọ Fero dị na Tapanhis.
“Yahudiler'in gözü önünde eline büyük taşlar al, Tahpanhes'te firavun sarayının girişindeki tuğla kaldırımın harcına göm.
10 Mgbe ahụ sị ha, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel sịrị, Aga m ezi ozi kpọta ohu m bụ Nebukadneza, eze Babilọn. Aga m edokwasịkwa ocheeze ya nʼelu nkume ndị a m zoro nʼebe a, ọ ga-agbasa ụlọ ndo nke ịbụ eze ya nʼelu ha.
Onlara de ki, ‘İsrail'in Tanrısı, Her Şeye Egemen RAB şöyle diyor: İşte kulum Babil Kralı Nebukadnessar'ı buraya getirtip tahtını harca gömdüğüm bu taşların üzerine kuracağım. Nebukadnessar otağını bu taşların üzerine kuracak.
11 Ọ ga-abịa buso Ijipt agha, si otu a mee ka ha nwụọ, bụ ndị ahụ a kwadobere maka ọnwụ, mee ka a dọta ha nʼagha, bụ ndị ahụ a kwadobere na-aga adọta nʼagha; mekwaa ka ha nwụọ site na mma agha bụ ndị ahụ a kwadobere na ha ga-anwụ site na mma agha.
Gelip Mısır'ı bozguna uğratacak. Ölüm için ayrılanlar ölüme, Sürgün için ayrılanlar sürgüne, Kılıç için ayrılanlar kılıca gidecek.
12 Ọ ga-esunyekwa ọkụ nʼụlọ ebe a nọ na-efe chi niile nke ndị Ijipt. Ọ ga-esure ụlọ ndị a ọkụ, dọtakwa chi ha niile nʼagha. Dịka onye ọzụzụ atụrụ si ewepụcha igwu site na uwe ya, ọ ga-esikwa otu a wezuga onwe ya nʼudo site nʼIjipt pụọ.
Mısır ilahlarının tapınaklarını ateşe verip yakacak, ilahları alıp götürecek. Çoban giysisiyle kendisini nasıl örterse, o da Mısır'ı öyle örtecek. Sonra oradan sağ salim çıkacak.
13 Nʼime ụlọnsọ anyanwụ dị nʼIjipt, ka ọ ga-akwatu ogidi nsọ niile, surekwaa ụlọnsọ niile nke chi dị iche iche nʼIjipt ọkụ.’”
Mısır'daki Güneş Tapınağı'nın dikili taşlarını kıracak, Mısır ilahlarının tapınaklarını ateşe verecek.’”