< Jeremaya 42 >
1 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha ahụ niile, na Jezenaya nwa Hoshaya, na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu, bịakwutere
Nato svi vojni zapovjednici, osobito Johanan, sin Kareahov, i Azarja, sin Hošajin, i sav narod, malo i veliko, pristupiše
2 Jeremaya onye amụma sị ya, “Biko, anyị bịara ịrịọ gị arịrịọ. Kpọkuo Onyenwe anyị Chineke gị nʼekpere nʼihi anyị bụ ndị fọdụrụ nʼala a. Ị maara na o nwere oge anyị dị ọtụtụ nʼala a, ma ugbu a anyị dị naanị ole na ole.
i rekoše proroku Jeremiji: “Pomno počuj molbu našu! Zagovaraj nas pred Jahvom, Bogom svojim, za sav ovaj ostatak, jer nas, kako i sam vidiš, ostade još samo malo od velikoga broja koliko nas je nekoć bilo.
3 Kpee ekpere ka Onyenwe anyị Chineke gị gosi anyị ihe anyị ga-eme, maọbụ ebe anyị ga-eje.”
Neka nam Jahve, Bog tvoj, objavi kuda da krenemo i što valja da činimo.”
4 Jeremaya onye amụma zara sị ha, “Anụla m ihe unu kwuru. Aga m ekpere Onyenwe anyị Chineke unu ekpere dịka unu rịọrọ. Mgbe m natara ọsịsa ya, aga m agwakwa unu ihe niile Onyenwe anyị kwuru. O nwekwaghị ihe m ga-ezonarị unu.”
Prorok im Jeremija odgovori: “Pristajem. Pomolit ću se, kao što rekoste, Jahvi, Bogu vašemu, i javit ću vam sve što on odgovori, ni riječi vam neću zatajiti.”
5 Ha sịrị Jeremaya, “Ka Onyenwe anyị bụrụ onyeama eziokwu na nke kwesiri ntụkwasị obi megide anyị, ma ọ bụrụ na anyị emeghị dịka ihe niile Onyenwe anyị bụ Chineke gị gwara gị ka ị gwa anyị.
Oni pak rekoše Jeremiji: “Neka Jahve bude istinit i vjerodostojan svjedok protiv nas ako ne postupimo sasvim po riječima koje će nam Jahve, Bog tvoj, po tebi objaviti.
6 Ọ bụ ihe Chineke, onye anyị na-eziga gị ka ị jụta ase, kwuru ka anyị ga-eme. Ma ọ dị mma, ma ọ dị njọ. Anyị ga-erubere Onyenwe anyị Chineke gị isi, ka ihe gaara anyị nke ọma.”
Bio povoljan ili nepovoljan glas Jahve, Boga našega, komu te šaljemo, mi ćemo ga slušati da nam dobro bude što poslušasmo glas Jahve, Boga svojega.”
7 Mgbe ụbọchị iri gasịrị okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị.
Poslije deset dana dođe riječ Jahvina Jeremiji.
8 Nʼihi ya ọ kpọrọ Johanan nwa Kariya, ndịisi agha ya na ha so na ndị Izrel niile, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu.
Tada on pozva Johanana, sina Kareahova, sve vojne zapovjednike koji bijahu s njim i sav narod, malo i veliko,
9 Mgbe ha bịara, ọ gwara ha okwu sị ha, “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Chineke Izrel, onye unu zigara m ka m wegara arịrịọ unu, sịrị:
te im reče: “Ovako govori Jahve, Bog Izraelov, kojemu ste me poslali da izlijem preda nj molbu vašu:
10 ‘Ọ bụrụ na unu anọgide nʼala a, aga m ewuli unu elu; agaghị m akwada unu. Aga m akụkwa unu dịka osisi, gharakwa ihopu unu. Nʼihi na ihe ọjọọ ahụ m mere ka ọ bịakwasị unu na-ewute m nke ukwuu.
'Ako budete mirno živjeli u zemlji ovoj, podići ću vas i neću vas više razoriti; posadit ću vas, a ne iskorijeniti. Jer se kajem za zlo koje sam vam nanio.
11 Unu atụla eze Babilọn egwu, bụ onye unu na-atụ egwu ya ugbu a. Unu atụla ya egwu, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, nʼihi na anọnyeere m unu, aga m azọpụta unu, napụtakwa unu site nʼaka ya.
Ne bojte se kralja babilonskoga od koga strahujete. Ne bojte ga se - riječ je Jahvina - jer ja sam s vama da vas spasim i izbavim iz ruku njegovih.
12 Aga m enwe obi ebere nʼebe unu nọ, si otu a mee ka ya onwe ya nweekwa obi ebere nʼebe unu nọ. Ọ ga-emekwa ka unu nwetaghachikwa ala unu.’
I ja ću vam pribaviti milost da vam se smiluje i pusti vas da u zemlji svojoj živite.'
13 “Ma ọ bụrụ na unu onwe unu asị, ‘Anyị agaghị anọgide nʼala a,’ si otu a nupu isi nʼebe Onyenwe anyị Chineke unu nọ;
Ako pak kažete: 'Nećemo ostati u ovoj zemlji', ne pokoravajući se glasu Jahve, Boga svoga,
14 ọ bụrụkwa na unu asị, ‘Mba, anyị ga-aga biri nʼala Ijipt ebe anyị na-agaghị ahụ agha, maọbụ nụ ụda opi ike, maọbụ nọọ agụụ nʼihi enweghị ihe oriri,’
ako kažete: 'Ne, u Egipat idemo, rata više da ne vidimo, glasa bojnog roga više da ne čujemo, da ne moramo biti više gladni kruha; da, onamo idemo',
15 mgbe ahụ, nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu ndị fọdụrụ na Juda. Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu anọgidesie ike na mkpebi unu ịga Ijipt ibiri nʼebe ahụ, ọ bụrụkwa na unu agaa biri nʼIjipt nʼeziokwu,
onda čujte riječ Jahvinu, vi koji ste Ostatak Judeje: Ovako govori Jahve nad Vojskama, Bog Izraelov: 'Ako ste odlučili krenuti u Egipat da ondje živite,
16 mgbe ahụ, mma agha ahụ unu na-atụ egwu ga-eru unu nʼahụ, ụnwụ ahụ unu na-atụ oke egwu ya ga-esoro unu baa nʼIjipt. Unu ga-anwụkwa nʼebe ahụ.
mač kojega se plašite u zemlji će vas egipatskoj dostići; glad od koje strahujete, u Egiptu će vam biti za petama: i ondje ćete umrijeti!
17 Nʼezie, ndị ahụ niile kpebiri ịga biri nʼIjipt ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe. O nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-afọdụ ndụ, o nweghị onye ọbụla nʼime ha ga-agbanarị ihe ọjọọ ahụ m ga-eme ka ọ bịakwasị ha.’
I svi oni koji odluče da odu u Egipat i da se ondje nasele, poginut će od mača, gladi i kuge: nitko živ neće umaći nesreći koju ću na njih svaliti.'
18 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, ‘Dịka iwe m na ọnụma m bụ ihe awụkwasịrị nʼelu ndị bi na Jerusalem, otu a ka m ga-esi wụkwasịkwa unu ọnụma m, mgbe unu ga-aga Ijipt. Unu ga-aghọ ihe ọbụbụ ọnụ na ihe iju anya, ihe nkọcha na ihe ịta ụta. Unu agakwaghị ahụ ebe a anya ọzọ.’
Jer ovako govori Jahve nad Vojskama, Bog Izraelov: 'Kao što se srdžba moja i bijes moj oboriše na Jeruzalemce, tako će se gnjev moj izliti i na vas ako pođete u Egipat: postat ćete prokletstvo, užas, kletva i poruga, a ovoga mjesta nikad više nećete ugledati.'
19 “Unu bụ ndị fọdụrụ na Juda, lee na Onyenwe anyị agwala unu sị, ‘Unu agala Ijipt.’ Matanụ nke ọma na m adọọla unu aka na ntị,
Vama, koji ste Ostatak Judeje, Jahve poručuje da ne idete u Egipat. Dobro znajte da sam danas bio svjedok protiv vas.
20 na unu mehiere nʼobi unu mgbe unu ziri m sị m jụta Onyenwe anyị Chineke unu ase. Mgbe ahụ, unu rịọrọ m sị m, ‘Rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ, gwa anyị ihe niile o kwuru, anyị ga-emekwa ya.’
Jer sami sebe obmanjujete. TÓa vi ste me poslali k Jahvi, Bogu svome rekavši: 'Zagovaraj nas pred Jahvom, Bogom našim, i saopći nam sve što ti on objavi, i mi ćemo to učiniti.'
21 Agwala m unu taa ihe o kwuru, ma unu ajụla ime ihe ahụ niile Onyenwe anyị Chineke unu, bụ onye unu zigara m ka m jekwuru, kwuru.
A danas sam vam objavio, ali vi ne slušate više glasa Jahve, Boga svojega, koji me k vama posla.
22 Ya mere, matanụ ya nke ọma taa na unu ga-anwụ site na mma agha, na site nʼụnwụ, na site nʼọrịa na-efe efe, nʼebe ahụ unu chọrọ ịga biri.”
Znajte, dakle, dobro: od mača, gladi i kuge poginut ćete na mjestu kamo hoćete da odete da se ondje naselite.”