< Jeremaya 40 >

1 Mgbe oge nta gasịrị site nʼoge Nebuzaradan ọchịagha ndị nche nọ na Rema mere ka Jeremaya nwere onwe ya, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị. Nebuzaradan hụrụ Jeremaya mgbe e kekọtara ya na ndị e si na Jerusalem na Juda dọta nʼagha agbụ, bụ ndị ahụ a na-ebula Babilọn.
The word which came to Jeremiah from Jehovah, after that Nebuzaradan, captain of the guard, had let him go from Ramah. For he had taken him, and he had been bound with chains among all the captives of Jerusalem and Judah which were carried away captive to Babylon.
2 Mgbe ọchịagha ndị nche eze a hụrụ Jeremaya, ọ sịrị ya, “Ọ bụ Onyenwe anyị Chineke gị nyere iwu na ihe ọjọọ ndị a ga-abịakwasị ala a.
And the captain of the guard took Jeremiah, and said to him: “Jehovah, thy God, pronounced this evil against this place;
3 Ugbu a kwa Onyenwe anyị emeela ka ihe o kwuru mezuo. O wetarala ala a mbibi ahụ. Ma ihe ndị a niile mezuru nʼihi na ndị gị mehiere megide Onyenwe anyị, jụ irubere ya isi.
and now Jehovah hath brought it, and done according as he spake, because ye sinned against Jehovah, and obeyed not his voice; therefore hath this thing come upon you.
4 Ma taata, ana m eme ka i nwere onwe gị site nʼagbụ nke e kere gị na nkwoji aka. Ọ bụrụ na ị chọọ, soro m gaa Babilọn. Nʼebe ahụ, aga m elezi gị anya nke ọma. Ọ bụrụkwa na i kpebie na ị gaghị eso m gaa Babilọn, abịala. Ma, lee, ala a niile dị gị nʼihu. Jee ka i biri nʼakụkụ ya ọbụla dị gị mma; jegharịakwa nʼebe ọbụla ị chọrọ.”
And now, behold, I loose thee this day from the chains upon thy hands. If it seem good to thee to come with me to Babylon, come; and I will set my eyes upon thee; but if it seem evil to thee to come with me to Babylon, forbear; behold, the whole land is before thee; whither it seemeth good and desirable for thee to go, thither go.”
5 Ma tupu Jeremaya atụgharịa ịhapụ ya pụọ, Nebuzaradan gwakwara ya ọzọ sị, “Laghachikwuru Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, onye eze Babilọn họpụtara ka ọ na-elekọta obodo Juda niile. Gaa soro ya biri nʼetiti ndị gị, maọbụ i nwere ike gaa ebe ọbụla ọzọ dị gị mma.” Mgbe ahụ, ọchịagha ahụ nyere ya ihe oriri hiri nne. O nyekwara ya onyinye, hapụ ya ka ọ laa.
And while he was not yet gone away [[he said]]: “Go to Gedaliah, the of son Ahikam, the son of Shaphan, whom the king of Babylon hath made governor over the cities of Judah, and dwell with him among the people; or go whithersoever it seemeth good to thee to go.” And the captain of the guard gave him provisions, and a present, and dismissed him.
6 Ya mere, Jeremaya jekwuuru Gedaliya nwa Ahikam na Mizpa, soro ya na ndị fọdụrụ nʼala ahụ biri.
And Jeremiah went to Gedaliah, the son of Ahikam, to Mizpah, and dwelt with him among the people that were left in the land.
7 Mgbe ndịisi agha ahụ niile na ndị ikom ha, bụ ndị gbalagara nʼọhịa, nụrụ na eze Babilọn emeela Gedaliya nwa Ahikam, onye na-achị ala ahụ, na onye nlekọta ndị ikom na ndị inyom, na ụmụntakịrị, bụ ndị ogbenye ọnụ ntụ, ndị a na-eburughị gaa Babilọn, ka ha gaa biri nʼala ọzọ,
Now when all the captains of the forces which were in the fields, they and their men, heard that the king of Babylon had made Gedaliah, the son of Ahikam, governor over the land, and had committed to his charge men and women and children, of the poor of the land, of them that were not carried away captive to Babylon,
8 ha bịakwutere Gedaliya na Mizpa. Ndị bịakwutere ya bụ ndị a; Ishmel nwa Netanaya, Johanan na Jonatan ụmụ Kariya, na Seraya nwa Tanhumet, na ụmụ Efai onye Netofa, na Jaazanaya nwa Maaka, na ndị ikom ha.
then they came to Gedaliah, to Mizpah; namely, Ishmael, the son of Nethaniah, and Johanan and Jonathan, the sons of Kareah, and Seraiah, the son of Tanhumeth, and the sons of Ephai the Netophathite, and Jezaniah, the son of the Maachathite, they and their men;
9 Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ṅụọrọ ha iyi, ṅụkwaara ndị ikom ha iyi, sị, “Unu atụla egwu ife ndị Babilọn: birinụ nʼala a, feekwa eze Babilọn, ihe ga-agara unu nke ọma.
and Gedaliah, the son of Ahikam, the son of Shaphan, swore to them and to their men, saying, “Fear not to serve the Chaldaeans; dwell in the land, and serve the king of Babylon, and it shall be well with you.
10 Mụ onwe m ga-ebi na Mizpa ịnọchite anya unu nʼihu ndị Babilọn ga-abịakwute anyị, ma gaanụ chịkọtaa mkpụrụ vaịnị niile, na mkpụrụ niile e kwesiri ịghọkọta nʼoge okpomọkụ, na mmanụ niile. Chikọtanụ ha tinye ha nʼime ite ichebe nri unu. Birikwanụ nʼobodo ahụ niile unu nwetara.”
As for me, behold, I will dwell at Mizpah, to stand before the Chaldaeans, who shall come to us; but ye, gather ye in wine, and summer fruits, and oil, and put them in your vessels, and dwell in your cities which ye have taken.”
11 Mgbe ndị Juu niile nọ na Moab, na Amọn, na Edọm, na nʼobodo ndị ọzọ niile nụrụ na eze Babilọn hapụrụ ụfọdụ ka ha biri na Juda, na ọ họpụtara Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, mee ya onye na-achị ndị ahụ niile,
Also when all the Jews that were in Moab, and among the children of Ammon, and in Edom, and that were in all the countries, heard that the king of Babylon had left a remnant to Judah, and that he had set over them Gedaliah, the son of Ahikam, the son of Shaphan,
12 ha niile si nʼebe ahụ ha nọ lọghachikwa nʼala Juda. Ha lọkwutere Gedaliya na Mizpa, site na mba ndị ahụ niile a chụgara ha. Ha chịkọtakwara mmanya vaịnị, na mkpụrụ dị ukwuu, bụ mkpụrụ nke na-acha nʼoge okpomọkụ.
then all the Jews returned from all the places whither they were driven, and came to the land of Judah, to Gedaliah, to Mizpah, and gathered wine and summer fruits in abundance.
13 Johanan nwa Kariya, na ndịisi agha niile nọ nʼọhịa bịakwutere Gedaliya na Mizpa
And Johanan, the son of Kareah, and all the captains of the forces that were in the fields, came to Gedaliah, to Mizpah,
14 sị ya, “Ọ bụ na i maghị na Baalis eze ndị Amọn ezitela Ishmel nwa Netanaya ka ọ bịa gbuo gị?” Ma Gedaliya nwa Ahikam ekwetaghị na ọ bụ eziokwu ka ha na-ekwu.
and said to him, “Dost thou know that Baalis, the king of the children of Ammon, hath sent Ishmael, the son of Nethaniah, to slay thee?” But Gedaliah, the son of Ahikam, believed them not.
15 Mgbe ahụ, Johanan nwa Kariya pụrụ na nzuzo jekwuru Gedaliya na Mizpa sị ya, “Biko, kwere ka m gaa gbuo Ishmel nwa Netanaya. O nweghị onye ga-amata otu o si nwụọ. Nʼihi gịnị ka ọ ga-eji gbuo gị, ime ka ndị Juu niile na-alọghachikwute gị gbasasịakwa ọzọ, na imekwa ka ndị Juda fọdụrụ laa nʼiyi?”
And Johanan, the son of Kareah, spake to Gedaliah in private at Mizpah, saying, “Let me go, I pray thee, and smite Ishmael, the son of Nethaniah, and no man shall know it. Wherefore should he slay thee, that all the Jews which are gathered to thee should be scattered, and the remnant in Judah perish?”
16 Ma Gedaliya nwa Ahikam zara Johanan nwa Kariya sị ya, “Biko, emela ihe dị otu ahụ! Nʼihi na ihe ị na-ekwu banyere Ishmel abụghị eziokwu.”
But Gedaliah, the son of Ahikam, said to Johanan, the son of Kareah, “Thou shalt not do this thing, for thou speakest falsely of Ishmael.”

< Jeremaya 40 >