< Jeremaya 4 >

1 “Ọ bụrụ na unu bụ Izrel, ga-alọta, ka Onyenwe anyị kwubiri, mụ ka ị ga-alọghachikwute,” “Ọ bụrụ na unu ewezuga arụsị ndị ahụ rụrụ arụ site nʼihu m, hapụ isi ebe m nọ kpafuo,
Ако ћеш се вратити, Израиљу, вели Господ, к мени се врати, и ако уклониш гадове своје испред мене, нећеш се скитати.
2 ọ bụrụkwa na unu ga-eji eziokwu, ikpe ziri ezi na ụzọ ezi omume ṅụọ iyi sị, ‘Dịka Onyenwe anyị na-adị ndụ,’ mgbe ahụ mba niile ga-agọzi onwe ha site na ya nyakwaa isi nʼime ya.”
И клећеш се истинито, верно и право: Тако да је жив Господ. И народи ће се благосиљати Њим, и Њим ће се хвалити.
3 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị na-agwa ndị Juda na Jerusalem sị, “Kọzeenụ ala ubi unu nke unu na-akọbeghị; unu akụnyela mkpụrụ ubi unu nʼetiti ogwu.
Јер овако вели Господ Јудејцима и Јерусалимљанима: орите себи крчевину, и не сејте у трње.
4 Bienụ onwe unu ugwu nye Onyenwe anyị, biekwanụ mkpụrụobi unu ugwu, unu ndị Juda na ndị bi na Jerusalem ma ọ bụghị otu a, iwe m ga-abịakwasị unu dịka ọkụ, nʼihi ihe ọjọọ niile unu mere, ọ ga-ere ma ọ dịkwaghị onye ga-emenyụ ya.
Обрежите се Господу, и скините окрајак са срца свог, Јудејци и Јерусалимљани, да не изиђе јарост моја као огањ и разгори се да не буде никога ко би угасио за зла дела ваша.
5 “Kwupụta ya na Juda, kwusaa ya na Jerusalem sị, ‘Fụọnụ opi nʼala ahụ niile.’ Tienụ mkpu nʼụzọ mmadụ ga-aghọta ya. Gwanụ ndị Juda na Jerusalem ka ha zukọtaa gbaga nʼobodo ndị ahụ niile e wusiri ike.
Објавите у Јудеји и огласите у Јерусалиму и реците: трубите у трубу по земљи; вичите, сазовите народ и реците: Скупите се, и уђимо у тврде градове.
6 Bulie ihe i gosi ụzọ ị ga Zayọn! Gbaganụ zoo onwe unu. Unu atụfula oge! Lee na mụ onwe m na-ewebata mbibi na ịla nʼiyi site nʼakụkụ ugwu.”
Подигните заставу према Сиону, бежите и не стајте, јер ћу довести зло од севера и погибао велику.
7 Dịka ọdụm si nʼebe o zoro onwe ya amapụta, ka onye a na-ebibi mba niile si abịa. Ọ hapụla ebe obibi ya, na-abịa ịla Juda nʼiyi. Ọ ga-etidasị obodo niile nke Juda, ọ dịkwaghị onye ga-ebi nʼime ha.
Излази лав из честе своје и који затире народе кренувши се иде с места свог да обрати земљу твоју у пустош, градови твоји да се раскопају да не буде никога у њима.
8 Ya mere, yikwasịnụ onwe unu uwe mkpe; kwaanụ akwa, tiekwanụ mkpu akwa, nʼihi na ọnụma Onyenwe anyị esitebeghị nʼebe Juda nọ wezuga onwe ya.
За то припашите кострет, плачите и ридајте, јер се жестоки гнев Господњи није одвратио од нас.
9 “Nʼụbọchị ahụ,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Obi ndị eze na ndịisi ọchịchị ga-ada mba; ahụ ga-akpọnwụ ndị nchụaja, otu a kwa, ihe ga-eme ga-eju ndị amụma anya.”
И тада ће, вели Господ, нестати срца цару и срца кнезовима, и свештеници ће се удивити и пророци ће се зачудити.
10 Mgbe ahụ ekwuru m sị; “Ewoo, Onye kachasị ihe niile elu, bụ Onyenwe anyị lee na ị ghọgbuola ndị a na Jerusalem site na ị sị, ‘Unu ga-enwe udo,’ mgbe mma agha dị anyị nʼolu.”
И рекох: Ах Господе Господе! Баш си преварио овај народ и Јерусалим говорећи: Имаћете мир, а мач дође до душе.
11 Nʼoge ahụ, a ga-agwa ndị a na Jerusalem, “Ifufe dị ọkụ, nke sitere nʼebe dị elu ihe na-adịghị si nʼọzara na-efebata irute ndị m. Ma ọ bụghị ifufe maka ịfụcha, maọbụ ime ka adị ọcha,
У то ће се време казати овом народу и Јерусалиму: Ветар врућ с високих места у пустињи дува ка кћери народа мог, не да провеје ни прочисти.
12 ọ bụ ifufe nke dị oke ike karịa nke na-esite na mụ. Ugbu a, ana m ekwupụta okwu ikpe m megide ha.”
Ветар јачи од тих доћи ће ми; и ја ћу им сада изрећи суд.
13 Lee anya, ha na-abịa dịka igwe ojii. Ụgbọala agha ya na-abịa dịka oke ifufe, ịnyịnya ha niile na-agbasikwa ọsọ ike karịa ugo. Ahụhụ dịrị anyị, anyị abụrụla ndị e bibiri ebibi! Anyị abụrụla ndị na-aga ịla nʼiyi!
Гле, као облак подиже се, и кола су му као вихор, коњи су му бржи од орлова. Тешко нама! Пропадосмо.
14 Jerusalem, sachapụ mmehie dị gị nʼobi, ka a zọpụta gị. Ruo ole mgbe ka echiche mmehie ga-ejupụta gị obi?
Умиј срце своје од зла, Јерусалиме, да би се избавио; докле ће стајати у теби мисли твоје ништаве?
15 Otu olu na-akpọsa site na Dan, ọ na-akpọsa ịla nʼiyi site nʼugwu niile nke Ifrem.
Јер глас јавља од Дана, и оглашује зло од горе Јефремове.
16 “Gwa mba niile otu a, ha abịala, kpọsaa banyere Jerusalem: ‘Ndị agha ga-agba gị gburugburu na-abịa site nʼala dị anya, na-eti mkpu agha megide obodo niile nke Juda.
Казујте народима; ево оглашујте за Јерусалим да иду стражари из далеке земље, и пуштају глас свој на градове Јудине.
17 Ha ga-agbakwa Jerusalem gburugburu dịka ndị agha na-eche ubi a gbara ogige nche, nʼihi na ndị bi nʼime ya enupula isi megide m,’” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Као чувари пољски стаће око њега, јер се одметну од мене, вели Господ.
18 “Ụzọ gị na omume gị niile buteere gị ihe ndị a. Nke a bụ ntaramahụhụ gị. Lee ka o si dị ilu! Lee ka o si emibanye nʼime obi.”
Пут твој и дела твоја то ти учинише; то је од зла твог да је горко и да ти допире до срца.
19 Ihe mgbu a dị ukwuu. Lee na apụghị m ịnagide ya. Obi m o, obi m o! Lee ka obi m si ada m gbim gbim gbim. Apụghịkwa m ịnọ jụụ. Ana m anụ ụda opi ike, na-anụkwa ụzụ agha.
Јаох утроба, јаох утроба! Боли ме у срцу; срце ми бије; не могу ћутати; јер глас трубни чујеш, душо моја, вику убојну.
20 Mbibi na-arị mbibi ibe ya elu, lee na a laala ala a niile nʼiyi. Na mberede, e bibiela ụlọ ikwu anyị niile; a dọkasịkwala akwa mgbochi ha niile.
Погибао на погибао оглашује се; јер се пустоши сва земља, наједанпут ће се опустошити моји шатори, завеси моји за час.
21 Ruo ole mgbe ka m ga-anọgide na-ahụ ọkọlọtọ agha ndị a a na-alụ? Ruo ole mgbe kwa ka m ga-anọgide na-anụ ụda opi ike?
Докле ћу гледати заставу? Слушати глас трубни?
22 “Ndị m bụ ndị nzuzu, ha amaghị m. Ha bụ ụmụntakịrị ndị na-enweghị uche, ha enweghị nghọta ọbụla. Ha bụ ọkachamara nʼihe gbasara ajọ omume, ma ha amaghị otu esi eme ezi ihe ọbụla.”
Јер је народ мој безуман, не познаје ме, луди су синови и без разума, мудри су да зло чине, а добро чинити не умију.
23 Elere m anya nʼụwa hụ na ọ bụ ihe tọgbọrọ nʼefu, leekwa anya na mbara eluigwe, ma o nweghị ìhè dị ya.
Погледах на земљу, а гле, без обличја је и пуста; и на небо, а светлости његове нема.
24 Elere m anya nʼugwu ukwu, hụ na ha na-ama jijiji, leekwa anya nʼugwu nta, hụ na ha na-aṅagharị aṅagharị.
Погледах на горе, а гле, тресу се и сви хумови дрмају се.
25 Elere m anya ma ahụghị mmadụ ọbụla, ụmụ nnụnụ niile dị na mbara eluigwe efefusịala.
Погледах, а гле, нема човека, и све птице небеске одлетеле.
26 Ala ọma ahụ aghọọla ọzara, obodo niile aghọọla mkputamkpu ebe nʼihu Onyenwe anyị, nʼihu oke iwe ya.
Погледах, а гле, Кармил је пустиња и сви градови његови оборени од Господа, од жестоког гнева Његовог.
27 Ihe a ka Onyenwe anyị kwuru, “A ga-ebibi ala ahụ niile, ma agaghị m ebibicha ya kpamkpam.
Јер овако говори Господ: Сва ће земља опустети; али нећу сасвим затрти.
28 Ụwa ga-eru ụjụ, mbara eluigwe ga-agbakwa ọchịchịrị. Nʼihi na ekwuola ya, agaghị m agbanwe obi m. Ekpebiela m ya, agaghị m alakwa azụ nʼihe m zubere ime.”
Зато ће тужити земља, и небо ће горе потамнети, јер рекох, намислих, и нећу се раскајати, нити ћу ударити натраг.
29 Ndị mmadụ niile ga-agbapụ ọsọ site nʼobodo ha mgbe ha nụrụ ụzụ ndị agha na-agba ụta nọ nʼelu ịnyịnya na-abịa nso nso. Ha ga-ezo onwe ha nʼọhịa; ndị ọzọkwa ga-agbalaga zoo onwe ha nʼugwu ukwu. Obodo ha niile ga-atọgbọrọkwa nʼefu, mgbe ndị mmadụ si nʼime ya gbapụ ọsọ nʼihi oke ihe egwu.
Од вике коњика и стрелаца побећи ће сви градови, отићи ће у густе шуме и на стене ће се попети; сви ће градови бити остављени и нико неће у њима живети.
30 Gịnị bụ nke a, gị onye na-enweghị olileanya? Gịnị mere unu ji yiri uwe uhie, were ọlaolu ọlaedo dị oke ọnụ yiri nʼolu? Gịnị mere unu ji were ihe ịchọ mma tee nʼanya unu? Nʼefu ka unu na-eme onwe unu ka unu dị mma. Ndị iko unu na-elelị unu; ndụ unu ka ha na-achọkwa.
А ти, опустошена, шта ћеш чинити? Ако се и облачиш у скерлет, ако се и китиш накитом златним, и мажеш лице своје, залуду се красиш, презиру те милосници, траже душу твоју.
31 Ana m anụ olu iti mkpu akwa nke yiri olu akwa nwanyị ime na-eme, ọ dị ka ude nwanyị na-agbalị ịmụpụta nwa mbụ ya. Ma olu akwa m nụrụ bụ nke ada Zayọn, ebe ọ nọ na-eku ume ike ike. Ọ dara nʼala gbasapụ aka ya, ma na-akwa akwa na-asị, “Onye nwụrụ anwụ ka m bụ! Lee, ndụ m ka e nyere ndị ogbu mmadụ.”
Јер чујем глас као породиљин, цвиљење као жене која се први пут порађа, глас кћери сионске, која рида, пружа руке своје говорећи: Тешко мени! Јер ми нестаје душа од убилаца.

< Jeremaya 4 >