< Jeremaya 39 >
1 Otu a ka e si dọta Jerusalem nʼagha. Nʼafọ nke itoolu, nke ọchịchị Zedekaya eze Juda, nʼọnwa nke iri ya, Nebukadneza eze Babilọn duuru ndị agha ya niile bịa ibuso Jerusalem agha, Ha gbara ya gburugburu, nọchibido ya.
Ngomnyaka wesificamunwemunye kaZedekhiya inkosi yakoJuda, ngenyanga yetshumi, uNebhukhadineza inkosi yaseBhabhiloni waya eJerusalema lebutho lakhe lonke wayivimbezela.
2 Nʼụbọchị nke itoolu, nʼọnwa nke anọ, nʼafọ nke iri na otu nke ọchịchị Zedekaya, ha gwupuru mgbidi obodo ahụ.
Ngosuku lwesificamunwemunye lwenyanga yesine, yomnyaka wetshumi lanye kaZedekhiya umduli wedolobho wadilizwa.
3 Mgbe ahụ, ndịisi niile nke eze Babilọn batara were ọnọdụ ha nʼọnụ ụzọ ama nke Etiti. Ndị a bụ ndị batara: Negal-Shareza onye Samga, na Nebo-Sasekim, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza onyeisi nke ọkwa ya dị elu, na ndịisi niile ọzọ nke eze Babilọn ndị fọdụrụ.
Emva kwalokho zonke izikhulu zenkosi yaseBhabhiloni zafika zahlala eSangweni laPhakathi: kwakunguNerigali-Shareza oweSamugari, loNebho-Sarisekhimi induna yezikhulu, loNerigali-Shareza, indunankulu kanye lezinye zonke izikhulu zenkosi yaseBhabhiloni.
4 Mgbe Zedekaya eze Juda na ndị agha ya niile hụrụ ha, ha gbapụrụ ọsọ. Ha ji abalị gbapụ nʼobodo ahụ site nʼọnụ ụzọ ama nke dị nʼetiti mgbidi abụọ nʼakụkụ ubi eze a gbara ogige, chee ihu nʼụzọ Araba.
Kwathi lapho uZedekhiya inkosi yakoJuda lamabutho wonke bebabona babaleka. Basuka edolobheni ebusuku ngendlela yasesivandeni senkosi, baphuma ngesango eliphakathi kwemiduli, baqonda e-Arabha.
5 Ma ndị agha ndị Babilọn chụsoro ha nʼazụ, chụkwute Zedekaya na mbara ala Jeriko. Ha jidere ya, kpụgara ya Nebukadneza eze Babilọn, nʼobodo Ribla, nke dị nʼala Hamat, ebe ọ nọ maa ya ikpe.
Kodwa ibutho lamaKhaladiya laxotshana labo, lafica uZedekhiya emagcekeni aseJerikho. Lamthumba, laselimusa kuNebhukhadineza inkosi yaseBhabhiloni eRibhila, elizweni laseHamathi, lapho amgweba khona.
6 Ọ bụ na Ribla, ka eze Babilọn nọ gbuo ụmụ ndị ikom Zedekaya niile nʼihu ya. Ebe ahụ ka a nọkwa gbuo ndị Juda niile a na-asọpụrụ.
Inkosi yaseBhabhiloni yawabulalela khona eRibhila amadodana kaZedekhiya emehlweni akhe, yabulala lezikhulu zasesikhosini zonke zakoJuda.
7 Emesịa, ọ ghụpụrụ Zedekaya anya ya abụọ, jiri ụdọ bronz kee ya agbụ kpọrọ ya gaa Babilọn.
Emva kwalokho uZedekhiya yamkhupha amehlo yasimbopha ngamaketane ethusi ukuba imuse eBhabhiloni.
8 Ndị Babilọn sunyere ụlọeze na ụlọ ndị mmadụ niile ọkụ, kwatukwa mgbidi niile nke Jerusalem.
AmaKhaladiya atshisa isigodlo ngomlilo lezindlu zabantu, badiliza lemiduli yeJerusalema.
9 Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, buuru ndị niile fọdụrụ nʼobodo, ha na ndị ahụ buuru ụzọ jekwuru ya, na ndị ọzọ fọdụrụ, bulaa ha Babilọn, dịka ndị a dọtara nʼagha.
UNebhuzaradani umlawuli wabalindi besikhosini, wathatha abantu ababesele edolobheni ndawonye lalabo ababebalekele kuye kanye labanye abantu wabasa ekuthunjweni eBhabhiloni.
10 Ma Nebuzaradan bụ ọchịagha ndị nche eze, hapụrụ ụfọdụ ndị ogbenye, ndị na-enweghị ihe ọbụla nʼala Juda. Nʼoge ahụ, o nyere ha ubi vaịnị a gbara ogige na ala ubi niile.
Kodwa uNebhuzaradani watshiya elizweni lakoJuda abanye babantu abangabayanga ababengelalutho olungolwabo; njalo ngalesosikhathi wabapha izivini lamasimu.
11 Ugbu a, Nebukadneza eze Babilọn enyelarị Nebuzaradan ọchịagha ndị nche eze iwu banyere Jeremaya, sị,
UNebhukhadineza inkosi yaseBhabhiloni wayelaye uNebhuzaradani umlawuli wabalindi besikhosini ngoJeremiya wathi,
12 “Kpọrọ ya, lekọtazie ya anya nke ọma; emekwala ya ihe ọjọọ ọbụla, kama meere ya ihe ọbụla ọ rịọrọ gị.”
“Umthathe, umgcine kuhle; ungamlimazi kodwa umenzele konke akucelayo.”
13 Ya mere, Nebuzaradan, ọchịagha ndị nche eze, na Nebushazban, onyeisi nʼetiti ndịisi, na Negal-Shareza, bụ onyeisi ọkwa ya dị elu, na ndịisi ndị ọzọ niile nke eze Babilọn,
Ngakho uNebhuzaradani umlawuli wabalindi, loNebhushazibhani induna yezikhulu, loNerigali-Shareza indunankulu kanye lezinye zonke izikhulu zenkosi yaseBhabhiloni
14 ziri ndị jere kpọpụta Jeremaya site nʼogige ndị nche. Ha nyefere ya nʼaka Gedaliya nwa Ahikam, nwa Shefan, ka o dulaa ya nʼụlọ ya. Ya mere, Jeremaya nọgidere nʼetiti ndị nke ya.
bathumela ukuba uJeremiya asuswe egumeni labalindi. Bamnikela kuGedaliya indodana ka-Ahikhami, indodana kaShafani, ukuba ambuyisele kibo. Ngakho wahlala labantu bakibo.
15 Ma nʼoge ahụ, Jeremaya nọ dị ka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị sị ya,
UJeremiya esavalelwe egumeni labalindi, ilizwi likaThixo lafika kuye lathi,
16 “Jekwuru Ebed-Melek onye Kush, gwa ya sị ya, ‘Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel kwuru, Lee, ana m aga ime ka okwu ahụ m kwuru megide obodo a mezuo. Ihe ga-abịakwasị obodo a bụ ịla nʼiyi, ọ bụghị ọganihu. Nʼoge ahụ, ihe ndị a ga-emezukwa nʼihu gị.
“Hamba ku-Ebhedi-Meleki umKhushi uthi kuye, ‘UThixo uSomandla, uNkulunkulu ka-Israyeli uthi: Sekuseduze ukuba ngigcwalise amazwi ami ngedolobho leli ngokulehlisela umonakalo, hatshi ukuphumelela. Ngalesosikhathi azagcwaliseka phambi kwamehlo enu.
17 Ma aga m anapụta gị nʼụbọchị ahụ, otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. A gaghị enyefe gị nʼaka ndị ahụ ị na-atụ egwu ha.
Kodwa ngizakuhlenga ngalolosuku, kutsho uThixo; kawuyikunikelwa kulabo obesabayo.
18 Aga m azọpụta gị. Ị gakwaghị ada site na mma agha kama ị ga-agbapụkwa na ndụ, nʼihi na ị tụkwasịrị m obi.’” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya.
Ngizakusindisa, kawuyikubulawa ngenkemba kodwa uzaphunyuka lokuphila kwakho, ngoba ungithembile, kutsho uThixo.’”