< Jeremaya 37 >

1 Emesịa, Nebukadneza eze Babilọn mere Zedekaya nwa Josaya eze Juda, nʼọnọdụ Konaya nwa Jehoiakim.
Now King Zedekiah, the son of Josiah, reigned instead of Coniah, the son of Jehoiakim, whom Nebuchadnezzar, king of Babylon, made king in the land of Judah.
2 Ma Zedekaya na ndị ozi ya, na ndị Juda niile egeghị ntị nʼokwu Onyenwe anyị nke o si nʼọnụ Jeremaya onye amụma gwa ha.
But neither he nor his servants nor the people of the land regarded the words of Jehovah, which he spake by the prophet Jeremiah.
3 Zedekaya bụ eze, ziri Jehukal nwa Shelemaya, na Zefanaya onye nchụaja, bụ nwa Maaseia ozi sị ha, jekwuru Jeremaya onye amụma gwa ya okwu sị, “Biko, kpeere anyị ekpere, rịọrọ anyị Onyenwe anyị Chineke anyị arịrịọ.”
And Zedekiah the king sent Jehucal, the son of Shelemiah, and Zephaniah, the son of Maaseiah the priest, to Jeremiah the prophet, saying, “Pray now to Jehovah our God for us.”
4 Nʼoge a, Jeremaya nweere onwe ya ijegharị nʼetiti ndị Izrel, nʼihi na ha etinyebeghị ya nʼụlọ mkpọrọ.
Now Jeremiah came in and went out among the people, for they had not cast him into prison.
5 Nʼihi na mgbe ndị agha Babilọn gbara Jerusalem gburugburu na-ebuso ya agha, ndị agha Fero sitere Ijipt na-apụkwute ha ibuso ha agha. Mgbe ndị agha Babilọn nụrụ na ndị agha Ijipt na-abịa, ha mere ngwangwa si nʼibuso Jerusalem agha wezuga onwe ha.
And Pharaoh's army had come forth out of Egypt; and the Chaldaeans, who were besieging Jerusalem, having heard tidings of them, had departed from Jerusalem.
6 Mgbe ahụ, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya onye amụma ntị sị ya,
Then came the word of Jehovah to Jeremiah the prophet, saying,
7 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị bụ Chineke Izrel kwuru, Ihe ndị a ka ị ga-agwa eze Juda onye zitere ozi sị gị rịọọ m arịrịọ, ‘Ndị agha Fero ahụ si nʼIjipt pụta bịa inyere unu aka ga-emesịa laghachi nʼala ha bụ Ijipt.
Thus saith Jehovah, the God of Israel: Thus shall ye say to the king of Judah, who sent you to inquire of me: Behold, the army of Pharaoh, which is come forth to help you, shall return to Egypt, into their own land.
8 Mgbe ahụ, ndị agha Babilọn ga-alọghachikwa ibuso obodo a agha. Ha ga-emeri ya, dọta ya nʼagha, kpọọkwa ya ọkụ.’
And the Chaldaeans shall come again, and fight against this city, and take it, and burn it with fire.
9 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, Unu arafula onwe unu site nʼiche echiche sị, ‘Ndị Babilọn agaghị abịakwa ibuso anyị agha.’ E, ha agaghị abịakwa ọzọ.
Thus saith Jehovah: Deceive not yourselves, saying, “The Chaldaeans shall surely depart from us”; for they shall not depart.
10 A sịkwa na ndị agha unu enwee ike merie ndị agha Babilọn ahụ ga-abịa ibuso unu agha, a sịkwa na ọ bụ naanị ndị e merụrụ ahụ bụ ndị fọdụrụ nʼetiti ha, ndị a ga-esi nʼogige ndị agha Babilọn pụta bịa kpọọ obodo a ọkụ.”
For though ye had smitten the whole army of the Chaldaeans that fight against you, and there remained only wounded men among them, each one in his tent, yet should they rise up and burn this city with fire.
11 Mgbe ndị agha Babilọn si na gburugburu Jerusalem wezuga onwe ha nʼihi ọbịbịa ndị agha Fero na-abịa,
And it came to pass, when the army of the Chaldaeans had marched away from Jerusalem because of the army of Pharaoh,
12 Jeremaya sitekwara na Jerusalem pụọ malite ịgawa nʼala ndị Benjamin, nʼihi iketa oke ruuru ya site nʼaka ndị bi nʼebe ahụ.
that Jeremiah was going forth from Jerusalem, to go into the land of Benjamin, to receive thence his inheritance among the people.
13 Ma mgbe o ruru nʼọnụ ụzọ ama Benjamin, onyeisi ndị agha aha ya bụ Irija nwa Shelemaya, nwa Hananaya jidere ya, boo ya ebubo sị ya, “Ọ bụ ọsọ ka ị na-agba! Ị na-achọ ịgbakwuru ndị Babilọn!”
And when he was in the gate of Benjamin, a captain of the ward was there, whose name was Irijah, the son of Shelemiah, the son of Hananiah; and he seized Jeremiah the prophet, saying, “Thou art going over to the Chaldaeans.”
14 Ma Jeremaya zara sị ya, “Ọ bụ okwu ụgha ka ị na-ekwu. Anaghị m agba ọsọ ịgbakwuru ndị Babilọn.” Ma Irija egeghị ya ntị, kama o jidere Jeremaya kpụta ya nʼihu ndịisi ọchịchị.
And Jeremiah said, “It is false; I am not going over to the Chaldaeans.” But he hearkened not to him; so Irijah took Jeremiah and brought him to the princes.
15 Ha were iwe megide Jeremaya, nye iwu ka e tie ya ihe, kpọchiekwa ya nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ. Nʼihi na ha ji ụlọ ahụ mere ụlọ mkpọrọ nʼoge a.
And the princes were enraged against Jeremiah, and smote him, and put him in prison in the house of Jonathan the scribe; for they had made that a prison.
16 E tinyere Jeremaya nʼime ụlọ mkpọrọ olulu, ebe ọ nọrọ ogologo oge.
And when Jeremiah had gone into the dungeon, and into the cells, and had remained there a long time,
17 Emesịa, Zedekaya bụ eze nyere iwu ka a kpọta ya nʼụlọeze. Mgbe a kpọtara ya, Zedekaya jụrụ ya ajụjụ na nzuzo sị ya, “I nwere okwu site nʼaka Onyenwe anyị?” Jeremaya zara sị ya, “E, lee, a ga-arara gị nyefee gị nʼaka eze Babilọn.”
then Zedekiah the king sent and took him out; and the king asked him in his house privately, and said, “Hast thou any word from Jehovah?” And Jeremiah said, “I have.” And he said, “Into the hand of the king of Babylon shalt thou be delivered.”
18 Mgbe ahụ, Jeremaya gwara Zedekaya, bụ eze okwu ọzọ sị ya, “Ihe ọjọọ dị aṅaa ka m mere megide gị, maọbụ megide ndị ọrụ gị, maọbụ megide ndị a, unu ji tinye m nʼụlọ mkpọrọ?
And Jeremiah said to King Zedekiah, What offence have I committed against thee, or against thy servants, or against this people, that ye have put me in prison?
19 Ebee ka ndị amụma unu nọ, bụ ndị ahụ na-eburu unu amụma na-asị unu, ‘Eze Babilọn agaghị ebuso unu agha, ọ gaghị ebusokwa ala a agha?’
And where are your prophets, who prophesied to you, saying, “The king of Babylon shall not come against you, nor against this land?”
20 Ugbu a, biko, onyenwe m eze, biko gee m ntị. Biko, nụrụ arịrịọ m: Ezighachila m nʼụlọ Jonatan, ode akwụkwọ, nʼihi na ọ bụrụ na i mee otu a, aga m anwụ nʼebe ahụ.”
But now hear, I pray thee, my lord the king! let my supplication, I pray thee, be accepted before thee, and cause me not to return to the house of Jonathan the scribe, lest I die there!
21 Zedekaya bụ eze, nyere iwu ka e debe Jeremaya nʼogige ndị nche. O nyekwara iwu ka a na-enye ya achịcha e si nʼụlọ ndị na-eme achịcha na-ewebata ụbọchị niile, tutu ruo mgbe achịcha e nwere nʼobodo ahụ gwụsịrị. Ya mere, o mere ka Jeremaya nọgide nʼogige ndị nche.
Then Zedekiah the king commanded that they should commit Jeremiah into the court of the prison, and that they should give him daily a piece of bread out of the bakers' street, until all the bread in the city should be consumed. And Jeremiah remained in the court of the prison.

< Jeremaya 37 >