< Jeremaya 36 >

1 Nʼafọ anọ nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya bụ eze Juda, okwu Onyenwe anyị ndị a ruru Jeremaya ntị,
А четврте године Јоакима, сина Јосијиног цара Јудиног, дође ова реч Јеремији од Господа говорећи:
2 “Were akwụkwọ detuo okwu ahụ niile m gwarala gị banyere Izrel, na Juda, na banyere ndị mba ọzọ dị iche iche, bụ okwu ndị ahụ m bidoro ịgwa gị site nʼoge ọchịchị Josaya ruo ugbu a.
Узми књигу и напиши у њу све речи које сам ти рекао за Израиља и Јуду и за све народе, од када ти почех говорити, од времена Јосијиног, до данас;
3 Ma eleghị anya mgbe ndị Juda nụrụ ka e kwupụtara ihe banyere ihe ọjọọ ndị ahụ m zubere, nke na-aga ịbịakwasị ha, onye ọbụla nʼime ha nʼotu nʼotu ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa. Mgbe ahụ, aga m agbaghara ha ajọ omume ha na mmehie ha.”
Еда би чуо дом Јудин све зло које им мислим учинити и вратио се свак са свог злог пута, да бих им опростио безакоње и грех њихов.
4 Ya mere, Jeremaya kpọrọ Baruk nwa Neraya ka ọ bịakwute ya. Mgbe Jeremaya nọ na-akpọpụta okwu ahụ niile Onyenwe anyị gwara ya, Baruk nọkwa na-edepụta ha nʼakwụkwọ.
Тада Јеремија дозва Варуха, сина Ниријиног, и написа Варух у књигу из уста Јеремијиних све речи Господње које му говори.
5 Emesịa, Jeremaya gwara Baruk okwu sị ya, “Ọnọdụ nke m nọ nʼime ya ugbu a agaghị ekwe ka m site nʼebe a pụọ jeruo nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
Потом заповеди Јеремија Варуху говорећи: Мени није слободно, те не могу отићи у дом Господњи.
6 Nʼihi ya, gaa nʼụlọnsọ Onyenwe anyị nʼụbọchị ibu ọnụ, nọdụ nʼebe ahụ gụpụtara ndị mmadụ okwu Onyenwe anyị ndị a ị dere nʼakwụkwọ dịka m kpọpụtara ha. Gụpụtara ya ndị Juda si obodo niile bịa nʼụlọnsọ ahụ.
Него иди ти, и прочитај из књиге коју си написао из мојих уста, речи Господње, народу у дому Господњем у дан посни, и свим Јудејцима који дођу из градова својих прочитај;
7 Ma eleghị anya, ha ga-arịọ Onyenwe anyị arịrịọ. Ma eleghị anya onye ọbụla nʼime ha ga-esite nʼụzọ ọjọọ ya tụgharịa, ka iwe na ọnụma dị ukwuu nke Onyenwe anyị ga-ekpughe megide ndị a ghara ịbịakwasị ha.”
Не би ли, молећи се, припали ка Господу и вратили се сваки са свог пута злог, јер је велик гнев и јарост што је Господ изрекао за тај народ.
8 Baruk nwa Neraya mere dịka Jeremaya onye amụma si gwa ya. Ọ gụpụtara okwu Onyenwe anyị, nke dị nʼakwụkwọ ahụ, nʼụlọnsọ Onyenwe anyị.
И учини Варух, син Ниријин, све како му заповеди пророк Јеремија, и прочита из књиге речи Господње у дому Господњем.
9 Nʼọnwa itoolu nke afọ ise nke ọchịchị Jehoiakim nwa Josaya eze Juda, e doro oge dị iche nye maka ibu ọnụ nʼihu Onyenwe anyị. E kwusara ibu ọnụ a nye ndị niile nọ na Jerusalem, na ndị si nʼobodo Juda niile bịa na Jerusalem.
А пете године Јоакима сина Јосијиног цара Јудиног месеца деветог, огласише пост пред Господом свему народу јерусалимском и свему народу који дође из градова Јудиних у Јерусалим.
10 Baruk nọ nʼọnụụlọ Gemaraya nwa Shefan, bụ ode akwụkwọ, gụpụtara ndị niile nọ nʼụlọnsọ Onyenwe anyị okwu Jeremaya, nke dị nʼakwụkwọ a dị nsọ nʼọnụ ụzọ ama ọhụrụ nke ụlọnsọ ahụ.
И прочита Варух из књиге речи Јеремијине у дому Господњем, у клети Гемарије, сина Сафановог писара, у горњем трему код нових врата дома Господњег пред свим народом.
11 Mgbe Mikaya nwa Gemaraya nwa Shefan nụrụ okwu Onyenwe anyị nke e si nʼakwụkwọ ahụ gụpụta,
А кад чу Михеј, син Гемарије, сина Сафановог, све речи Господње из књиге,
12 o si nʼebe ahụ pụọ, gaa nʼụlọ ode akwụkwọ dị nʼụlọeze, ebe ndịisi niile zukọrọ. Ndị a bụ ndị zukọrọ nʼebe ahụ; Elishama, ode akwụkwọ, na Delaya nwa Shemaya, na Elnatan nwa Akboa, na Gemaraya nwa Shefan, na Zedekaya nwa Hananaya, na ndịisi ọchịchị ndị ọzọ.
Он сиђе у дом царев у клет писареву, и гле, онде сеђаху сви кнезови, Елисама писар, и Делаја син Семајин, и Елнатан син Ахворов, и Гемарија син Сафанов, и Седекија син Ананијин, и сви кнезови.
13 Mgbe Mikaya gwara ha ihe ọ nụrụ Baruk si nʼakwụkwọ ahụ gụpụtara ndị mmadụ,
И каза им Михеј све речи што чу кад Варух читаше књигу народу.
14 ndịisi ahụ niile zipụrụ Jehudi nwa Netanaya, nwa Shelemaya, nwa Kushi, ka o jekwuru Baruk sị ya “Were akwụkwọ ahụ ị si na ya gụpụtara ndị mmadụ ihe, bịa.” Ya mere, Baruk, nwa Neraya, ji akwụkwọ a nʼaka ya jekwuru ha.
Тада сви кнезови послаше к Варуху Јудија, сина Натаније сина Селемије, сина Хусијевог, и поручише му: Књигу коју си читао народу узми у руку и дођи овамо. И узе књигу у руку Варух, син Ниријин, и дође к њима.
15 Mgbe o ruru nʼebe ahụ, ha gwara ya sị ya, “Biko, nọdụ ala gụọra anyị ihe dị nʼakwụkwọ a.” Ya mere, Baruk gụpụtara ha ihe dị nʼakwụkwọ ahụ.
И они му рекоше: Седи и читај да чујемо. И Варух им је прочита.
16 Mgbe ha nụchasịrị okwu dị nʼakwụkwọ ahụ, ha lerịtara onwe ha anya nʼegwu, gwa Baruk okwu sị ya, “Anyị aghaghị ime ka okwu ndị a ruo eze ntị.”
А кад чуше све оне речи, сви се уплашише и рекоше Варуху: Казаћемо цару све те речи.
17 Ha jụrụ Baruk sị ya, “Gwa anyị i si aṅaa detuo ihe ndị a niile? Ọ bụ Jeremaya kpọpụtaara gị ihe i dere?”
И запиташе Варуха говорећи: Кажи нам како си написао све те речи из уста његових.
18 Baruk zara sị ha, “E, ọ bụ ya kpọpụtara m okwu ndị a niile m deturu. E ji m inki dee ha nʼakwụkwọ.”
А Варух им рече: Из уста својих казива ми све те речи, а ја писах у књигу мастилом.
19 Mgbe ahụ, ndịisi ahụ gwara Baruk okwu sị ya, “Ọsọ, gaa ka gị na Jeremaya zoo onwe unu. Unu ekwekwala ka onye ọbụla mata ebe unu zoro onwe unu.”
Тада рекоше кнезови Варуху: Иди, сакриј се и ти и Јеремија, да нико на зна где сте.
20 Mgbe ha zochasịrị akwụkwọ ahụ nʼọnụụlọ Elishama onye ode akwụkwọ, ha jekwuuru eze nʼogige ụlọ ya kọọrọ ya ihe niile.
Потом отидоше к цару у трем оставивши књигу у клети Елисаме писара, и казаше цару све те речи.
21 Eze ziri Jehudi ka ọ gaa weta akwụkwọ ahụ. Mgbe Jehudi wetara ya site nʼọnụụlọ Elishama, ode akwụkwọ, ọ gụrụ ya nʼihu eze, na nʼihu ndịisi ọchịchị ahụ niile guzo nʼakụkụ eze.
А цар посла Јудија да донесе књигу; и донесе је из клети Елисаме писара, и стаде читати Јудије пред царем и пред свим кнезовима који стајаху око цара.
22 Nʼọnwa nke itoolu ahụ, mgbe eze nọ nʼụlọ oyi ya, ọkụ na-enwukwa nʼime ite ọkụ dị nʼihu ya.
А цар сеђаше у зимној кући деветог месеца, и пред њим беше живо угљевље.
23 Mgbe ọbụla Jehudi gụsịrị ibe akwụkwọ atọ maọbụ anọ, eze na-anara ya akwụkwọ ndị ahụ were agụba ode akwụkwọ chakasịa ha, wụnye ha nʼọkụ. O megidere otu a tutu ruo mgbe ọ wụnyechara akwụkwọ ndị ahụ niile nʼọkụ.
И кад Јудије прочита три четири листа, исече је цар ножем писарским, и баци у огањ на жеравицу, те изгоре сва књига огњем на жеравици.
24 Eze na ndị so ya nọdụ nʼoge a na-agụpụta akwụkwọ a atụghị egwu ọbụla; ha adọwakwaghị uwe ha igosi obi ọjọọ.
Али се не уплашише, нити раздреше хаљине своје цар нити који од слуга његових чувши све оне речи.
25 Ọ bụ ezie na Elnatan na Delaya na Gemaraya rịọrọ eze sị ya adọkasịla akwụkwọ ndị ahụ, ma o geghị ha ntị.
И премда Елнатан и Делаја и Гемарија мољаху цара да не пали књигу, он их не послуша.
26 Kama eze nyere Jerameel otu nʼime ụmụ eze, na Seraya nwa Azriel, na Shelemaya nwa Abdeel iwu ijide Baruk ode akwụkwọ, na Jeremaya onye amụma, ma Onyenwe anyị zoro ha.
Него заповеди цар Јерамеилу, сину царевом и Сераји сину Азриловом и Селемији сину Авдиловом, да ухвате Варуха писара и Јеремију пророка; али их сакри Господ.
27 Mgbe eze suresịrị akwụkwọ ahụ na okwu niile nke Baruk dere nʼime ya ọkụ, bụ okwu nke Jeremaya kpọpụtara site nʼọnụ ya, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya:
И дође реч Господња Јеремији, пошто цар сажеже књигу и речи које написа Варух из уста Јеремијиних, говорећи:
28 “Werekwa akwụkwọ ọzọ dee okwu ndị ahụ niile e dere nʼakwụkwọ nke mbụ ahụ, nke Jehoiakim eze Juda kpọrọ ọkụ.
Узми опет другу књигу, и напиши у њу све пређашње речи које беху у првој књизи, коју сажеже Јоаким цар Јудин.
29 Ọzọkwa, gwa Jehoiakim eze Juda sị ya, ‘otu a ka Onyenwe anyị kwuru, Ị kpọrọ akwụkwọ ndị ahụ ọkụ, kwuo sị, “Gịnị mere i ji dee nʼime ya na eze Babilọn aghaghị ịbịa bibie ala a, gbuchapụ ndị niile nọ nʼime ya, ma mmadụ ma anụmanụ?”
А за Јоакима цара Јудиног реци: Овако вели Господ: Ти си сажегао ону књигу говорећи: Зашто си написао у њој и рекао: Доћи ће цар вавилонски и затрти ову земљу и истребити из ње и људе и стоку?
30 Nʼihi ya, ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru banyere Jehoiakim eze Juda; Ọ gaghị amụta onye ga-anọ nʼocheeze Devid. Ọzọ, a ga-atụfu ozu ya nʼebe igirigi nke abalị ga-adakwasị ya, ebe okpomọkụ nke ehihie ga-erute ya.
Зато, овако вели Господ за Јоакима цара Јудиног: Неће имати никога ко би седео на престолу Давидовом, и мртво ће тело његово бити бачено на припеку обдан и на мраз обноћ.
31 Aga m ata ya na ụmụ ya, na ndị ozi ya ahụhụ nʼihi ajọ omume ha. Aga m eme ka ihe ọjọọ ahụ m kwuru ihe banyere ya bịakwasị ha na ndị niile bi na Jerusalem, na ndị Juda niile, nʼihi na ha jụrụ ige m ntị.’”
Јер ћу походити њега и семе његово и слуге његове за безакоње њихово, и пустићу на њих и на становнике јерусалимске и на Јудејце све зло, за које им говорих али не послушаше.
32 Ya mere, Jeremaya weere akwụkwọ ọzọ nye Baruk ode akwụkwọ, bụ nwa Neraya, dịka Jeremaya na-akpọpụta okwu, Baruk depụtakwara nʼakwụkwọ okwu ndị ahụ niile, nke Jehoiakim eze Juda surere nʼọkụ. A tụkwasịkwara nʼelu ha ọtụtụ okwu ndị ọzọ nke dịka ha.
И узе Јеремија другу књигу, и даде је Варуху сину Ниријином писару, а он написа у њу из уста Јеремијиних све речи што беху у оној књизи, коју сажеже Јоаким, цар Јудин огњем; и још би додано к оним много онаквих речи.

< Jeremaya 36 >