< Jeremaya 33 >
1 Mgbe Jeremaya ka nọ dịka onye mkpọrọ nʼogige ụlọ ndị nche, okwu Onyenwe anyị ruru ya ntị nke ugboro abụọ, sị ya,
Yeremiya akanali mʼndende mʼbwalo la alonda, Yehova anayankhula nayenso kachiwiri nati:
2 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, onye ahụ kere ụwa kwuru, Onyenwe anyị, onye kpụrụ ya mee ya ka o guzosie ike, Onye aha ya bụ Onyenwe anyị:
“Yehova amene analenga dziko lapansi, kuliwumba ndi kulikhazikitsa; amene dzina lake ndi Yehova, akuti,
3 ‘Kpọkuo m, aga m aza gị, gosi gị ihe dị ukwuu dị iche iche, na ihe siri ike na nghọta nke ị na-amaghị.’
‘Unditame mopemba ndipo ndidzakuyankha. Ndidzakuwuza zinsinsi zazikulu zimene suzidziwa.’
4 Nʼihi na nke a bụ ihe Onyenwe anyị, bụ Chineke Izrel, kwuru banyere ụlọ ndị ahụ niile dị nʼobodo, na ụlọeze niile nke ndị eze Juda, bụ nke akwadara maka iji megide nnọchibido niile na mma agha
Yehova Mulungu wa Israeli akunenapo pa za nyumba za mu mzinda muno ndiponso pa za nyumba za mafumu a Yuda. Zidzagwetsedwa, ndipo palibe chifukwa cholimbana ndi mitumbira ya nkhondo ya Ababuloni.
5 nʼagha a na-alụso ndị Babilọn. ‘Aga eji ozu ndị mmadụ ahụ niile m ga-etigbu site nʼiwe m na nʼọnụma m kpojuo ha. Aga m ezo ihu m site nʼebe obodo a nọ, nʼihi ajọ omume ya niile.
Ababuloni akubwera kudzawuthira nkhondo mzindawu ndipo nyumba zake zidzadzaza ndi mitembo ya anthu amene ndidzawapha mokwiya ndi mwaukali. Ndawufulatira mzinda uno chifukwa cha zoyipa zake zonse.
6 “‘Ma otu ọ dị, aga m agwọ ya, mee ka ahụ sie ya ike. Aga m agwọ ndị m, meekwa ka ha nwe udo nʼebe ọ bara ụba. Ha ga-ebikwa nʼudo na-enweghị egwu ọbụla.
“‘Pambuyo pake mzindawu ndidzawupatsanso moyo ndi kuwuchiritsa; ndidzachiritsa anthu anga ndi kuwapatsa chitetezo ndi mtendere weniweni.
7 Aga m emekwa ka ndị Izrel na ndị Juda a dọtara nʼagha lọta. Aga m ewugharịkwa ha dịka ụlọ, mee ka ha dịrị ka ha dị na mbụ.
Ndidzawakhazikanso Ayuda ndi Aisraeli ku dziko lawo, ndipo ndidzawabwezera monga mmene analili poyamba.
8 Aga m eme ka ha dị ọcha site na mmehie ha niile, nke ha mere megide m. Aga m agbaghara ha mmehie ha na nnupu isi ha niile megide m.
Ndidzawayeretsa pochotsa zoyipa zonse zimene anandichitira, ndiponso ndidzawakhululukira machimo onse amene anachita pondiwukira.
9 Mgbe ahụ, obodo a ga-aghọkwa ihe ga-eme ka mba niile nke ụwa mara m, ka ha ṅụrịa ọṅụ nʼime m, tookwa m, ma wetara m nsọpụrụ, mgbe ha ga-anụ ihe ọma niile m meere obodo a. Ha ga-atụkwa oke egwu, maakwa jijiji, nʼihi ezi ihe ahụ niile na nʼihi udo ahụ niile nke mụ onwe m mere ka o rute ha aka.’
Mzinda wa Yerusalemu udzandipatsa chimwemwe, chiyamiko ndi ulemerero. Anthu a mitundu yonse adzanditamanda akadzamva za zabwino zonse zimene ndawuchitira mzindawu. Iwo adzachita mantha ndi kunjenjemera poona madalitso ochuluka ndi mtendere zimene ndapereka kwa mzinda umenewu.’
10 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Unu na-asị banyere ebe a, “Ọ bụ mkpọmkpọ ebe, ebe ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya.” Ma nʼobodo Juda, ya na okporoụzọ niile dị na Jerusalem, nke tọgbọrọ nʼefu ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, a ga-emesịa nụkwa
“Yehova akuti, ‘Inu mumanena za malo ano kuti ndi bwinja,’ malo opandamo anthu kapena nyama. Komatu mizinda ya Yuda ndi mʼmisewu ya mu Yerusalemu mʼmene tsopano muli zii mudzamvekanso
11 olu ọṅụ na obi ụtọ, na olu ndị ikom na ndị inyom na-alụ di na nwunye, na olu ndị ahụ niile na-eweta onyinye ekele nʼụlọ Onyenwe anyị, ndị ahụ ga-asị, “‘“Nyenụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile ekele nʼihi na Onyenwe anyị dị mma. Ịhụnanya ya na-adịgidekwa ruo mgbe ebighị ebi.” Nʼihi na aga m eme ka ndị ala a, nke a dọtara nʼagha lọta, dịkwa ka ha dị na mbụ,’ otu a ka Onyenwe anyị kwuru.
mfuwu wachimwemwe ndi mawu achisangalalo, mawu a mkwatibwi ndi mkwati. Mʼnyumba ya Mulungu mudzamvekanso nyimbo za anthu amene akudzapereka nsembe zothokoza Yehova. Azidzati, “Yamikani Yehova Wamphamvuzonse, popeza Iye ndi wabwino; pakuti chifundo chake nʼchamuyaya.” Pakuti ndidzabwezeretsa zinthu zabwino za dziko lino monga zinalili poyamba, akutero Yehova.
12 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile kwuru, ‘Nʼebe a, nke bụ mkpọmkpọ ebe ugbu a, nke mmadụ maọbụ anụmanụ na-ebighị nʼime ya, ka a ga-emesịa nweekwa ebe ịta nri nke igwe ewu na atụrụ, nʼime obodo niile, ebe ndị ọzụzụ atụrụ ga-eduru igwe ewu na atụrụ ha gaa izuike.
“Yehova Wamphamvuzonse akuti, ‘Malo ano, a chipululu ndi wopanda anthu kapena nyama, mʼmizinda yake yonse mudzakhala msipu umene abusa adzadyetserako nkhosa zawo.
13 Nʼime obodo niile nke dị nʼala ugwu ugwu, na nʼobodo niile nke dị na mgbada ugwu niile nke Negev, nʼoke ala Benjamin, nʼime obodo nta niile nke gbara Jerusalem gburugburu, na nʼime obodo niile nke Juda. Igwe ewu na atụrụ ga-agabigakwa ọzọ nʼokpuru aka abụọ nke onye na-agụ ha ọnụ.’ Otu a ka Onyenwe anyị na-ekwu.
Ku mizinda ya kumapiri, ya kuchigwa, ya ku Negevi, ya ku dera la Benjamini, ku dziko lozungulira Yerusalemu, ndi ku mizinda ya Yuda, nkhosa zidzadutsanso pamaso pa munthu woziwerenga,’ akutero Yehova.
14 “‘Ụbọchị ndị ahụ na-abịa,’ ka Onyenwe anyị kwupụtara, ‘mgbe m ga-emezu ezi nkwa ahụ m kwere ụlọ Izrel na ụlọ Juda.
“‘Taonani masiku akubwera,’ akutero Yehova, ‘pamene ndidzachitadi zokoma zimene ndinalonjeza Aisraeli ndi nyumba ya Yuda.
15 “‘Nʼụbọchị ndị ahụ, na nʼoge ahụ, aga m eme ka Alaka ezi omume pupụta site nʼezinaụlọ Devid. Ọ ga-eme ihe ziri ezi, kpeekwa ikpe ziri ezi nʼala ahụ.
“‘Mʼmasiku amenewo ndi pa nthawi imeneyo ndidzaphukitsa Nthambi yolungama kuchokera ku banja la Davide; munthuyo adzachita zolungama ndi zabwino mʼdziko.
16 Nʼụbọchị ndị ahụ, ka a ga-azọpụta Juda, Jerusalem ga-ebikwa nʼudo. Nke a bụ aha a ga-akpọ ya, Onyenwe anyị Onye Nzọpụta, bụ ezi omume anyị.’
Mʼmasiku amenewo Yuda adzapulumuka ndipo Yerusalemu adzakhala mwamtendere. Dzina limene mzindawu udzadziwike nalo ndi ili: Yehova Chilungamo Chathu.’
17 Nʼihi na ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘O nweghị oge a ga-ahapụ inweta otu onye site nʼezinaụlọ Devid onye ga-anọ nʼocheeze ụlọ Izrel.
Yehova akunena kuti, ‘Davide sadzasowa mdzukulu wolowa mʼmalo mwake pa mpando waufumu wa Israeli,
18 Ọ dịkwaghị mgbe a ga-ahapụ inweta onye ga-esite nʼetiti ndị nchụaja na ndị Livayị, nke ga-eguzo nʼihu m ụbọchị niile ịchụ aja nsure ọkụ, na i wetara m onyinye ịnata ihuọma, na ịchụrụ m aja dị iche iche.’”
ngakhale ansembe, amene ndi Alevi, sadzasowanso munthu woyima pamaso panga nthawi zonse wopereka nsembe zopsereza, nsembe zaufa ndi nsembe zina.’”
19 Emesịa, okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
Yehova anawuza Yeremiya kuti:
20 “Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na unu nwere ike ime ka ọgbụgba ndụ m na ehihie, na ọgbụgba ndụ mụ na abalị ghara ịdịkwa, ime ka ehihie na abalị gharakwa ịpụta nʼoge ha,
Mawu anga ndi awa. Ine ndinachita pangano ndi usana ndi usiku kuti zizibwera pa nthawi yake. Pangano limeneli inu simungaliphwanye.
21 mgbe ahụ ọgbụgba ndụ nke mụ na Devid ohu m gbara, na ọgbụgba ndụ nke m mere ka ọ dịrị nʼetiti mụ na ndị Livayị, bụ ndị nchụaja na-eje ozi ha nʼihu m, agaghị adịkwa. A gaghị enwekwa onye ga-esi nʼezinaụlọ Devid nke ga-anọkwasị nʼocheeze ya.
Ndinachitanso pangano ndi Davide, mtumiki wanga kuti nthawi zonse adzakhala ndi mdzukulu wodzakhala pa mpando wake waufumu. Ndinachitanso pangano ndi Alevi kuti iwonso adzanditumikira nthawi zonse. Mapangano amenewa sadzaphwanyidwa nthawi zonse.
22 Aga m eme ka ụmụ ụmụ Devid ohu m, na ndị Livayị, bụ ndị na-eje ozi ha nʼihu m, dị ukwuu nʼọnụọgụgụ dịka kpakpando dị na mbara eluigwe; ha ga-adịkwa ukwuu dịka uzuzu dị nʼọnụ mmiri osimiri nke a na-apụghị ịgụta ọnụ.’”
Ndidzachulukitsa ngati nyenyezi zamlengalenga ndiponso ngati mchenga wa mʼmbali mwa nyanja zidzukulu za mtumiki wanga Davide ndiponso za Alevi amene amanditumikira Ine.
23 Okwu Onyenwe anyị ruru Jeremaya ntị sị ya,
Yehova anafunsa Yeremiya kuti,
24 “Ị hụla ajụjụ ndị a na-ajụ? Ha na-ajụ na-asị, ‘Onyenwe anyị ọ jụla agbụrụ abụọ ndị a ọ họpụtara?’ Nʼihi ya, ha na-elelị ndị m, ha adịghị agụkwa ha dịka mba.
“Kodi sunamve mmene anthu ena akumanenera kuti, ‘Yehova wakana maufumu awiriwa amene Iye anawasankha.’ Kotero anthuwo akunyoza anthu anga ndipo sakuwayesanso mtundu wa anthu.
25 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, ‘Ọ bụrụ na m emeghị ka ọgbụgba ndụ dịrị nʼetiti mụ na ehihie na abalị, meekwa ka iwu na-achị eluigwe na ụwa guzosie ike,
‘Koma Ine Yehova ndinachita pangano ndi usana ndi usiku. Ndinakhazikitsanso malamulo oyendetsa dziko lakumwamba ndi dziko lapansi,
26 mgbe ahụ, agaara m ajụ ụmụ ụmụ Jekọb, na ụmụ ụmụ Devid ohu m. Agaraghị m ahọpụta otu nʼime ụmụ ya ka ọ chịa ụmụ ụmụ Ebraham na Aịzik na Jekọb. Ma aga m eme ka ndị ha a dọtara nʼagha lọta; aga m enwekwa obi ebere nʼahụ ha.’”
monga ndachita zimenezi motsimikiza, choncho ndidzasunga pangano limene ndinachita ndi zidzukulu za Yakobo ndi Davide mtumiki wanga. Ndidzasankha mmodzi mwa ana a Davide kuti alamulire zidzukulu za Abrahamu, Isake ndi Yakobo. Komatu ndidzawamvera chifundo ndi kuwakhazikanso pabwino.’”