< Jeremaya 31 >

1 “Nʼoge ahụ,” otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara ya, sị, “Aga m abụ Chineke nke agbụrụ Izrel niile. Ha ga-abụkwa ndị m.”
“Nígbà náà, Èmi yóò jẹ́ Ọlọ́run fún gbogbo ìdílé ìran Israẹli, àwọn náà yóò sì jẹ́ ènìyàn mi,” ni Olúwa wí.
2 Otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ndị ahụ gbanarịrị mma agha ga-ahụta ihuọma nʼọzara. Aga m abịa iwetara Izrel izuike.”
Èyí ni ohun tí Olúwa wí: “Àwọn ènìyàn tí ó sá àsálà lọ́wọ́ idà yóò rí ojúrere Olúwa ní aṣálẹ̀, Èmi yóò sì fi ìsinmi fún Israẹli.”
3 Onyenwe anyị mere ka anyị hụ ya anya site nʼebe dị anya, na-asị, “Ọ bụ ịhụnanya nke na-adịgide ruo mgbe ebighị ebi ka m ji hụ gị nʼanya; Ọ bụ ebere nke na-adịghị agbanwe ka m ji dọta unu nso.
Olúwa ti fi ara rẹ̀ hàn wá ní ìgbà kan rí, ó wí pé: “Èmi ti nífẹ̀ẹ́ yín pẹ̀lú ìfẹ́ àìlópin; mo ti fi ìfẹ́ ńlá fà yín,
4 Aga m ewulikwa gị elu ọzọ, e, aga m eme ka ị bụrụ ihe e wugharịrị ọzọ, gị Izrel bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke. Mgbe ahụ, ị ga-eji ihe iti egwu gị pụọ soro ndị ọṅụ juru obi tee egwu.
Èmi yóò tún gbé e yín sókè, àní a ó tún gbé e yín ró ìwọ wúńdíá ilẹ̀ Israẹli. Àní ẹ ó tún tún ohun èlò orin yín gbé, ẹ ó sì jáde síta pẹ̀lú ijó àti ayọ̀.
5 Mgbe ahụ, ị ga-akụkwa ubi vaịnị a gbara ogige nʼelu ugwu Sameria. Ndị ọrụ ubi kụrụ ya ga-erikwa mkpụrụ si na ya.
Ẹ ó tún gbin ọgbà àjàrà ní orí òkè Samaria; àwọn àgbẹ̀ yóò sì máa gbádùn èso oko wọn.
6 Ụbọchị ahụ ga-adị mgbe ndị nche ga-anọ nʼelu ugwu nta niile nke Ifrem tikuo ndị niile sị ha, ‘Bịanụ ka anyị jeruo Zayọn, ka anyị jee nʼihu Onyenwe anyị Chineke anyị.’”
Ọjọ́ kan máa wà tí àwọn olùṣọ́ yóò kígbe jáde lórí òkè Efraimu wí pé, ‘Ẹ wá, ẹ jẹ́ kí a gòkè lọ sí Sioni, ní ọ̀dọ̀ Olúwa Ọlọ́run wa.’”
7 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Tienụ mkpu ọṅụ nʼihi Jekọb, tienụ mkpu ọṅụ nʼihi onye ahụ kachasị mba niile nʼịdị ukwuu. Meenụ ka a nụrụ ya, toonu ma na-asịkwanụ, ‘Onyenwe anyị, biko, zọpụta ndị gị, bụ ndị Izrel fọdụrụ.’
Èyí ni ọ̀rọ̀ tí Olúwa sọ wí pé: “Ẹ fi ayọ̀ kọrin sí Jakọbu; ẹ hó sí olórí àwọn orílẹ̀-èdè gbogbo. Jẹ́ kí wọ́n gbọ́ ìyìn rẹ kí o sì wí pé, ‘Olúwa, gba àwọn ènìyàn rẹ là; àwọn tí ó ṣẹ́kù ní Israẹli.’
8 Lee, aga m esite nʼala ahụ dị nʼugwu kpọta ha; aga m eme ka e si na nsọtụ niile nke ụwa chịkọtaa ha. Nʼetiti ha ka a ga-ahụ ndị kpuru ìsì na ndị ngwụrọ, na ndị inyom dị ime, na ndị inyom ime na-eme. Ndị ga-alọta ga-adị nnọọ ukwuu!
Wò ó, Èmi yóò mú wọn wá láti ilẹ̀ àríwá; èmi yóò kó gbogbo wọn jọ láti òpin ayé. Lára wọn ni yóò jẹ́ afọ́jú àti arọ, aboyún àti obìnrin tí ń rọbí, ọ̀pọ̀ ènìyàn yóò wá.
9 Ha ga na-akwa akwa mgbe ha na-alọta, ha ga-anọkwa nʼekpere mgbe m ga-edulata ha. Aga m edu ha site nʼakụkụ iyi, nʼala dị larịị, ebe ha na-agaghị akpọbi ụkwụ ha, nʼihi na aghọọlara m Izrel nna, Ifrem bụkwa ọkpara m.
Wọn yóò wá pẹ̀lú ẹkún, wọn yóò gbàdúrà bí Èmi yóò ṣe mú wọn padà. Èmi yóò jẹ́ atọ́nà fún wọn ní ẹ̀bá odò omi; ní ọ̀nà tí ó tẹ́jú tí wọn kì yóò le ṣubú, nítorí èmi ni baba Israẹli, Efraimu sì ni àkọ́bí ọkùnrin mi.
10 “Nụrụnụ okwu Onyenwe anyị, unu mba niile; kwusaanụ ya nʼebe dị anya nke ala ahụ dị nʼakụkụ osimiri niile. Onye ahụ chụsara Izrel ga-achịkọtakwa ha. Ọ ga-elekọtakwa igwe ewu na atụrụ ya dịka onye ọzụzụ atụrụ.
“Ẹ gbọ́ ọ̀rọ̀ Olúwa ẹ̀yin orílẹ̀-èdè ẹ kéde rẹ̀ ní erékùṣù jíjìn; ‘Ẹni tí ó bá tú Israẹli ká yóò kójọ, yóò sì ṣọ́ agbo rẹ̀ gẹ́gẹ́ bí olùṣọ́-àgùntàn.’
11 Nʼihi na Onyenwe anyị ga-agbapụta Jekọb, ọ ga-anapụtakwa ha site nʼaka ndị ka ha ike.
Nítorí Olúwa ti tú Jakọbu sílẹ̀, o sì rà á padà ní ọwọ́ àwọn tí ó lágbára jù ú lọ.
12 Ha ga-abịa nọọ nʼugwu Zayọn tie mkpu ọṅụ, ha ga-aṅụrị ọṅụ nʼihi ịdị ukwu nke ezi ihe Onyenwe anyị nyere ha, dịka ọka, na mmanya ọhụrụ, na mmanụ, na ụmụ igwe ewu na atụrụ, na ọtụtụ ehi. Ha ga-adị ka ubi a na-agba mmiri mgbe niile; ha agaghị erukwa ụjụ ọzọ.
Wọn yóò wá, wọn ó sì hó ìhó ayọ̀ lórí òkè Sioni; wọn yóò yọ ayọ̀ níbi oore Olúwa. Àlìkámà ni, ọtí wáìnì tuntun àti òróró ọ̀dọ́-àgùntàn àti ọ̀dọ́ ọ̀wọ́ ẹran. Wọn ó dàbí ọgbà àjàrà tí a bomirin, ìkorò kò ní bá wọn mọ́.
13 Mgbe ahụ, obi ga-atọ ụmụ agbọghọ ụtọ, ha ga-etekwa egwu ọṅụ, ụmụ okorobịa na ndị agadi ga-aṅụrịkwa ọṅụ. Aga m eme ka iru ụjụ ha ghọọrọ ha obi ụtọ, aga m enyekwa ha nkasiobi na ọṅụ nʼọnọdụ mwute.
Àwọn wúńdíá yóò jó, wọn ó sì kún fún ayọ̀, bẹ́ẹ̀ gẹ́gẹ́ ni ọkùnrin àti obìnrin. Èmi yóò sọ ọ̀fọ̀ wọn di ayọ̀, dípò ìkorò èmi yóò tù wọ́n nínú. Èmi ó sì fún wọn ní ayọ̀.
14 Aga m emekwa ka afọ jubiga ndị nchụaja oke nʼihi ịdị ukwuu nke onyinye ha ga-enweta, afọ ezi ihe m ga-ejukwa ndị m,” otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Èmi ó tẹ́ àwọn àlùfáà lọ́rùn pẹ̀lú ọ̀pọ̀; àwọn ènìyàn mi yóò sì kún fún oore mi,” ni Olúwa wí.
15 Ihe ndị a bụ ihe Onyenwe anyị kwuru, “A nụrụ otu olu na Rema, iru ụjụ na oke ịkwa akwa. Rechel na-akwa akwa nʼihi ụmụ ya, o kwekwaghị ịnabata nkasiobi a na-akasị ya, nʼihi na ụmụ ya adịghịkwa.”
Èyí ni ohun tí Olúwa wí: “A gbọ́ ohùn kan ní Rama tí ń ṣọ̀fọ̀ pẹ̀lú ẹkún kíkorò. Rakeli ń sọkún àwọn ọmọ rẹ̀; kò gbà kí wọ́n tu òun nínú, nítorí àwọn ọmọ rẹ̀ kò sí mọ́.”
16 Ma otu a ka Onyenwe anyị kwuru, “Jide olu gị aka, ka ọ ghara ịkwa akwa, jidekwa anya gị abụọ, ka ha ghara ịgba anya mmiri, nʼihi na a ga-akwụ gị ụgwọ ọrụ nʼihi ọrụ gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Ha ga-esite nʼala ndị iro ha lọtakwa.
Báyìí ni Olúwa wí: “Dá ohùn rẹ dúró nínú ẹkún àti ojú rẹ nínú omijé; nítorí a ó fi èrè sí iṣẹ́ rẹ,” ni Olúwa wí. “Wọn ó sì padà wá láti ilẹ̀ ọ̀tá.
17 Nʼihi ya, olileanya dịkwara ọdịnʼihu gị.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri. “Ụmụ gị ga-alọtakwa nʼala nke aka ha.
Nítorí ìrètí wà fún ọjọ́ iwájú rẹ,” ni Olúwa wí. “Àwọn ọmọ rẹ yóò padà wá sí ilẹ̀ wọn.
18 “Anụla m nnọọ ịsụ ude Ifrem, na okwu o kwuru sị, ‘Ị dọọla m aka na ntị dịka nwa ehi nke na-eme isiike. Lee, amụtala m ihe ị chọrọ ka m mụta site nʼịdọ aka na ntị gị. Ya mere, kpọlata m, ka m nwee ike lọtakwa, nʼihi na ị bụ Onyenwe anyị na Chineke m.
“Nítòótọ́, èmi ti gbọ́ ìpohùnréré Efraimu wí pé, ‘Ìwọ ti bá mi wí gẹ́gẹ́ bí ọmọ màlúù tí a kò kọ́ èmi sì ti gbọ́ ìbáwí. Rà mí padà, èmi yóò sì yípadà, nítorí ìwọ ni Olúwa Ọlọ́run mi.
19 Mgbe m kpafuru, echegharịrị m. Mgbe m ghọtakwara, e tiri m aka nʼobi m, ihere mere m, ọ wutekwara m nʼihi nʼọnọdụ ihe ihere nʼihi ụdị ndụ m biri nʼokorobịa m.’
Lẹ́yìn tí èmi ti yípadà, mo ronúpìwàdà, lẹ́yìn tí èmi ti wá mọ̀, èmi lu àyà mi. Ojú tì mí, mo sì dààmú; nítorí èmi gba èrè ẹ̀gàn ìgbà èwe mi.’
20 Ifrem, ọ bụghị nwa m nwoke, onye ihe ya na-atọ m ụtọ? Ọ bụ ezie na m na-ekwu okwu megide ya, ma anọkwa m na-echeta ya. Nʼihi ya, ihe banyere ya na-agụsị obi m agụụ ike. Ana m enwekwa obi ebere nʼebe ọ nọ.” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Efraimu kì í ha í ṣe ọmọkùnrin mi dáradára tí inú mi dùn sí bí? Bí èmi ti ń sọ̀rọ̀ sí i tó, síbẹ̀, èmi rántí rẹ̀. Nítorí náà, ọkàn mi ṣe ohun kan fún un, èmi káàánú gidigidi fún un,” ni Olúwa wí.
21 “Manyenụ ogidi ịhụba ụzọ ama, manyekwanụ osisi ịhụba ụzọ ama. Lezienụ anya mụta aha okporoụzọ niile, bụ okporoụzọ unu ga-eso. Lọta, gị Izrel, bụ nwaagbọghọ na-amaghị nwoke, laghachi nʼobodo gị ndị a.
“Gbé àmì ojú ọ̀nà dìde, ṣe atọ́nà àmì, kíyèsi òpópó ọ̀nà geere ojú ọ̀nà tí ó ń gbà. Yípadà ìwọ wúńdíá Israẹli, padà sí àwọn ìlú rẹ.
22 Ruo ole mgbe ka ị ga-anọ na-awagharị, gị nwaagbọghọ na-ekwesighị ntụkwasị obi Izrel? Nʼihi na Onyenwe anyị na-aga ime ihe ọhụrụ nʼụwa; nwanyị ga-anọ nwoke gburugburu.”
Ìwọ yóò ti ṣìnà pẹ́ tó, ìwọ aláìṣòótọ́ ọmọbìnrin; Olúwa yóò dá ohun tuntun lórí ilẹ̀, ọmọbìnrin kan yóò yí ọkùnrin kan ká.”
23 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile, bụ Chineke Izrel, kwuru, “Mgbe m si na mba ọzọ kpọghachi ha, ndị ga-ebi nʼala Juda na nʼime obodo ya niile ga-ekwu okwu ndị a ọzọ sị: ‘Onyenwe anyị gọzie gị, gị ebe obibi dị nsọ, gị ugwu dị nsọ.’
Báyìí ni ohun tí Olúwa àwọn ọmọ-ogun Israẹli wí: “Nígbà tí èmi bá kó wọn dé láti ìgbèkùn; àwọn ènìyàn tí ó wà ní ilẹ̀ Juda àti ní àwọn ìlú rẹ̀ yóò tún lo àwọn ọ̀rọ̀ yìí lẹ́ẹ̀kan sí i; wí pé, ‘Kí Olúwa kí ó bùkún fún ọ, ìwọ ibùgbé òdodo, ìwọ òkè ìwà mímọ́.’
24 Ndị mmadụ ga-ebikọta ọnụ na Juda na nʼobodo niile dị nʼime ya, ma ndị na-arụ ọrụ ubi, ma ndị na-elekọta igwe ewu na atụrụ ha.
Àwọn ènìyàn yóò gbé papọ̀ ní Juda àti ní gbogbo àwọn ìlú rẹ̀; bákan náà ni àgbẹ̀ àti àwọn tí ń tẹ̀lé agbo ẹran wọn ká.
25 Aga m enwoghakwa ike ndị na-ada mba, meekwa ka afọ ju ndị ike gwụrụ.”
Èmi yóò sọ aláàárẹ̀ di ọ̀tun, èmi yóò sì tẹ́ gbogbo ọkàn tí ń káàánú lọ́rùn.”
26 Nʼoge a, esi m nʼụra teta, lee anya gburugburu m. Ụra m rahụrụ tọrọ m ụtọ nke ukwuu.
Lórí èyí ni mo jí, mo sì wò yíká, oorun mi sì dùn mọ́ mi.
27 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Lee, ụbọchị ndị ahụ na-abịa, mgbe m ga-akụ ụmụ mmadụ na ụmụ anụmanụ nʼụlọ Izrel na nʼụlọ Juda.
“Wò ó, ọjọ́ ń bọ̀,” ni Olúwa wí, “nígbà tí èmi yóò gbin ilé Israẹli àti ilé Juda pẹ̀lú irúgbìn ọmọ ènìyàn àti ẹranko.
28 Ọ ga-erukwa na dịka m legidere ha anya maka ihopu ha, ikwada ha, itikpọ ha, laa ha nʼiyi, ma mee ka ihe ọjọọ bịakwasịrị ha, otu a ka m ga-esikwa lezie ha anya iwuzi ha na ịkụ ha dị ka mkpụrụ.” Ọ bụ otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Gẹ́gẹ́ bí mo ṣe ń ṣọ́ wọn, láti fàtu, àti láti wó lulẹ̀, àti láti gba ìṣàkóso, láti bàjẹ́ àti láti mú ibi wá, bẹ́ẹ̀ ni èmi yóò ṣọ́ wọn láti kọ́ àti láti gbìn,” ni Olúwa wí.
29 “Nʼụbọchị ndị ahụ, ndị mmadụ agaghị asịkwa, “‘Nna anyị ha arachaala mkpụrụ osisi na-achaghị acha, ma lee, eze ụmụ ha na-ejiji ejiji.’
“Ní ọjọ́ wọ̀n-ọn-nì àwọn ènìyàn kò ní sọ mọ́ pé: “‘Àwọn baba ti jẹ èso àjàrà àìpọ́n àti pé eyín kan àwọn ọmọdé.’
30 Kama onye ọbụla ga-anwụ nʼihi mmehie nke aka ya; onye rachara mkpụrụ osisi na-achaghị acha ka eze ya ga-ejiji.
Ṣùgbọ́n olúkúlùkù ni yóò kú fún ẹ̀ṣẹ̀ rẹ̀, ẹnikẹ́ni tí ó bá jẹ èso kíkan ni eyín yóò kan.
31 “Lee, oge na-abịa,” ka Onyenwe anyị kwupụtara, “mgbe m ga-eme ka ọgbụgba ndụ ọhụrụ dịrị nʼetiti mụ na ụlọ Izrel, nakwa ụlọ Juda.
“Ìgbà kan ń bọ̀,” ni Olúwa wí, “tí Èmi yóò bá ilé Israẹli àti ilé Juda dá májẹ̀mú tuntun.
32 Ọ bụghị ụdị ọgbụgba ndụ ahụ mụ na nna nna ha gbara, mgbe ahụ m jidere ha nʼaka site nʼala Ijipt dupụta ha, nʼihi na ha mebie ọgbụgba ndụ m, ọ bụ ezie na mụ onwe m bụ di nye ha,” Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara.
Kò ní dàbí májẹ̀mú tí mo bá àwọn baba ńlá wọn dá, nígbà tí mo fà wọ́n lọ́wọ́, tí mo mú wọn jáde ní Ejibiti nítorí wọ́n da májẹ̀mú mi. Lóòótọ́ ọkọ ni èmi jẹ́ fún wọn,” ni Olúwa wí.
33 “Ma nke a bụ ọgbụgba ndụ mụ na ụlọ Izrel ga-agba mgbe oge ndị ahụ gasịrị,” ka Onyenwe anyị kwupụtara. “Aga m etinye iwu m nʼime obi ha, aga m edekwasịkwa ha nʼuche ha. Aga m abụ Chineke ha, ha onwe ha ga-abụkwa ndị m.
“Èyí ni májẹ̀mú tí èmi yóò bá ilé Israẹli dá lẹ́yìn ìgbà náà,” ni Olúwa wí pé: “Èmi yóò fi òfin mi sí ọkàn wọn, èmi ó sì kọ ọ́ sí àyà wọn. Èmi ó jẹ́ Olúwa wọn; àwọn ó sì jẹ́ ènìyàn mi.
34 Ọ dịghị onye ọbụla nʼetiti ha ga-akụziri onye agbataobi ya ihe, maọbụ otu onye asị ibe ya, ‘Mara Onyenwe anyị,’ nʼihi na ha niile ga-ama onye m bụ, site nʼonye dịkarịsịrị nta ruo nʼonye dịkarịsịrị ukwuu nʼetiti ha.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri ya. “Nʼihi na aga m agbaghara ajọ omume ha, agaghị m echetakwa mmehie ha niile ọzọ.”
Kò ní sí pé ọkùnrin kan ń kọ́ àwọn ará ilé rẹ̀ tàbí ọkùnrin ń kọ́ arákùnrin rẹ̀ pé, ‘Ẹ mọ Olúwa,’ nítorí gbogbo wọn ni yóò mọ̀ mí láti ẹni kékeré wọn títí dé ẹni ńlá,” ni Olúwa wí. “Nítorí èmi ó dárí àìṣedéédéé wọn jì, èmi kò sì ní rántí ẹ̀ṣẹ̀ wọn mọ́.”
35 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, bụ onye ahụ họpụtara anyanwụ mee ka ọ na-enye ihe nʼehihie, onye ahụ nyere ọnwa na kpakpando iwu ka ha na-enye ihe nʼanyasị, onye na-akpali oke osimiri, na-eme ka ebiliri mmiri na-ebigbọ. Aha ya bụ Onyenwe anyị, Onye pụrụ ime ihe niile.
Èyí ni ohun tí Olúwa wí: ẹni tí ó mú oòrùn tan ìmọ́lẹ̀ ní ọ̀sán, tí ó mú òṣùpá àti ìràwọ̀ ràn ní òru; tí ó rú omi Òkun sókè tó bẹ́ẹ̀ tí ìjì rẹ̀ fi ń hó Olúwa àwọn ọmọ-ogun ni orúkọ rẹ̀.
36 Otu a ka Onyenwe anyị kwupụtara, “Ọ bụ naanị ma ụkpụrụ ndị a ọ pụrụ nʼihu m, ghara ịdịkwa, ka a ga-eme ka ụmụ ụmụ Izrel ghara ịdị, ka ha ghara ịbụkwa mba nʼihu m ọzọ.”
“Àyàfi tí ìlànà yìí bá kúrò níwájú mi,” ni Olúwa wí. “Ǹjẹ́ àwọn ọmọ Israẹli yóò dẹ́kun láti jẹ́ orílẹ̀-èdè níwájú mi láéláé.”
37 Ihe ndị a ka Onyenwe anyị kwuru, “Ọ bụ naanị mgbe e nwere ike ịtụ ma chọpụta ịsa mbara nke mbara eluigwe, na ịdị omimi nke ntọala ụwa, ka m ga-ajụ ụmụ ụmụ niile nke Izrel, nʼihi ihe niile ha mere.” Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri.
Èyí ni ohun tí Olúwa wí: “Àyàfi tí a bá lé àwọn ọ̀run lókè tí ìpìlẹ̀ ayé sì di àwárí ní ìsàlẹ̀, ni èmi yóò kọ àwọn Israẹli nítorí ohun gbogbo tí wọ́n ti ṣe,” ni Olúwa wí.
38 “Ụbọchị ndị ahụ na-abịa, Otu a ka Onyenwe anyị kwubiri, mgbe a ga-ewugharị obodo a nye m, site nʼụlọ elu Hananel ruo nʼọnụ ụzọ ama Akụkụ.
“Ọjọ́ náà ń bọ̀,” ni Olúwa wí, “tí wọn yóò tún ìlú yìí kọ́ fún mi láti ilé ìṣọ́ Hananeli dé igun ẹnu ibodè.
39 Ịdị ogologo nke eriri ọtụtụ a ga-eji tụọ ya ga-adị ka site nʼihu ọnụ ụzọ ama ahụ ruo nʼugwu Gareb, gaakwa ruo Goa.
Okùn ìwọ̀n yóò sì nà jáde láti ibi gígùn lọ sí òkè Garebu yóò sì lọ sí Goa.
40 Ndagwurugwu ahụ niile ebe a tụnyere ozu ndị mmadụ, na ebe e kpofuru ntụ, na mgbada ugwu ahụ niile ebe e doziri edozi maka ịkụ ihe, ruo na ndagwurugwu iyi Kidrọn nke dị nʼakụkụ ọnụ ụzọ ama ịnyịnya, ga-aghọkwa ebe dị nsọ nye Onyenwe anyị. A gaghị ehopukwa obodo ahụ ọzọ, maọbụ tikpọọ ya.”
Gbogbo àfonífojì níbi tí wọ́n ń da òkú àti eérú sí, àti gbogbo àfonífojì Kidironi ní ìhà ìlà-oòrùn títí dé igun ẹnu ibodè ẹṣin yóò jẹ́ mímọ́ sí Olúwa. A kì yóò fa ìlú náà tu tàbí kí a wó o palẹ̀.”

< Jeremaya 31 >